Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 33:1-24

33  Ahụhụ ga-adịrị gị onye na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ ma e nweghị onye na-ebukọrọ nke gị, gị onye na-aghọ ndị ọzọ aghụghọ, ma e nweghị onye na-aghọ gị aghụghọ!+ Ozugbo i bukọsịịrị ihe ndị mmadụ, a ga-ebukọrọ nke gị.+ Ozugbo ị ghọsịrị ndị ọzọ aghụghọ, a ga-aghọ gị aghụghọ.+  Jehova, biko, meere anyị amara.+ Olileanya anyị dị n’ebe ị nọ.+ Ghọọ ogwe aka anyị+ kwa ụtụtụ,+ ee, ghọọ nzọpụta anyị n’oge nsogbu.+  Ndị mmadụ na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ mkpọtụ ọgba aghara.+ A na-achụsasị mba dị iche iche mgbe i biliri ọtọ.+  A ga-achịkọta ihe nkwata+ unu dị ka ebe ọchịcha na-achịkọbata ihe, dị ka ìgwè igurube nke ji oké ọsọ na-efekwasị mmadụ.+  A ga-ebuli Jehova elu,+ n’ihi na o bi n’ebe dị elu.+ Ọ ga-eme ka Zayọn jupụta n’ikpe ziri ezi na ezi omume.+  Ikwesị ntụkwasị obi e nwere n’oge gị ga-aghọkwa nzọpụta dị ukwuu+—amamihe na ihe ọmụma,+ na ịtụ egwu Jehova,+ nke bụ́ akụ̀ ya.  Lee! Ndị dike ha etiwo mkpu ákwá n’okporo ámá; ndị ozi udo+ ga-akwasi ákwá ike.  E mewo ka okporo ụzọ tọgbọrọ chakoo;+ o nwekwaghị onye na-agafe n’ụzọ ya.+ O mebiwo ọgbụgba ndụ;+ o lelịwo obodo niile;+ ọ dịghịkwa ihe o ji mmadụ efu kpọrọ.+  Ala a eruwela uju, ọ kpọwo nkụ.+ E mechuwo Lebanọn ihu;+ ọ dakasịwo. Sharọn+ dịzi ka mbara ọzara; Beshan na Kamel na-agbụsị akwụkwọ.+ 10  “Ugbu a, m ga-ebili,”+ ka Jehova kwuru, “ugbu a, m ga-enye onwe m otuto;+ ugbu a, m ga-eme onwe m ka m dị elu.+ 11  Unu na-atụrụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ;+ unu ga-amụ ahịhịa ọka. Mmụọ unu ga-erepịa unu+ dị ka ọkụ.+ 12  Ndị dị iche iche ga-adị ka ntụ laịm a kpọrọ ọkụ. Dị ka osisi ogwu e gbuturu egbutu, a ga-esunye ha ọkụ.+ 13  Unu ndị nọ n’ebe dị anya, nụrụnụ ihe m ga-eme!+ Unu ndị nọ nso, matanụ ịdị ike m.+ 14  Ụjọ na-atụ ndị mmehie nọ na Zayọn.+ Ahụ́ na-ama ndị si n’ezi ofufe dapụ jijiji,+ ha ana-asị: ‘Ònye n’ime anyị ka ya na ọkụ nke na-erepịa ihe pụrụ ibitụ?+ Ònye n’ime anyị ka ya na ọkụ nke na-agba ruo ogologo oge pụrụ ibitụ?’+ 15  “Ọ dị onye na-eje ije n’ezi omume mgbe niile,+ na-ekwukwa ihe ziri ezi,+ onye na-ajụ uru na-ezighị ezi e ji aghụghọ nweta,+ onye na-esepụ aka n’iri ngarị,+ onye na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ banyere mwụfu ọbara, onye na-emechikwa anya ya ka ọ ghara ịhụ ihe ọjọọ.+ 16  Ọ bụ ya ga-ebi n’ebe dị elu;+ ebe ya dị elu nke e wusiri ike ga-abụ ebe siri ike mbanye,+ nke dị na nkume dị elu. A ga na-enye ya nri ya;+ mmiri ya agaghị agwụ agwụ.”+ 17  Anya gị ga-ahụ eze na mma ọ mara;+ ọ ga-ahụ ala dị anya.+ 18  Obi gị ga-ekwu okwu n’olu dị ala+ banyere ihe egwu, sị: “Olee ebe odeakwụkwọ nọ? Olee ebe onye na-akwụ ụgwọ nọ?+ Olee ebe onye na-agụ ụlọ elu ọnụ nọ?”+ 19  Ị gaghị ahụ ndị na-akparị mmadụ, ndị na-asụ asụsụ na-adịghị ekwe nghọta, ndị na-asụ asụsụ ị na-agaghị aghọta.+ 20  Lee anya na Zayọn,+ bụ́ obodo anyị na-anọ eme ememme!+ Anya gị ga-ahụ Jeruselem, bụ́ ebe obibi nke na-enweghị nsogbu, ụlọikwuu nke ọ na-adịghị onye ga-ebupụ ya.+ Ọ dịghị mgbe a ga-efopụ mkpọ́ ụlọikwuu ya efopụ, a gaghịkwa adọbi eriri ya ọ bụla.+ 21  Kama, n’ebe ahụ ka Onye Dị Ebube,+ bụ́ Jehova, ga-echebe anyị dị ka osimiri,+ dị ka ọwa mmiri sara mbara. Ìgwè ụgbọ epeepe agaghị agafe na ya, ụgbọ mmiri dị ebube agaghịkwa agafe na ya. 22  N’ihi na Jehova bụ Onyeikpe anyị,+ Jehova bụ Onye na-enye anyị iwu,+ Jehova bụ Eze anyị;+ ya onwe ya ga-azọpụta anyị.+ 23  Eriri gị niile ga-atọghe; ha agaghị enwe ike ikesi osisi ákwà ụgbọ mmiri ha ike ka o guzoro kwem; ha agbasapụghị ákwà ụgbọ mmiri ha. N’oge ahụ, a ga-eke ọbụna ihe nkwata dị ukwuu; ndị ngwọrọ ga-ebukọrọ ihe buru ibu.+ 24  Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: “Ana m arịa ọrịa.”+ Ndị bi n’ala a ga-abụ ndị a gbaghaara njehie ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji