Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 54:1-17

54  “Tie mkpu ọṅụ, gị nwaanyị aga nke na-amụghị nwa!+ Nwee obi ụtọ, tiekwa mkpu ọṅụ, tisie mkpu ike,+ gị onye ime na-emeghị,+ n’ihi na ụmụ nke nwaanyị a gbahapụrụ agbahapụ dị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwaanyị nwere di,”+ ka Jehova kwuru.  “Mee ka ụlọikwuu gị sakwuo mbara.+ Ka e setịa ákwà ụlọikwuu nke ebe obibi gị dị ebube. Akparala ya ókè. Mee ka ụdọ ụlọikwuu gị dị ogologo, meekwa ka mkpọ́ ụlọikwuu gị sie ike.+  N’ihi na ị ga-agbasa n’aka nri nakwa n’aka ekpe,+ ụmụ gị ga-enwetakwa ọbụna mba dị iche iche.+ Ha ga-ebichi ọbụna obodo ndị tọgbọrọ n’efu.+  Atụla egwu,+ n’ihi na a gaghị emenye gị ihere;+ ihere emela gị, n’ihi na a gaghị emechu gị ihu.+ N’ihi na ị ga-echefu ọbụna ihere mere gị mgbe ị bụ nwata,+ ị gaghịkwa echeta nkọcha a kọchara gị n’oge niile ị nọrọ dị ka nwaanyị di ya nwụrụ.”  “N’ihi na Onye Ukwu nke kere gị+ bụ di nwe gị,+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya;+ Onye Nsọ Izrel bụkwa Onye Mgbapụta gị.+ A ga-akpọ ya Chineke nke ụwa dum.+  N’ihi na Jehova kpọrọ gị dị ka à ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ kpamkpam, onye ihe wutere na mmụọ,+ dịkwa ka nwunye a lụtara n’agbọghọ,+ bụ́ onye e mesịrị jụ,”+ ka Chineke gị kwuru.  “M hapụrụ gị kpamkpam ruo nwa oge,+ ma m ga-eji ebere dị ukwuu kpọkọta gị.+  Eji m oké iwe wepụ ihu m n’ebe ị nọ ruo nwa oge,+ ma m ga-eji obiọma* ga-adịru mgbe ebighị ebi meere gị ebere,”+ ka Onye Mgbapụta gị,+ bụ́ Jehova, kwuru.  “Nke a dị m nnọọ ka ụbọchị Noa.+ Dị nnọọ ka m ṅụrụ iyi na mmiri Noa agaghị ekpuchi ụwa ọzọ,+ otú ahụ ka m ṅụrụ iyi na agaghị m eweso gị iwe, agaghịkwa m abara gị mba.+ 10  N’ihi na a pụrụ iwepụ ugwu ukwu, ugwu nta pụkwara ịma jijiji,+ ma obiọma m agaghị esi n’ebe ị nọ pụọ,+ ọgbụgba ndụ m nke udo agaghịkwa ama jijiji,”+ ka Jehova, bụ́ Onye na-emere gị ebere,+ kwuru. 11  “Gị nwaanyị nke nọ n’ahụhụ,+ nke oké ifufe na-ebugharị,+ nke a na-akasighị obi,+ lee, m ga-eji ụrọ siri ike doo nkume gị niile,+ m ga-ejikwa nkume safaya+ tọọ ntọala gị.+ 12  M ga-eji nkume rubi rụọ ihe nrụbichi n’elu ụlọ gị niile, jiri nkume na-enwu ọkụ rụọ ọnụ ụzọ ámá gị niile,+ jirikwa nkume mara mma kpaa ókè nke ala gị niile. 13  Ụmụ gị niile+ ga-abụ ndị Jehova kụziiri ihe,+ udo nke ụmụ gị ga-adịkwa ukwuu.+ 14  A ga-eme ka i guzosie ike n’ezi omume.+ Ị ga-anọ mmegbu n’ebe dị anya+—n’ihi na ọ dịghị nke ị ga-atụ egwu—ị ga-anọkwa ihe ọ bụla na-emenye ụjọ n’ebe dị anya, n’ihi na ọ gaghị erute gị nso.+ 15  Ọ bụrụ na onye ọ bụla anwaa anwaa wakpo gị, ọ gaghị abụ m nyere iwu ka o mee ya.+ Onye ọ bụla nke na-awakpo gị ga-ada n’ihi gị.”+ 16  “Lee! Ọ bụ m kere omenkà, bụ́ onye na-afụ+ eko+ wee kpụpụta ngwá ọgụ. Ọ bụkwa mụ onwe m kere onye na-ebibi ihe+ ka o bibie ihe. 17  Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma,+ ire ọ bụla nke ga-ekwu okwu megide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe.+ Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova,+ ezi omume ha si n’ebe m nọ,” ka Jehova kwuru.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Aịz 54:8*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”