Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 55:1-13

55  Ngwanụ, unu niile ndị akpịrị na-akpọ nkụ!+ Bịanụ ṅụọ mmiri.+ Ndị na-enweghịkwa ego, bịanụ zụrụ ihe rie!+ Ee, bịanụ zụrụ mmanya+ na mmiri ara ehi+ n’ejighị ego, n’akwụghịkwa ụgwọ.+  Gịnị mere unu ji na-emefu ego maka ihe na-abụghị nri? Gịnịkwa mere unu ji na-adọgbu onwe unu n’ọrụ n’ihe na-adịghị eju afọ?+ Geenụ m ntị nke ọma ma rie ihe dị mma,+ ka nri na-edozi ahụ́ tọọkwa mkpụrụ obi unu ụtọ nke ukwuu.+  Tọọnụ ntị n’ala+ bịakwute m.+ Geenụ ntị, mkpụrụ obi unu ga-adịkwa ndụ,+ mụ na unu ga-agba ndụ, bụ́ ọgbụgba ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi+ n’ihe banyere obiọma* na-adịghị ada ada m nwere n’ebe Devid nọ.+  Lee! Emewo m ya+ onye àmà+ nke mba dị iche iche,+ meekwa ya onye ndú+ na ọchịagha+ nke mba dị iche iche.  Lee! Ị ga-akpọ mba ị na-amaghị,+ ndị sikwa ná mba na-amaghị gị ga-agbakwute gị,+ n’ihi Jehova bụ́ Chineke gị,+ nakwa n’ihi Onye Nsọ Izrel,+ n’ihi na ọ ga-achọworị gị mma.+  Chọọnụ Jehova ugbu a a pụrụ ịchọta ya.+ Kpọkuonụ ya ugbu a ọ nọ nso.+  Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,+ ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya.+ Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere,+ ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.+  “N’ihi na echiche unu abụghị echiche m,+ ụzọ m abụghịkwa ụzọ unu,”+ ka Jehova kwuru.  “N’ihi na dị ka eluigwe dị elu karịa ụwa,+ otú ahụ ka ụzọ m dị elu karịa ụzọ unu,+ otú ahụkwa ka echiche m dị elu karịa echiche unu.+ 10  N’ihi na dị ka mmiri si esi n’eluigwe ezo, dị ka snoo si esi n’eluigwe ada, ma ọ naghị alaghachi n’ebe ahụ, ọ gwụla ma ò dere ala, mee ka ọ mịa mkpụrụ, meekwa ka ihe puo,+ onye na-agha mkpụrụ enwee mkpụrụ ọ ga-agha, onye na-eri ihe enweekwa ihe ọ ga-eri,+ 11  otú ahụ ka okwu m nke si n’ọnụ m pụta ga-adị.+ Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m,+ kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ,+ ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.+ 12  “N’ihi na unu ga-eji ọṅụ pụta,+ a ga-ejikwa udo kpọbata unu.+ Ugwu ukwu na ugwu nta ga-eti mkpu ọṅụ n’ihu unu,+ osisi niile dị n’ọhịa ga-akụkwa aka.+ 13  Osisi junipa ga-anọchi osisi ogwu.+ Osisi metụl ga-anọchikwa ahịhịa akụwa.+ Ọ ga-aghọ ihe ga-eme ka aha Jehova na-ede ude,+ ihe ịrịba ama nke ga-adịru mgbe ebighị ebi,+ nke a na-agaghị ebipụ ebipụ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Aịz 55:3*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”