Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 47:1-15

47  Gbadata nọdụ ala n’ájá,+ gị ada na-amaghị nwoke bụ́ Babịlọn.+ Nọdụ n’ala nkịtị n’ebe ocheeze na-adịghị,+ gị ada bụ́ ndị Kaldia.+ N’ihi na ị gaghị abụkwa onye ndị mmadụ na-akpọ onye na-agbasighị ike na onye a zụtọrọ azụtọ.+  Were nkume igwe nri+ gwepụta ntụ ọka.* Kpupụ ákwà i ji kpuchie ihu gị.+ Chịlie uwe gị na-azaru ala elu.+ Kpughee ụkwụ gị.+ Gafee osimiri.  I kwesịrị ikpughe ọtọ gị.+ E kwesịkwara ịhụ ihere gị.+ Ọ bụ ọbọ ka m ga-abọ,+ m gaghịkwa emere mmadụ ọ bụla ebere.  “Ọ dị Onye na-agbapụta anyị.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel.”+  Nọdụ ala gbachi nkịtị,+ banyekwa n’ọchịchịrị,+ gị ada bụ́ ndị Kaldia;+ n’ihi na ị gaghị abụkwa onye ndị mmadụ na-akpọ Oké Nwaanyị+ nke na-achị Alaeze dị iche iche.+  M wesoro ndị m iwe.+ M merụrụ ihe nketa m,+ m wee nyefee ha n’aka gị.+ I mereghị ha ebere.+ I boro agadi yok dị arọ nke ukwuu.+  I wee na-asị: “M ga-abụ Oké Nwaanyị+ ruo mgbe ebighị ebi, ruo mgbe niile ebighị ebi.” I tinyeghị ihe ndị a n’obi gị; i chetaghị ihe ga-abụ ikpeazụ ha.+  Ugbu a, nụrụ nke a, gị nwaanyị nke hụrụ ihe ụtọ n’anya, nke nọ ala n’obi iru ala,+ nke na-asị n’obi ya: “Ọ bụ m bụ onye dị mkpa, e nweghị onye ọzọ.+ Agaghị m anọdụ ala dị ka nwaanyị di ya nwụrụ, agaghịkwa m agba aka ụmụ.”+  Ma ihe abụọ a ga-adakwasị gị na mberede n’otu ụbọchị:+ ịgbara aka ụmụ na di gị ịnwụnahụ gị. Ihe ndị a ga-adakwasị gị n’uju,+ n’ihi ịgba afa nke jupụtara n’ime gị, n’ihi ọgwụ dị ike ị na-agwọ—n’ụzọ gabigara ókè.+ 10  Ị nọ na-atụkwasị obi n’ihe ọjọọ gị.+ Ị sịwo: “Ọ dịghị onye na-ahụ m.”+ Ọ bụ amamihe gị na ihe ọmụma gị+ dufuru gị. Ị nọkwa na-asị n’obi gị: “Ọ bụ m bụ onye dị mkpa, e nweghị onye ọzọ.” 11  Ọdachi aghaghị ịdakwasị gị; ọ dịghị anwansi ị ma nke ga-egbochi ya. Ahụhụ ga-adakwasịkwa gị;+ ị gaghị enwe ike igbochi ya. Mbibi nke ị na-ahụtụbeghị ga-adakwasịkwa gị na mberede.+ 12  Ugbu a, nọgide n’ọgwụ ị na-agwọ nakwa n’ajọ afa ị na-agba,+ bụ́ nke ị dọgbuworo onwe gị n’ọrụ n’ime ya malite mgbe ị bụ nwata; ka i wee nwee ike irite uru ma eleghị anya, ka i wee nwee ike imenye ndị mmadụ ụjọ ma eleghị anya. 13  Ike ìgwè ndị ndụmọdụ gị agwụwo gị. Ka ha bilie ugbu a zọpụta gị, bụ́ ndị na-efe eluigwe, ndị na-ele kpakpando,+ ndị na-eme ka a mara ihe ga-adakwasị gị mgbe ọnwa ọhụrụ pụtara. 14  Lee! Ha dịzi ka ahịhịa ọka.+ Ọ bụ ọkụ ga-erechapụ ha.+ Ha agaghị anapụta mkpụrụ obi ha+ n’aka ọkụ.+ A gaghị enwe icheku ọkụ nke ndị mmadụ ga na-anya ọkụ ya. A gaghị enwe ọkụ a ga-anọdụ ala n’ihu ya. 15  Otú ahụ ka ha ga-adịrị gị, bụ́ ndị gị na ha dọgbuworo onwe unu n’ọrụ dị ka ndị na-agwọrọ gị ọgwụ+ malite mgbe ị bụ nwata. Ha ga-awagharị wee laa n’ógbè ha n’otu n’otu. A gaghị enwe onye ga-azọpụta gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Aịz 47:2*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.