Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 30:1-33

30  “Ahụhụ ga-adịrị ụmụ dị isi ike,”+ ka Jehova kwuru, “ndị dị njikere ime ihe ha zubere, ọ bụghị ihe m zubere;+ ndị dịkwa njikere ịwụsa àjà ihe ọṅụṅụ,* ma ọ bụghị mmụọ m ka ha ji na-eme ya, iji mee mmehie tụkwasị na nke ha mere eme;+  ndị na-ebili ka ha gaa Ijipt,+ ndị na-ajụghịkwa m ase,+ ndị na-aga ka ha gbaba n’ebe e wusiri ike nke Fero, gbabakwa na ndò Ijipt!+  Ebe e wusiri ike nke Fero ga-aghọrọ unu ihe ihere,+ mgbaba unu gbabara na ndò Ijipt ga-aghọkwara unu ihe mmechuihu.+  N’ihi na ndị isi ya nọzi na Zoan,+ ndị ozi ya eruwokwa ọbụna Henes.  Ihere ga-eme onye ọ bụla n’ihi ndị na-adịghị abara mmadụ uru, ndị na-adịghị enye aka, ndị ọ na-adịghị uru ha bara, kama ha bụ ihe ihere na ihe na-eweta nkọcha.”+  Okwu e kwuru megide anụ ọhịa ndị bi n’ebe ndịda:+ Gafere ala ahụhụ+ na ihe isi ike, ala ọdụm na agụ owuru ndị na-aba mba, ala ajụala na agwọ na-acha ọkụ ọkụ nke na-efe efe,+ ha na-ebu akụ̀ ha n’elu ịnyịnya ibu nke tojuru etoju, na-ebukwa ngwongwo ha n’azụ kamel.+ Ọ dịghị uru ha ga-abara ndị mmadụ.  Ndị Ijipt bụ naanị ihe efu, ọ bụkwa n’efu ka ha ga-enye aka.+ N’ihi ya, akpọwo m ala nke a: “Rehab+—ha nọ otu ebe.”  “Bịa, nọrọ n’ihu ha dee ya ná mbadamba ihe, deekwa ya n’akwụkwọ,+ ka ọ dịrị maka ọdịnihu, ka ọ bụrụ ihe akaebe ruo mgbe ebighị ebi.+  N’ihi na ha bụ ndị na-enupụ isi,+ ụmụ na-adịghị ekwu eziokwu,+ ụmụ na-achọghị ịnụ iwu Jehova;+ 10  ndị sịrị ndị na-ahụ ụzọ, ‘Unu ahụzila ụzọ,’ ndị sịkwara ndị na-ahụ ọhụụ, ‘Unu ahụzilara anyị ihe ziri ezi n’ọhụụ.+ Na-agwanụ anyị okwu na-atọ anyị ụtọ; na-ahụnụ ihe aghụghọ n’ọhụụ.+ 11  Sinụ n’ụzọ pụọ; sinụ n’ụzọ kpafuo.+ Kwụsịnụ ịgwa anyị banyere Onye Nsọ Izrel.’”+ 12  Ya mere, nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel kwuru: “N’ihi ọjụjụ unu jụrụ okwu a,+ ebe ọ bụkwa na unu tụkwasịrị obi n’irigbu mmadụ nakwa n’ihe aghụghọ, unu wee dabere na ya,+ 13  n’ihi ya, njehie a ga-adịrị unu ka akụkụ gbawara agbawa ná mgbidi, bụ́ nke na-achọ ịda ada, ebe nupụtara enupụta ná mgbidi dị elu,+ nke nwere ike ịda na mberede, n’otu ntabi anya.+ 14  A ga-etiwakwa ya dị ka ebe e tiwara nnukwu ite ndị ọkpụite kpụrụ,+ nke a kụrụ righirighi n’emereghị ya ebere, nke na a pụghị ịhụ n’iberibe ya ibe eju a ga-eji agụta ọkụ n’ekwú ọkụ ma ọ bụ nke a ga-eji kuru mmiri n’ebe apịtị dị.”+ 15  N’ihi na nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru: “Site n’ịlọghachi na ịnọrọ nwayọọ, a ga-azọpụta unu. Unu ga-adị ike naanị site n’ịnọrọ jụụ na ịtụkwasị m obi.”+ Ma unu achọghị.+ 16  Unu wee sị: “Ee e, kama nke ahụ, anyị ga-anọkwasị n’elu ịnyịnya gbaa ọsọ!”+ Ọ bụ ya mere unu ga-eji gbaa ọsọ. “Anyị ga-agba ịnyịnya na-efe ọsọ!”+ Ọ bụ ya mere ndị na-achụ unu ga-eji na-efe ọsọ.+ 17  Otu puku mmadụ ga-ama jijiji n’ihi ịba mba nke otu onye;+ n’ihi ịba mba nke mmadụ ise, unu ga-agbakata ọsọ ruo mgbe ndị fọdụrụ n’etiti unu ga-adị ka osisi ákwà ụgbọ mmiri nke dị n’elu ugwu, dịkwa ka ihe mgbaàmà e gwunyere n’elu ugwu.+ 18  Ya mere, Jehova ga na-atụ anya imere unu amara,+ n’ihi ya ọ ga-ebili imere unu ebere.+ N’ihi na Jehova bụ Chineke nke ikpe ziri ezi.+ Obi ụtọ+ na-adịrị ndị niile na-atụ anya ya.+ 19  Mgbe ndị nọ na Zayọn+ ga-ebiri na Jeruselem,+ ị gakwaghị akwa ákwá ma ọlị.+ Ọ ghaghị imere gị amara mgbe ọ nụrụ mkpu ákwá gị; ọ ga-aza gị ozugbo ọ nụrụ ya.+ 20  Jehova ga-enye unu nri n’ụdị ahụhụ, nyekwa unu mmiri n’ụdị mmegbu;+ n’agbanyeghị nke ahụ, Onye Ozizi Ukwu gị agakwaghị ezo onwe ya ezo, anya gị ga-aghọkwa anya na-ahụ Onye Ozizi Ukwu gị.+ 21  Ntị gị ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị: “Lekwa ụzọ.+ Jeenụ ije na ya,” ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya gaa n’aka nri ma ọ bụ gaa n’aka ekpe.+ 22  Unu ga-emerụkwa ihe e ji machie ihe oyiyi ọlaọcha unu niile a pịrị apị+ na ihe mkpuchi na-arapara n’ahụ́, bụ́ nke e ji kpuchie ihe oyiyi ọlaedo+ unu a wụrụ awụ.+ Unu ga-atụsasị ha.+ Dị ka nwaanyị nke nọ ná nsọ ya, ị ga-asị ha: “Unu bụ ihe ruru unyi!”+ 23  Ọ ga-emekwa ka mmiri zooro mkpụrụ ị kụrụ n’ala,+ nyekwa gị ihe oriri dị ka mkpụrụ nke ala, bụ́ nke ga-ama abụba, gbaakwa mmanụ.+ Anụ ụlọ gị ga-ata nri n’ụbọchị ahụ n’ebe ịta nri nke sara mbara.+ 24  Ehi na ịnyịnya ibu tojuru etoju ndị na-akọ ubi ga-ata nri e tinyere ahịhịa sọrel, bụ́ nke e ji shọvel+ na fọk e ji afụcha ọka* fụchaa. 25  Iyi+ na olulu mmiri ga-adị n’ugwu niile dị elu nakwa n’ugwu nta niile n’ụbọchị a ga-egbu ọtụtụ ndị mgbe ụlọ nche niile ga-ada.+ 26  Ìhè nke ọnwa gbazuru agbazu ga-adị ka ìhè anyanwụ na-achasi ike. Ìhè nke anyanwụ na-achasi ike ga-amụba okpukpu asaa,+ dị ka ìhè ụbọchị asaa, n’ụbọchị Jehova ga-ekechi ọkpụkpụ gbajiri ndị ya,+ gwọọkwa+ ọnyá dị ukwuu ha nwetara n’ihi ụtarị ọ pịara ha. 27  Lee! Aha Jehova si n’ebe dị anya na-abịa, n’iwe ya na-ere ọkụ+ nakwa n’oké ígwé ojii. Egbugbere ọnụ ya jupụtara n’amamikpe, ire ya dịkwa ka ọkụ na-erepịa ihe.+ 28  Mmụọ ya dị ka iyi tojubigara ókè nke na-eru mmadụ n’olu,+ ka o jiri myọ+ yọchapụta mba dị iche iche dị ka ihe efu; ọ ga-ekenyekwa eriri nchịkwa+ nke na-eduhie mmadụ ụzọ n’agba nke ndị dị iche iche.+ 29  Unu ga na-abụ abụ+ dị ka nke mmadụ na-abụ n’abalị ọ na-edo onwe ya nsọ maka ememme.+ Unu ga na-enwekwa ụdị obi aṅụrị nke onye ji ọjà na-enwe,+ bụ́ onye na-aga ka ọ rịgoro n’ugwu Jehova,+ ịgakwuru Oké Nkume Izrel.+ 30  Jehova ga-eme ka a nụ olu ya dị ebube,+ meekwa ka a hụ+ ogwe aka ya nke na-aga ịdakwasị ndị iro ya, n’oké iwe+ nakwa n’ire ọkụ nke ọkụ na-erepịa ihe+ na oké mmiri ozuzo na oké ifufe mmiri+ na akụ́ mmiri ígwé.+ 31  N’ihi na oké ụjọ+ ga-ejide Asiria n’ihi olu Jehova; ọ ga-akụkwa ya mkpara.+ 32  Ọnụ ụtarị ọ bụla Jehova ga-apịa Asiria, a ga-anụ ụda obere ịgbà na ụbọ akwara.+ Ọ ga-alụsokwa ha ọgụ site n’iji ogwe aka ya buo agha.+ 33  N’ihi na e doworị Tofet+ ya n’usoro n’oge na-adịbeghị anya; a kwadebewokwara ya eze.+ Ọ kwakọtawo nkụ ya n’ebe miri emi. E nwere ọkụ na nkụ dị ukwuu. Ume Jehova na-ere ka ọkụ megide ya, dị ka sọlfọ nke na-asọ ka mmiri.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Aịz 30:1*  Ma ọ bụ, “Iso ndị ọzọ jikọọ aka” site n’ịwụsa àjà ihe ọṅụṅụ.
Aịz 30:24*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.