Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 25:1-12

25  Jehova, ị bụ Chineke m.+ Ana m ebuli gị elu,+ ana m eto aha gị,+ n’ihi na i mewo ihe ndị dị ebube,+ i mezuwo ihe ndị i zubere ime+ kemgbe oge ochie, n’ikwesị ntụkwasị obi,+ n’eziokwu.+  N’ihi na i mewo ka obodo bụrụ ikpo nkume, i mewokwa ka obodo e wusiri ike bụrụ mkpọmkpọ ebe, meekwa ka ụlọ elu nke ndị ala ọzọ ghara ịbụkwa obodo, a gaghịkwa ewughachi ya ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.+  N’ihi nke a, ndị dị ike ga-eto gị; obodo nke mba ndị na-achị n’aka ike ga-atụ egwu gị.+  N’ihi na ị ghọworo onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebe e wusiri ike, ghọọkwara ogbenye ebe e wusiri ike iji pụọ n’ahụhụ ya,+ ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo, ndò+ iji zere okpomọkụ, mgbe ifufe ndị aka ike yiri oké mmiri ozuzo nke na-ezokwasị mgbidi.  Dị ka ị na-akwụsị okpomọkụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị, otú ahụ ka ị na-akwụsị mkpọtụ nke ndị ala ọzọ, ị na-ejikwa ndò nke ígwé ojii akwụsị okpomọkụ.+ A kwụsịwo abụ olu ụtọ nke ndị aka ike.+  Ọ bụkwa n’ugwu a+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emere ndị niile+ oké oriri nke ihe mara abụba,+ oké oriri nke ezigbo mmanya doro edo, nke ihe mara abụba nke ụmị jupụtara na ya,+ nke ezigbo mmanya+ doro edo, nke a zara aza.+  Ọ bụkwa n’ugwu a ka ọ ga-eloda ihu ihe mkpuchi nke kpuchiri ndị niile,+ na ákwà a kpara akpa nke kpuchiri mba niile.  Ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi,+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.+ Ọ ga-ewepụkwa n’ụwa dum nkọcha a na-akọcha ndị ya,+ n’ihi na Jehova ekwuwo ya.  A ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ: “Lee! Onye a bụ Chineke anyị.+ Anyị enwewo olileanya n’ebe ọ nọ,+ ọ ga-azọpụtakwa anyị.+ Onye a bụ Jehova.+ Anyị enwewo olileanya n’ebe ọ nọ. Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa aṅụrị ná nzọpụta ọ zọpụtara anyị.”+ 10  N’ihi na aka Jehova ga-adị n’ugwu a.+ A ga-azọdakwa Moab n’ebe ọ dị,+ dị ka ebe a zọdara ikpo okporo ọka n’ebe a na-awụfu nsị anụ.+ 11  Ọ ga na-eti aka n’ime ya dị ka ebe onye na-egwu mmiri na-eti aka iji gwuo mmiri. Ọ ga-ewedakwa mpako ya+ site n’iji akọ na-emegharị aka ya. 12  Ọ ga-akwatukwa obodo gị e wusiri ike, ya na mgbidi nchebe gị ndị dị elu; ọ ga-akwada ya, mee ka ọ daruo ala, ruo n’ájá.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji