Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 46:1-13

46  Bel+ ehulatawo,+ Nibo huuru ehuru; arụsị ha+ aghọọla ibu anụ ọhịa na anụ ụlọ ga na-ebu. Ibu ha, bụ́ ngwongwo ha, aghọọla ibu arọ nke anụmanụ ike gwụrụ ga na-ebu.  Ha ga-ehuru ehuru; ha niile ga-ehulata; ha enweghị ike ịnapụta+ ibu ndị a, kama a ga-adọrọ mkpụrụ obi ha n’agha.+  “Geenụ m ntị, gị ụlọ Jekọb na unu niile ndị fọdụrụ n’ụlọ Izrel,+ ndị m buru malite mgbe unu nọ n’afọ, ndị m buru malite mgbe unu nọ n’akpa nwa.+  Ruo mgbe mmadụ mere agadi, abụ m otu Onye ahụ;+ ruokwa mgbe mmadụ nwere isi awọ́, mụ onwe m ga na-ebu ya.+ Mụ onwe m ga-eme ihe,+ ka mụ onwe m wee na-eku ya, na-ebu ya, meekwara ya ụzọ mgbapụ.+  “Ònye ka unu ga-eji m tụnyere+ ma ọ bụ mee ka mụ na ya hara ma ọ bụ sị na m dị ka ya ka mụ na ya wee yie?+  E nwere ndị na-awụfusị ọlaedo dị n’akpa, ndị na-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ ọlaọcha. Ha na-ego onye na-eji ígwè akpụ ihe, o wee jiri ya kpụọ chi.+ Ha na-adara ya n’ala, ee, ha na-akpọrọ ya isiala.+  Ha na-ebu ya n’ubu ha,+ ha na-eburu ya debe ka o guzoro n’ebe ọ ga-adị. Ọ naghị esi n’ebe o guzo apụ.+ Mmadụ na-etikukwa ya, ma ọ dịghị aza; ọ naghịkwa azọpụta onye ahụ n’ahụhụ ya.+  “Chetanụ ihe a, ka unu wee nwee obi ike. Tinyenụ ya n’obi,+ unu ndị na-emebi iwu.+  Chetanụ ihe mbụ ndị mere n’oge dị anya gara aga,+ na abụ m Chineke,+ ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ,+ ọ dịghịkwa onye dị ka m;+ 10  Onye na-anọ ná mmalite kwuo ihe ga-eme n’ikpeazụ,+ onye na-anọkwa n’oge dị anya gara aga kwuo ihe a na-emebeghị eme.+ Onye na-asị, ‘Ihe m kpebiri ga-adịgide,+ ọ bụkwa ihe niile dị m ụtọ ka m ga-eme’;+ 11  Onye ga-akpọ nnụnụ na-eri anụ ka o si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa,+ kpọọkwa onye ga-emezu ihe m kpebiri ka o si n’ala dị anya bịa.+ Ekwuwo m ya; m ga-emekwa ka o mezuo.+ Akpụwo m ya, m ga-emekwa ya.+ 12  “Geenụ m ntị, unu ndị obi ha kpọchiri akpọchi,+ unu ndị nọ ezi omume n’ebe dị anya.+ 13  Ewetawo m ezi omume m nso.+ Ọ dịghị n’ebe dị anya,+ nzọpụta m agaghịkwa abịa mgbe oge gafeworo.+ M ga-eme ka e nwee nzọpụta na Zayọn, meekwa ka Izrel nweta ịma mma m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji