Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 4:1-6

4  Ụmụ nwaanyị asaa ga-abagide otu nwoke n’ụbọchị ahụ,+ sị: “Anyị ga na-akpa afọ anyị, na-eyikwa uwe anyị; naanị ka anyị zawa aha gị iji wepụ nkọcha anyị.”+  N’ụbọchị ahụ, ihe Jehova mere ka o pulite+ ga-aghọ ihe ịchọ mma na ihe na-eweta otuto,+ mkpụrụ nke ala ga-aghọkwara ndị Izrel lanahụrụ alanahụ+ ihe e ji anya isi+ na ihe mara mma.  Ọ ga-erukwa na a ga-asị na ndị fọdụrụ na Zayọn na ndị fọrọ na Jeruselem dị nsọ n’ebe ọ nọ,+ onye ọ bụla e dere aha ya ịdị ndụ na Jeruselem.+  Mgbe Jehova ga-asachapụworị nsị ụmụ Zayọn,+ ọ ga-eji mmụọ nke ikpe na mmụọ nke ịgba ihe ọkụ+ sachapụ+ ọbara niile a wụfuru+ n’ime Jeruselem,  Jehova ga-emekwa ka e nwee ígwé ojii na anwụrụ ọkụ n’ehihie, na ìhè nke ọkụ na-enwu enwu+ n’abalị+ n’elu ebe niile guzosiri ike nke Ugwu Zayọn+ nakwa n’ebe a na-enwe mgbakọ na ya; n’ihi na a ga-enwe ihe mkpuchi iji chebe ebube ya dum.+  A ga-enwekwa ụlọ ndò nke ga na-enye ndò n’ehihie iji zere oké okpomọkụ,+ ọ ga-abụkwa ebe mgbaba na ebe izere oké ifufe mmiri na mmiri ozuzo.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji