Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 38:1-22

38  N’oge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo n’ọnụ ọnwụ.+ Aịzaya+ nwa Emọz onye amụma wee bịakwute ya, sị ya: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Nye ezinụlọ gị iwu,+ n’ihi na gị onwe gị ga-anwụ, ị gaghị adị ndụ.’”+  Hezekaya wee chee ihu n’ahụ́ ụlọ+ wee malite ikpeku Jehova ekpere,+  sị: “Ana m arịọ gị arịrịọ, Jehova, biko, cheta+ otú m si jiri eziokwu+ na obi zuru ezu+ jee ije+ n’ihu gị, ọ bụkwa ihe dị mma n’anya gị ka m mere.” Hezekaya wee malite ịkwasi ákwá ike.+  Okwu+ Jehova wee ruo Aịzaya ntị, sị:  “Jee sị Hezekaya, ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Devid bụ́ nna nna gị+ kwuru: “Anụwo m ekpere gị.+ Ahụwo m anya mmiri gị.+ Lee, m ga-atụkwasị afọ iri na ise n’ụbọchị ndụ gị;+  m ga-anapụtakwa gị na obodo a n’ọbụ aka eze Asiria, m ga-echebekwa obodo a.+  Nke a ga-abụrụ gị ihe ịrịba ama si n’aka Jehova na Jehova ga-eme ihe a o kwuru:+  Lee, m ga-eme ka onyinyo nke gbadaworo agbada n’elu ebe e si arịgo n’ụlọ Ehaz, bụ́ nke ìhè anyanwụ+ mere ka e nwee n’elu ihe nrịgo ahụ, laa azụ nzọụkwụ iri.”’”+ Anyanwụ wee laa azụ nzọụkwụ iri n’elu ihe nrịgo ahụ ọ gbadaworo.+  Nke a bụ ihe Hezekaya eze Juda dere, mgbe ọ rịara ọrịa+ ma gbakee n’ọrịa ya.+ 10  Mụ onwe m sịrị: “N’etiti ụbọchị ndụ m ka m ga-abanye n’ọnụ ụzọ ámá+ Shiol. A ga-anapụ m afọ ndụ m fọrọ afọ.”+ 11  M sịrị: “Agaghị m ahụ Jaa, ee, Jaa, n’ala ndị dị ndụ.+ Agaghị m ahụ ụmụ mmadụ anya ọzọ—mụ na ndị nọ n’ala ili. 12  E fopụwo+ ebe obibi m, wepụkwa ya n’ebe m nọ dị ka ụlọikwuu ndị ọzụzụ atụrụ. Afụkọtawo m ndụ m dị ka onye na-ekwe ákwà; E wee gbubipụ m+ n’eri gara uhie uhie ndị e ji kpaa ákwà. Malite n’ụtụtụ ruo n’abalị, ị na-enyefe m n’ọnọdụ ọjọọ.+ 13  Emewo m ka obi dajụọ m ruo n’ụtụtụ.+ Dị ka ọdụm, otú ahụ ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile;+ Malite n’ụtụtụ ruo n’abalị, ị na-enyefe m n’aka ihe na-adịghị mma.+ 14  Dị ka elekentịọba na nnụnụ bulbul ka m na-ebe ubé.+ M na-ebe ubé dị ka nduru.+ Elekatala m anya n’elu, ike gwụ m,+ m wee sị: ‘Jehova, anọ m ná nsogbu. Biko, kwado m.’+ 15  Gịnị ka m ga-ekwu, gịnịkwa ka ọ ga-agwa m?+ Ya onwe ya emewokwa ihe.+ N’afọ niile m dị ndụ, m nọ na-agara onwe m n’ihi ihe na-ewute mkpụrụ obi m.+ 16  M wee sị: ‘Jehova, ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji nọrọ ndụ; dịkwa ka onye ọ bụla ọzọ, ọ bụ ya mere ka mmụọ m dịrị ndụ.+ Mee ka m gbakee, chebekwa m ndụ.+ 17  Lee! Ihe ilu, ee, ihe ilu, bịaara m, kama udo ịbịara m;+ Gị onwe gị hụrụ mkpụrụ obi m n’anya nke ukwuu, i wee mee ka ọ ghara ịbanye n’olulu mbibi.+ N’ihi na ị wụfuru mmehie m niile n’azụ gị.+ 18  N’ihi na ọ bụghị Shiol pụrụ ito gị;+ ọnwụ apụghị ịja gị mma.+ Ndị na-agbada n’olulu apụghị iji nchekwube na-ele anya ikwesị ntụkwasị obi gị.+ 19  Ọ bụ onye dị ndụ, ee, ọ bụ onye dị ndụ pụrụ ito gị,+ Dị nnọọ ka m pụrụ ito gị taa.+ Nna pụrụ ime ka ụmụ ya mara ikwesị ntụkwasị obi gị.+ 20  Jehova, biko, bịa zọpụta m,+ anyị ga-eji ụbọ akwara m kpọọ egwú+ N’ụbọchị niile nke ndụ anyị n’ụlọ Jehova.’”+ 21  Aịzaya wee sị: “Ka e were mkpụrụ fig a mịrị amị nke dị mbadamba kechie etuto toro ya,+ ka o wee gbakee.”+ 22  Hezekaya wee sị: “Gịnị bụ ihe ịrịba ama ga-egosi na m ga-agbago n’ụlọ Jehova?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji