Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 53:1-12

53  Ònye nwere okwukwe n’ihe anyị nụrụ?+ Ònyekwa ka e kpugheere+ ogwe aka Jehova?+  Ọ ga-epulite dị ka ome+ n’ihu ya, ọ ga-adịkwa ka mgbọrọgwụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị. Ọ dịghị ka onye ukwu, ọ dịghịkwa ebube;+ mgbe anyị ga-ahụ ya, ọ gaghị adị otú ga-eme ka anyị chọsie ya ike.+  Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya,+ ọ bụ onye nwere ihe mgbu, onye makwaara ihe bụ́ ọrịa.+ Ọ bụkwa onye anyị wepụrụ ihu anyị n’ebe ọ nọ.+ E ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe anyị ji ya kpọrọ.+  N’eziokwu, ọ bụ ọrịa anyị ka ya onwe ya buuru;+ o bukwaara ihe mgbu anyị.+ Ma anyị gụrụ ya n’onye e tiri ihe otiti,+ onye Chineke tiri ihe,+ mekpaakwa ahụ́.+  Ma a mara ya ube+ n’ihi mmebi iwu anyị;+ a nọkwa na-echi ya ọnụ n’ala n’ihi njehie anyị.+ A pịara ya ụtarị nke ga-eme ka anyị nwee udo,+ a gwọrọ anyị+ n’ihi ọnyá ya.+  Anyị niile awagharịwo dị ka atụrụ;+ onye ọ bụla n’ime anyị gawara n’ụzọ nke ya; Jehova emewokwa ka onye ahụ buru njehie anyị niile.+  Ihe isi ike dakwasịrị ya,+ o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́;+ ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu;+ dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.+  A kpụụrụ ya pụọ n’ihi na e gbochiri ikpe ziri ezi,+ kpeekwa ya ikpe mkpegbu; ònyekwa ga-echegbu onwe ya banyere ihe niile mere n’ọgbọ ya?+ N’ihi na e bipụrụ ya+ n’ala ndị dị ndụ.+ E tiri ya ihe+ n’ihi mmebi iwu nke ndị m.+  Mgbe ọ nwụrụ, ili ya ga-adị n’etiti ndị ajọ omume+ nakwa n’etiti ndị ọgaranya,+ n’agbanyeghị na o meghị ihe ike ọ bụla,+ aghụghọ adịghịkwa ya n’ọnụ.+ 10  Ma ọ tọrọ Jehova ụtọ igwepịa ya.+ O mere ka ọ rịa ọrịa.+ Ọ bụrụ na ị ga-eme ka mkpụrụ obi ya bụrụ àjà ikpe ọmụma,+ ọ ga-ahụ ụmụ ya,+ ọ ga-emekwa ka ụbọchị ya dị ogologo.+ Ihe na-atọ Jehova ụtọ+ ga-aga nke ọma+ n’aka ya. 11  N’ihi nsogbu nke mkpụrụ obi ya, ihe ọ ga-ahụ+ ga-eju ya afọ.+ Site n’ihe onye ezi omume ahụ, bụ́ ohu m,+ maara, ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume;+ ọ ga-eburukwa njehie ha.+ 12  N’ihi nke ahụ, m ga-ekenye ya òkè n’etiti ọtụtụ ndị,+ ọ bụkwa ya na ndị dike ga-eke ihe a kwatara n’agha,+ n’ihi na ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi ya,+ a gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu;+ ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ ndị,+ ọ gbachiteere ndị na-emebi iwu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji