Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 43:1-28

43  Ugbu a, nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye kere gị,+ Jekọb, Onye kpụrụ gị,+ Izrel: “Atụla egwu, n’ihi na agbapụtawo m gị.+ Akpọwo m gị aha gị.+ Ị bụ nke m.+  Ọ bụrụ na ị gafee mmiri,+ m ga-anọnyere gị;+ ọ bụrụ na ị gafee osimiri, ọ gaghị eri gị.+ Ọ bụrụ na ị gafee ọkụ, ọ gaghị ahụ gị, ire ọkụ agaghị ere gị.+  N’ihi na mụ onwe m bụ Jehova Chineke gị, Onye Nsọ Izrel, bụ́ Onye Nzọpụta gị.+ M nyewo Ijipt ka ọ bụrụ ihe mgbapụta gị,+ werekwa Itiopia+ na Siba gbanweta gị.  N’ihi na ị dị oké ọnụ ahịa n’anya m,+ a gụọla gị n’onye kwesịrị nsọpụrụ, m hụkwara gị n’anya.+ M ga-ewere ndị mmadụ gbanweta gị, werekwa mba dị iche iche gbanweta mkpụrụ obi gị.+  “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ M ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ kpọlata mkpụrụ gị, m ga-esikwa n’ebe ọdịda anyanwụ kpọkọta gị.+  M ga-asị ebe ugwu,+ ‘Hapụ ha!’ sịkwa ebe ndịda, ‘Ejichila ha. Sinụ n’ebe dị anya kpọlata ụmụ m ndị ikom, sikwanụ na nsọtụ ụwa kpọlata ụmụ m ndị inyom,+  onye ọ bụla a kpọkwasịrị aha m,+ onye m keworo maka otuto m,+ onye m kpụworo, ee, onye m meworo.’+  “Kpọpụta ndị kpuru ìsì, ọ bụ ezie na ha nwere anya, kpọpụtakwa ndị ntị chiri, ọ bụ ezie na ha nwere ntị.+  Ka a kpọkọta mba niile n’otu ebe, ka e meekwa ka mba dị iche iche zukọta.+ Ònye n’etiti ha pụrụ ịkọ ihe a?+ Ka hà pụrụ ime ka a nụrụ ọbụna ihe mbụ ga-emenụ?+ Ka ha kpọpụta ndị àmà ha,+ ka a gụọ ha ná ndị ezi omume, ma ọ bụ, ka ha nụ ya wee sị, ‘Ọ bụ eziokwu!’”+ 10  “Unu bụ ndị àmà m,”+ ka Jehova kwuru, “ọbụna ohu m nke m họọrọ,+ ka unu wee mara,+ nweekwa okwukwe n’ebe m nọ,+ ka unu wee ghọtakwa na abụ m otu Onye ahụ.+ Ọ dịghị Chi a kpụrụ tupu mụ onwe m,+ ọ dịghịkwa nke sochiri m.+ 11  Mụ onwe m bụ Jehova,+ e nweghịkwa onye nzọpụta ọzọ ma e wezụga m.”+ 12  “Mụ onwe m ekwuwo ya, zọpụtakwa unu, meekwa ka a nụ ya,+ mgbe ọ na-adịghị chi ọzọ dị n’etiti unu.+ Ya mere, unu bụ ndị àmà m,”+ ka Jehova kwuru, “abụkwa m Chineke.+ 13  Abụkwa m otu Onye ahụ mgbe niile;+ ọ dịghị onye na-anapụta mmadụ n’aka m.+ M ga-eme ihe,+ ònyekwa pụrụ igbochi m?”+ 14  Nke a bụ ihe Jehova, Onye Mgbapụta unu,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru: “Ọ bụ n’ihi unu ka m ga-eziga ha na Babịlọn ma mee ka ihe e ji tụchie ụlọ mkpọrọ dapụsịa,+ kwatuokwa ndị Kaldia nọ n’ụgbọ mmiri, ha ewee na-eti mkpu ákwá.+ 15  Abụ m Jehova, Onye Nsọ unu,+ bụ́ Eze unu,+ Onye kere Izrel.”+ 16  Nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye na-awa ụzọ n’etiti oké osimiri, Onye na-awakwa okporo ụzọ ọbụna n’etiti mmiri dị ike,+ 17  Onye na-ewepụta ụgbọ ịnyịnya agha na ịnyịnya, na-akpọpụtakwa ndị agha na ndị dị ike n’otu mgbe ahụ:+ “Ha ga-edina ala.+ Ha agaghị ebili.+ A ga-emenyụ ha dị ka ọkụ.+ A ga-afụnyụ ha dị ka ọkụ a mụnyere n’owu oriọna.”+ 18  “Unu echetakwala ihe mbụ niile, unu echela echiche banyere ihe niile gara aga. 19  Lee! Ana m eme ihe ọhụrụ.+ Ọ ga-apụta ìhè. Unu ga-amata ya, ọ̀ bụ na unu agaghị amata ya?+ N’ezie, m ga-awa ụzọ n’ala ịkpa+, meekwa ka osimiri sọfee n’ọzara.+ 20  Anụ ọhịa ga-enye m otuto,+ ma nkịta ọhịa ma enyí nnụnụ;+ n’ihi na m ga-emeworị ka mmiri dị n’ala ịkpa, meekwa ka osimiri dị n’ọzara,+ iji mee ka ndị m, bụ́ ndị m họọrọ,+ ṅụọ mmiri, 21  ndị m kpụụrụ onwe m, ka ha wee kọọ akụkọ otuto m.+ 22  “Ma ị kpọghị m, gị Jekọb,+ n’ihi na ike m agwụla gị, gị Izrel.+ 23  I wetaraghị m atụrụ ị ga-eji chụọ àjà a na-esurecha n’ọkụ, i jighịkwa àjà nkịtị ndị ị na-achụ nye m otuto.+ Amanyeghị m gị iji onyinye fee m ofufe, emeghịkwa m ka iwetara m frankinsens gwụ gị ike.+ 24  I jighị ego ọ bụla zụtara m ahịhịa na-esi ísì ụtọ;+ i jighịkwa abụba nke àjà ndị ị chụrụ mee ka afọ ju m.+ N’ezie, ị manyewo m ije ozi n’ihi mmehie gị; i werewo njehie gị mee ka ike gwụ m.+ 25  “Ọ bụ m bụ Onye na-ehichapụ+ mmebi iwu gị+ n’ihi mụ onwe m.+ Agaghịkwa m echeta mmehie gị.+ 26  Chetara m; ka anyị bakọọ n’ikpe;+ kwuo ihe m mere gị ka ikpe wee laara gị.+ 27  Nna gị nke mbụ mehiere,+ ndị na-ekwuchite ọnụ gị emebiwokwa iwu m.+ 28  Ya mere, m ga-emerụ ndị isi nke ebe nsọ, m ga-enyefekwa Jekọb ka ọ bụrụ onye a ga-ebibi ebibi, nyefeekwa Izrel ka a gwa ya okwu mkparị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji