Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 48:1-22

48  Nụrụnụ ihe a, ụlọ Jekọb, unu ndị na-aza aha Izrel,+ ndị sikwa na mmiri Juda pụta,+ unu ndị na-eji aha Jehova aṅụ iyi,+ ndị na-akpọ aha Chineke Izrel,+ ma ọ bụghị n’eziokwu, ọ bụghịkwa n’ezi omume.+  Ha akpọwo onwe ha ndị si n’obodo nsọ,+ ha adaberewokwa na Chineke Izrel,+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.+  “Ekwuwo m ihe mbụ niile malite ọbụna n’oge ahụ, ọ bụkwa n’ọnụ m ka ha si pụta, m wee na-eme ka a nụ ha.+ Na mberede, m mere ihe, ihe ndị ahụ wee mee.+  N’ihi na m maara na unu bụ ekwe ekwe,+ na olu unu bụ akwara ígwè,+ egedege ihu unu bụkwa ọla kọpa,+  anọgidekwara m na-akọrọ gị ha malite n’oge ahụ. Tupu ha emee, m mere ka ị nụ ha,+ ka ị ghara ịsị, ‘Ọ bụ arụsị m mere ha, ọ bụkwa ihe oyiyi m a pịrị apị na ihe oyiyi m a wụrụ awụ nyere iwu ka ha mee.’+  Ị nụla.+ Hụ ha dum.+ Ọ̀ bụ na unu agaghị akọsa ya?+ Emewo m ka unu nụrụ ihe ọhụrụ malite ugbu a, ọbụna ihe e debere edebe, bụ́ ndị unu na-amaghị.+  A ga-eke ha ugbu a, e keghị ha n’oge gara aga, ọbụna ihe ị na-anụghị tupu taa, ka ị ghara ịsị, ‘Lee! Ha bụ ihe m ma ama.’+  “Ị nụghị,+ ị maghịkwa, e megheghịkwa ntị gị emeghe kemgbe oge dị anya gara aga. N’ihi na m maara na ị nọ na-aghọ aghụghọ,+ a kpọwokwa gị+ ‘onye si n’afọ bụrụ onye mmebi iwu.’  M ga-achịkwa iwe m n’ihi aha m,+ m ga-ejide onwe m n’ebe ị nọ n’ihi otuto m ka e wee ghara ibipụ gị.+ 10  Lee! Anụchawo m gị, ma ọ bụghị dị ka ọlaọcha.+ Ahọrọwo m gị n’oké ọkụ nke e ji agbaze ihe nke bụ́ ihe isi ike.+ 11  N’ihi mụ onwe m, ee, ọ bụ n’ihi mụ onwe m ka m ga-eme ya,+ n’ihi na olee otú m ga-esi kwe ka e metọọ aha m?+ Agaghịkwa m enye onye ọzọ otuto m.+ 12  “Gee m ntị, gị Jekọb, geekwa m ntị, gị Izrel, bụ́ onye m kpọrọ. Abụ m otu Onye ahụ.+ Abụ m onye mbụ.+ Abụkwa m onye ikpeazụ.+ 13  Ọ bụkwa aka m tọrọ ntọala ụwa,+ ọ bụkwa aka nri m gbatịrị eluigwe.+ M na-akpọ ha òkù ka ha guzokọta ọnụ.+ 14  “Zụkọtanụ, unu niile, nụrụkwanụ.+ Ònye n’ime ha kọrọ ihe ndị a? Jehova hụrụ ya n’anya.+ Ọ ga-eme ihe dị ya mma n’ahụ́ Babịlọn,+ ogwe aka ya ga-emegidekwa ndị Kaldia.+ 15  Mụ onwe m ekwuwo okwu. Akpọwokwa m ya.+ Akpọbatawo m ya, m ga-emekwa ka ụzọ ya gaa nke ọma.+ 16  “Bịaruonụ m nso. Nụrụnụ ihe a. Malite ná mbido, ọ dịghị mgbe m nọrọ n’ebe zoro ezo kwuo okwu.+ Malite mgbe o mere, anọ m ya.” Ma ugbu a, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ezipụwo m, ọbụna mmụọ ya.+ 17  Nke a bụ ihe Jehova, Onye Mgbapụta gị,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru,+ Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.+ 18  A sị nnọọ na ị ga-aṅa ntị n’ihe m nyere n’iwu!+ Mgbe ahụ, udo gị ga-adị nnọọ ka osimiri,+ ezi omume gị ga-adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.+ 19  Ụmụ gị ga-adịkwa ka ájá. Ụmụ si n’ahụ́ gị pụta ga-adịkwa ka mkpụrụ ájá.+ A gaghị ebipụ aha ha, a gaghịkwa ehichapụ ya n’ihu m.”+ 20  Sinụ na Babịlọn pụọ!+ Sinụ n’ala ndị Kaldia gbapụ.+ Jirinụ iti mkpu ọṅụ kọsaa ya, meenụ ka a nụ ihe a.+ Meenụ ka ọ daruo na nsọtụ ụwa.+ Kwuonụ, sị: “Jehova agbapụtawo ohu ya bụ́ Jekọb.+ 21  Akpịrị akpọghị ha nkụ+ mgbe o mere ka ha jee ije ọbụna n’ebe tọgbọrọ n’efu.+ O mere ka mmiri si n’oké nkume gbapụtara ha, o wee gbawaa oké nkume ka mmiri wee gbapụta.”+ 22  “Udo adịghịrị ndị ajọ omume,”+ ka Jehova kwuru.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji