Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 32:1-20

32  Lee! Otu eze+ ga-achị ka e wee nwee ezi omume;+ ndị isi ga-achịkwa+ dị ka ndị isi ka e wee nwee ikpe ziri ezi.  Onye nke ọ bụla ga-adị ka ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo,+ dị ka mmiri iyi ndị dị n’ala mmiri na-adịghị,+ dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala kpọrọ nkụ.+  A gaghịkwa anyachi anya ndị na-ahụ ụzọ, ntị nke ndị na-anụ ihe ga-egekwa ntị.+  Obi nke ndị na-eme oké ngwa ngwa ga-echebara ihe ọmụma echiche,+ ọbụna ire ndị nsụ ga na-ekwu ihe doro anya n’ụzọ na-aga were were.+  A gakwaghị akpọ onye nzuzu onye na-emesapụ aka; a gaghịkwa asị na onye arụrụala bụ onye a na-asọpụrụ;+  n’ihi na onye nzuzu ga na-ekwu okwu nzuzu,+ obi ya ga na-echepụta ihe ọjọọ+ iji si n’ezi ofufe dapụ,+ na-ekwukwa okwu ọjọọ megide Jehova, ime ka afọ nke mkpụrụ obi agụụ na-agụ tọgbọrọ chakoo,+ ọ na-emekwa ka ọbụna onye akpịrị na-akpọ nkụ ghara ịṅụ mmiri.  Ngwá ọrụ nke onye arụrụala dị njọ.+ O nyewo ndụmọdụ ka e mee omume rụrụ arụ,+ iji were okwu ụgha bibie ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha,+ ọbụna mgbe ogbenye kwuru ihe ziri ezi.  Ma onye na-emesapụ aka enyewo ndụmọdụ ka e mesapụ aka; ọ ga-ebilikwa ọtọ ịkwado mmesapụ aka.+  “Unu ndị inyom obi ruru ala, bilienụ ọtọ gee ntị n’olu m!+ Unu ndị inyom na-adịghị echegbu onwe unu, ṅaanụ ntị n’ihe m na-ekwu! 10  Tupu otu afọ na ụbọchị ole na ole agafee, unu ndị na-adịghị echegbu onwe unu ga-ama jijiji,+ n’ihi na ịghọ mkpụrụ vaịn ga-akwụsịworị ma ọ dịghị mkpụrụ a tụtụkọtara.+ 11  Maanụ jijiji, unu ndị inyom obi ruru ala! Maanụ jijiji, unu ndị na-adịghị echegbu onwe unu! Yipụnụ uwe unu gbara ọtọ, keenụ ákwà iru uju n’úkwù.+ 12  Tienụ aka n’obi, kwaara ubi dị iche iche mara mma+ ákwà arịrị,+ kwaakwaranụ osisi vaịn nke na-amị mkpụrụ ákwà. 13  Ọ bụ naanị ogwu, ya bụ, osisi bụ́ ogwu ogwu, na-epulite n’ala ndị m,+ n’ihi na o puru n’elu ụlọ niile aṅụrị jupụtara na ha, ee, obodo nke nwere obi ụtọ dị ukwuu.+ 14  N’ihi na a gbahapụwo ụlọ elu ya,+ mkpọtụ nke na-eme n’obodo akwụsịwo; Ofel+ na ụlọ nche aghọwo ala tọgbọrọ nkịtị, bụ́ ebe ịnyịnya ọhịa na-aṅụrị ọṅụ, ebe ìgwè anụ ga na-ata nri ruo mgbe a na-akaghị aka; 15  ruo mgbe e si n’eluigwe wụkwasị anyị mmụọ,+ mgbe ala ịkpa ghọrọ ubi mkpụrụ osisi, e werekwa ubi mkpụrụ osisi dị ka ezigbo oké ọhịa.+ 16  “Ikpe ziri ezi ga-ebikwa n’ala ịkpa, ezi omume ga-ebikwa n’ubi mkpụrụ osisi.+ 17  Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo;+ ihe ga-esikwa n’ezi omume ahụ pụta bụ ịnọ jụụ na ịnọ n’obi iru ala ruo mgbe ebighị ebi.+ 18  Ndị m ga-ebikwa n’ebe obibi nke udo dị nakwa n’ụlọ nke ha ga-ebi n’obi iru ala zuru ezu nakwa n’ebe izu ike nke nsogbu na-adịghị.+ 19  Akụ́ mmiri ígwé ga na-ada mgbe oké ọhịa dara,+ a ga-eweda obodo a n’ala kpamkpam.+ 20  “Obi ụtọ na-adịrị unu ndị na-akụ mkpụrụ n’akụkụ mmiri niile,+ ndị na-atọhapụ ụkwụ ehi na ụkwụ ịnyịnya ibu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji