Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 40:1-31

40  “Kasienụ ndị m obi, kasienụ ha obi,” ka Chineke unu kwuru.+  “Gwanụ Jeruselem okwu ga-eru ya n’obi.+ Tienụ mkpu gwa ya na oge ahụhụ ya agafewo,+ na a kwụchaala ụgwọ njehie ya.+ N’ihi na ọ natawo ụgwọ zuru ezu n’aka Jehova maka mmehie ya niile.”+  Geenụ ntị! E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa,+ sị: “Wepụnụ ihe nọchiri n’ụzọ Jehova!+ Meenụ ka okporo ụzọ Chineke anyị, bụ́ nke gafere na mbara ọzara, kwụrụ ọtọ.+  Ka e mee ka ndagwurugwu niile dị elu,+ meekwa ka ugwu ukwu niile na ugwu nta niile dị ala.+ Ala dị mkputamkpu ga-aghọ ala dị larịị, ala na-adịghị larịị ga-aghọkwa mbara ala dị larịị.*+  A ga-ekpughe ebube Jehova,+ anụ ahụ́ niile ga-ahụ ya n’otu mgbe,+ n’ihi na Jehova ji ọnụ ya kwuo ya.”+  Gee ntị! E nwere onye na-asị: “Tie mkpu!”+ Otu onye wee sị: “Gịnị ka m ga-eti ná mkpu?” “Anụ ahụ́ niile bụ ahịhịa ndụ, obiọma* ha dum dị ka okooko ọhịa.+  Ahịhịa ndụ akpọnwụwo, okooko ya achanwụwo,+ n’ihi na Jehova ekusawo ya ume.+ N’ezie, ndị mmadụ bụ ahịhịa ndụ.+  Ahịhịa ndụ akpọnwụwo, okooko ya achanwụwo;+ ma okwu Chineke anyị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”+  Gbagoo n’ugwu dị elu,+ gị nwaanyị nke na-ewetara Zayọn ozi ọma.+ Were ike gị tie mkpu, gị nwaanyị nke na-ewetara Jeruselem ozi ọma.+ Tie mkpu. Atụla egwu.+ Gwa obodo ndị dị na Juda, sị: “Leenụ Chineke unu.”+ 10  Lee! Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-abịa dị ka onye dị ike. Ogwe aka ya ka ọ ga-eji na-achị.+ Lee! O ji ụgwọ ọrụ ọ ga-enye,+ ụgwọ ọ ga-akwụ dịkwa n’ihu ya.+ 11  Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ.+ Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya;+ ọ ga-ekuru ha n’obi ya.+ Ọ ga-eji nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.+ 12  Ònye jiworo ọbụ aka ya tụọ osimiri n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,+ werekwa ọbụ aka ya tụọ eluigwe,+ wụnyekwa ájá dị n’ala n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,+ ma ọ̀ bụ jiri ihe ọ̀tụ̀tụ̀ tụọ ugwu ukwu, jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ugwu nta? 13  Ònye tụworo otú mmụọ Jehova hà, ònyekwa pụrụ ịbụ onye ndụmọdụ ya nke pụrụ ịkụziri ya ihe ọ bụla?+ 14  Ọ̀ bụ ya na onye gbara izu, ka onye ahụ wee mee ka ọ ghọta ihe, ka ọ̀ bụ onye na-akụziri ya ụzọ ikpe ziri ezi, ma ọ bụ na-akụziri ya ihe ọmụma,+ ma ọ bụ na-eme ka ọ mara ụzọ nke ezi nghọta?+ 15  Lee! Mba niile dị ka mmiri si na bọket tapụ; ọ na-ewerekwa ha dị ka uzuzu nke dị n’elu ihe ọ̀tụ̀tụ̀.+ Lee! Ọ na-abọli agwaetiti elu+ dị ka uzuzu. 16  Ọbụna osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji mee ka ọkụ na-enwu, anụ ọhịa dị na ya+ ezughịkwa iji chụọ àjà nsure ọkụ.+ 17  Mba niile dị ka ihe na-adịghị adị n’ihu ya;+ ọ na-ewere ha dị ka ihe na-enweghị ihe ha bụ na ihe efu.+ 18  Ònye ka unu pụrụ iji Chineke tụnyere,+ oleekwa ihe unu pụrụ ịsị na o yiri?+ 19  Omenkà emewo ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ onye na-eji ígwè akpụ ihe na-ejikwa ọlaedo machie ya,+ ọ na-akpụkwa ihe ịchọ mma ọlaọcha.+ 20  Ọ na-ahọrọ otu osisi dị ka ihe e nyere n’onyinye, bụ́ osisi nke na-ereghị ure.+ Ọ na-achọtara onwe ya ezigbo omenkà, ka ọ rụọrọ ya ihe oyiyi+ a pịrị apị nke na-agaghị ete kweke kweke.+ 21  Ọ̀ bụ na unu amaghị? Ọ̀ bụ na unu anụghị? Ọ̀ bụ na a kọbereghị unu ya site ná mmalite? Ọ̀ bụ na unu ejibeghị nghọta mee ihe malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa?+ 22  Ọ dị Onye bi n’ebe dị elu karịa ụwa nke dị gburugburu,+ nke ndị bi n’ime ya dị ka ụkpara, Onye setịrị eluigwe dị ka ákwà dị fere fere, onye gbasara ya dị ka ụlọikwuu a ga-ebi ebi,+ 23  Onye na-eme ka ndị isi ghọọ ihe efu, onye meworo ka ndị ikpe nke ụwa bụrụ ndị na-enweghị ihe ha bụ.+ 24  A kụbeghị ha dị ka mkpụrụ; a ghabeghịkwa ha dị ka mkpụrụ; úkwù ha agbanyebeghị mgbọrọgwụ n’ala.+ Ọ bụrụ na a fụọ ha ọnụ, ha akpọnwụọ;+ oké ifufe ga-ebufu ha dị ka ahịhịa ọka.+ 25  “Ma, ọ̀ bụ onye ka unu pụrụ iji m tụnyere, mụ na ya ewee hara?” ka Onye Nsọ kwuru.+ 26  “Lelienụ anya elu hụrụ. Ònye kere ihe ndị a?+ Ọ bụ Onye ahụ nke na-eme ka ha pụta n’ìgwè ọbụna dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, ọ na-akpọ ha niile ọbụna n’aha.+ Ọ dịghị otu n’ime ha ọ na-achọ achọ, n’ihi na ike ya dị ukwuu,+ n’ihi na o nwekwara ume dị ukwuu. 27  “Gị Jekọb, gịnị mere i ji na-asị, ee, gị Izrel, gịnị mere i ji na-ekwu, sị, ‘Jehova adịghị ahụ ụzọ m,+ Chineke m leghaara ime ka m nweta ikpe ziri ezi anya’?+ 28  Ị̀ matabeghị, ka ọ̀ bụ na ị nụbeghị?+ Jehova, bụ́ Onye kere nsọtụ niile nke ụwa, bụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi.+ Ọ naghị ada mbà, ike anaghịkwa agwụ ya.+ Nghọta ya enweghị nchọpụta.+ 29  Ọ na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike;+ ọ na-emekwa ka onye na-enweghị ike+ nwee ume nke ukwuu. 30  Ụmụ okoro ga-ada mbà, ike ga-agwụkwa ha, ụmụ okorobịa aghaghịkwa ịsụ ngọngọ, 31  ma ndị nwere olileanya+ n’ebe Jehova nọ ga-enwetaghachi ike.+ Ha ga-eji nku fegoo n’elu dị ka ugo.+ Ha ga-agba ọsọ ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-eje ije ma ha agaghị ada mbà.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Aịz 40:4*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”
Aịz 40:6*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”