Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 51:1-23

51  “Geenụ m ntị, unu ndị na-achụso ezi omume,+ unu ndị na-achọ Jehova+ ka unu chọta ya. Lekwasịnụ anya n’oké nkume+ e si wapụta unu, lekwasịkwanụ anya n’oghere nke olulu e si gwupụta unu.  Lekwasịnụ Ebreham+ nna unu+ anya, lekwasịkwanụ Sera+ bụ́ onye ime mesiri ike o wee mụọ unu anya. N’ihi na ọ bụ otu onye mgbe m kpọrọ ya,+ m wee gọzie ya, meekwa ka ọ mụbaa.+  N’ihi na Jehova ga-akasi Zayọn obi.+ Ọ ga-akasikwa ebe ya niile tọgbọrọ n’efu obi,+ ọ ga-eme ka ala ịkpa ya dị ka Iden,+ meekwa ka mbara ọzara ya dị ka ubi Jehova.+ Obi ụtọ na ọṅụ ga-adị n’ime ya, a ga na-anụkwa ekele na abụ olu ụtọ n’ime ya.+  “Ṅaanụ m ntị, unu ndị m; unu mba nke m,+ geenụ m ntị. N’ihi na iwu ga-esi n’ebe m nọ pụta,+ m ga-emekwa ka mkpebi ikpe m dịrị ka ìhè nye ndị dị iche iche.+  Ezi omume m dị nso.+ Nzọpụta m+ ga-apụta, ogwe aka m ga-ekpekwa ọbụna ndị dị iche iche ikpe.+ Agwaetiti niile ga-enwe olileanya n’ebe m nọ,+ ha ga-echerekwa ogwe aka m.+  “Lelienụ anya n’eluigwe,+ leekwanụ anya n’ụwa nke dị n’okpuru ya. N’ihi na a ga-eme ka eluigwe gbasasịa dị ka anwụrụ ọkụ,+ ụwa ga-akakwa nká dị ka uwe,+ ndị bi n’ime ya ga-anwụkwa dị ka anwụnta. Ma nzọpụta m ga-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi,+ a gaghịkwa ebibi ezi omume m.+  “Geenụ m ntị, unu ndị maara ezi omume, ndị iwu m dịkwa n’obi.+ Unu atụla nkọcha mmadụ efu egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihi okwu mkparị ha.+  N’ihi na nla ga-erichapụ ha dị ka uwe, nla nke na-eri ákwà ga-erichapụ ha dị ka ajị anụ.+ Ma ezi omume m ga-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi, nzọpụta m ga-adịrukwa ọgbọ a na-apụghị ịgụta ọnụ.”+  Teta, teta, yiri ike dị ka uwe,+ gị ogwe aka Jehova!+ Teta dị ka i tetara n’oge dị anya gara aga,+ dị ka i tetara n’ọgbọ ndị dịrị n’oge dị anya gara aga. Ọ́ bụghị gị kụrụ Rehab+ righirighi, magbuokwa nnukwute anụ mmiri?+ 10  Ọ́ bụghị gị mere ka oké osimiri takọọ, bụ́ mmiri dị n’oké osimiri?+ Ọ́ bụghị gị mere ka oké osimiri ghọọrọ ndị ị gbapụtara agbapụta ụzọ ha ga-esi gafere?+ 11  Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta, tiri mkpu ọṅụ bata na Zayọn,+ ha ga na-aṅụrịkwa ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+ Ha ga-enwe obi ụtọ na ọṅụ.+ Iru uju na ịsụ ude ga-agbafu.+ 12  “Ọ bụ mụ onwe m bụ Onye na-akasi unu obi.+ “Ònye ka ị bụ nke mere ị ga-eji na-atụ mmadụ efu nke ga-anwụ anwụ egwu,+ na-atụkwa nwa nke mmadụ bụ́ onye a ga-eme ka ọ dị ka ahịhịa ndụ egwu?+ 13  Ònyekwa ka ị bụ nke mere ị ga-eji chefuo Jehova bụ́ Onye kere gị,+ Onye setịrị eluigwe,+ Onye tọkwara ntọala ụwa,+ i wee na-atụ ụjọ mgbe niile, ogologo ụbọchị dum, n’ihi ọnụma nke onye na-anọchibido gị,+ dị ka à ga-asị na ọ dị njikere ibibi gị?+ Olee ebe ọnụma nke onye na-anọchibido gị dị?+ 14  “A ga-atọhapụ onye ahụ huuru ehuru ọsọ ọsọ,+ bụ́ onye e kere agbụ, ka ọ ghara ịnwụ wee baa n’olulu,+ ka ihe oriri wee ghara ịkọ ya.+ 15  “Ma, mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akpali oké osimiri ka ebili mmiri ya mewe mkpọtụ.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.+ 16  M ga-etinye okwu m n’ọnụ gị,+ m ga-emekwa ka ndò nke aka m kpuchie gị,+ iji mee ka eluigwe guzosie ike,+ tọọkwa ntọala ụwa,+ wee sị Zayọn, ‘Unu bụ ndị m.’+ 17  “Teta, teta, bilie ọtọ, gị Jeruselem,+ gị onye ṅụworo iko ọnụma nke Jehova ji n’aka ya.+ Ị ṅụwo iko ahụ, bụ́ iko nke na-eme ka a na-adagharị adagharị, ị ṅụkpọwo ya.+ 18  Ọ dịghị otu n’ime ụmụ niile ọ mụrụ+ nke na-eduzi ya, ọ dịghịkwa otu n’ime ụmụ niile ọ zụlitere nke jidere ya aka.+ 19  Ihe abụọ ndị a nọ na-adakwasị gị.+ Ònye ga-asị gị ndo?+ Ibukọrọ ihe gị na ibibi gị, agụụ na mma agha!+ Ònye ga-akasi gị obi?+ 20  Ụmụ gị atụbọọla.+ Ha edinarawo n’ebe okporo ámá niile wara ngalaba, dị ka atụrụ ọhịa nke ọnyà mara,+ dị ka ndị ṅụjuru ọnụma Jehova+ na ịba mba nke Chineke gị afọ.”+ 21  Ya mere, biko, gee ntị n’ihe a, gị nwaanyị+ nọ n’ahụhụ, onye na-eme ka onye mmanya na-egbu, ma ọ bụghị mmanya na-egbu gị.+ 22  Nke a bụ ihe Onyenwe gị, Jehova, bụ́ Chineke gị, onye na-alụrụ ndị ya ọgụ,+ kwuru: “Lee! M ga-anara gị iko ahụ i ji nke na-eme ka ị na-adagharị adagharị.+ Iko ahụ, bụ́ iko nke ọnụma m—ị gaghị aṅụkwa ya ọzọ.+ 23  M ga-ewere ya nye ndị na-akpasu gị iwe,+ ndị gwara mkpụrụ obi gị, sị, ‘Hulata ka anyị gafere,’ nke mere i ji mee ka azụ gị dị ka ala nkịtị, meekwa ka ọ dị ka okporo ámá nye ndị na-agafe agafe.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji