Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 36:1-22

36  O wee ruo n’afọ nke iri na anọ nke ọchịchị Eze Hezekaya, na Senakerib+ eze Asiria+ gbagotere buso obodo niile e wusiri ike ndị dị na Juda agha, wee weghara ha.+  N’ikpeazụ, eze Asiria si na Lekish+ ziga Rabshake+ ka ọ gaa Jeruselem,+ gakwuru Eze Hezekaya, ya na oké ìgwè ndị agha, o wee gaa guzoro n’akụkụ okpo mmiri+ nke ọdọ mmiri mgbago,+ n’okporo ụzọ e si aga ebe ndị ọsụ ákwà na-anọ asụ ákwá.+  Elayakim+ nwa Hilkaya, bụ́ onye na-elekọta ezinụlọ eze, na Shebna+ bụ́ odeakwụkwọ nakwa Joa+ nwa Esaf,+ bụ́ onye na-edekọ ihe,+ wee pụkwuru ya.  Rabshake wee sị ha: “Biko, sịnụ Hezekaya, ‘Nke a bụ ihe eze ukwu,+ bụ́ eze Asiria,+ kwuru: “Gịnị ka ị tụkwasịrị obi nke na-enye gị obi ike?+  Ị sịwo, ‘Anyị nwere atụmatụ na ike anyị ga-eji buo agha.’+ (Kama ọ bụ okwu ọnụ efu.) Ọ̀ bụ onye ka ị tụkwasịrị obi, nke mere i ji nupụrụ m isi?+  Lee! Ị tụkwasịwo obi ná nkwado nke ahịhịa amị a a zọturu azọtu,+ bụ́ Ijipt,+ ga-enye gị, nke ga-adụ mmadụ n’ọbụ aka wee dụpuo ya ma ọ bụrụ na ọ dabere na ya. Otú ahụ ka Fero+ eze Ijipt dị n’ebe ndị niile na-atụkwasị ya obi nọ.+  Ọ bụrụkwanụ na ị sị m, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke anyị ka anyị tụkwasịrị obi,’ ọ́ bụghị ya bụ onye Hezekaya wepụrụ ebe ndị dị elu ya+ nakwa ebe ịchụàjà ya,+ ma na-agwa Juda na Jeruselem, sị, ‘N’ihu ebe ịchụàjà a ka unu ga na-akpọ isiala?”’+  Biko, gị na onyenwe m bụ́ eze Asiria+ tie n’aka,+ ka m nye gị puku ịnyịnya abụọ lee ma ì nwere ike ime ka ndị na-agba ịnyịnya nọkwasị na ha.+  Oleezi otú ị pụrụ isi mee ka otu gọvanọ bụ́ otu n’ime ndị kasị nta na-ejere onyenwe m ozi tụgharịa laghachi azụ,+ mgbe gị onwe gị tụkwasịrị Ijipt obi inye gị ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya?+ 10  Ọ́ bụghị Jehova nyere m ikike ịbịa buso ala a agha iji laa ya n’iyi? Ọ bụ Jehova sịrị m,+ ‘Gbagoo buso ala a agha, laakwa ya n’iyi.’”+ 11  Elayakim+ na Shebna+ na Joa+ wee sị Rabshake:+ “Biko, gwawa ndị ohu gị okwu n’asụsụ ndị Siria,+ n’ihi na anyị na-aghọta ya; agwala anyị okwu n’asụsụ ndị Juu+ ná ntị ndị nọ n’elu mgbidi.”+ 12  Ma Rabshake sịrị: “Ọ̀ bụ onyenwe gị na gị onwe gị ka onyenwe m dunyere m ka m gwa okwu ndị a? Ọ́ bụghị ndị ikom a nọ ọdụ n’elu mgbidi, ka ha wee rie nsị ha ma ṅụọ mamịrị ha, unu eriekwa nsị unu, ṅụọ mamịrị unu?”+ 13  Rabshake wee kwụrụ+ ma na-ekwu okwu n’oké olu n’asụsụ ndị Juu,+ o wee gaa n’ihu ịsị: “Nụrụnụ ihe eze ukwu, bụ́ eze Asiria,+ kwuru. 14  Nke a bụ ihe eze kwuru, ‘Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu,+ n’ihi na ọ pụghị ịnapụta unu n’aka m.+ 15  Unu ekwela ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Jehova obi,+ sị: “Jehova ga-anapụtarịrị anyị.+ A gaghị enyefe obodo a n’aka eze Asiria.”+ 16  Unu egela Hezekaya ntị, n’ihi na nke a bụ ihe eze Asiria kwuru: “Chịlierenụ m aka elu+ ma pụkwutenụ m, onye ọ bụla n’ime unu rie ihe si n’osisi vaịn ya na ihe si n’osisi fig ya,+ onye ọ bụla n’ime unu ṅụọkwa mmiri si n’olulu mmiri ya,+ 17  ruo mgbe m ga-abịa kpọrọ unu laa n’ala nke dị ka ala unu,+ ala ọka* na mmanya ọhụrụ, ala achịcha na ubi vaịn; 18  ka Hezekaya wee ghara ịrafu unu,+ sị, ‘Jehova ga-anapụta anyị.’ Ò nwetụwo chi ọ bụla n’ime chi mba dị iche iche napụtara ala ya n’aka eze Asiria?+ 19  Olee ebe chi niile nke Hemat+ na Apad+ nọ? Olee ebe chi niile nke Sefaveyim nọ?+ Hà napụtara Sameria n’aka m?+ 20  Ole nke n’ime chi niile nke ala ndị a napụtara ala ha n’aka m,+ nke mere Jehova ga-eji napụta Jeruselem n’aka m?”’”+ 21  Ha wee gbachie ya nkịtị, ha azaghịkwa ya ihe ọ bụla,+ n’ihi na eze nyere iwu, sị: “Unu atụpụrụla ya ọnụ.”+ 22  Ma Elayakim+ nwa Hilkaya, onye na-elekọta ezinụlọ eze,+ na Shebna+ bụ́ odeakwụkwọ nakwa Joa+ nwa Esaf, bụ́ onye na-edekọ ihe, dọwara uwe ha+ bịakwute Hezekaya wee gwa ya ihe Rabshake+ kwuru.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Aịz 36:17*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.