Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 20:1-6

20  N’afọ Tatan+ bịara n’Ashdọd,+ mgbe Sagọn eze Asiria zipụrụ ya,+ o busoro Ashdọd agha wee weghara ya;+  n’oge ahụ, Jehova kwuru okwu site n’ọnụ Aịzaya nwa Emọz,+ sị: “Gaa+ tọpụ ákwà iru uju i kere n’úkwù;+ yipụkwa akpụkpọ ụkwụ i yi n’ụkwụ.”+ O wee mee otú ahụ, gbara ọtọ na-ejegharị n’ụkwụ efu.+  Jehova wee gaa n’ihu ịsị: “Dị nnọọ ka ohu m Aịzaya gba ọtọ, gbarakwa ụkwụ efu na-ejegharị ruo afọ atọ dị ka ihe ịrịba ama+ na ihe àmà megide Ijipt,+ megidekwa Itiopia,+  otú ahụ ka eze Asiria ga-esi duru ndị Ijipt+ a dọọrọ n’agha nakwa ndị Itiopia a chụpụrụ n’ala ha, ma ụmụaka ma ndị agadi, ndị gba ọtọ, gbarakwa ụkwụ efu, ndị ikè ha ghekwara oghe, bụ́ ọtọ Ijipt.+  Ha ga-atụ ụjọ, ihere Itiopia bụ́ olileanya ha+ nakwa Ijipt bụ́ ịma mma ha+ ga-eme ha.  Ndị bi n’ala a nke dị n’ụsọ osimiri ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ, ‘Leenụ otú ebe anyị nwere olileanya na ya dịzi, bụ́ ebe anyị gbagara maka enyemaka ka a napụta anyị n’aka eze Asiria!+ Olee otú anyị ga-esi alanahụ?’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji