Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 2:1-22

2  Ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ n’ọhụụ banyere Juda na Jeruselem:+  Ọ ga-eru n’oge ikpeazụ+ na a ga-eme ka ugwu nke ụlọ+ Jehova guzosie ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile,+ a ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile;+ mba niile ga-enubakwa n’ime ya.+  Ọtụtụ ndị ga-ejekwa wee sị: “Bịanụ+ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+ N’ihi na ọ bụ na Zayọn ka iwu ga-esi pụta, okwu Jehova ga-esikwa na Jeruselem pụta.+  Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba niile,+ doziekwara+ ọtụtụ ndị+ okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.+ Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.+  Ndị ụlọ Jekọb, bịanụ ka anyị jee ije n’ìhè Jehova.+  N’ihi na ị gbahapụwo ndị gị, bụ́ ụlọ Jekọb.+ N’ihi na ha jupụtara n’ihe si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ,+ ha na-emekwa anwansi+ dị ka ndị Filistia, ụmụ ala ọzọ jupụtakwara n’etiti ha.+  Ala ha jupụtara n’ọlaọcha na ọlaedo, akụ̀ ha anaghị agwụ agwụ.+ Ala ha jupụtara n’ịnyịnya, a pụghịkwa ịgụta ụgbọ ịnyịnya ha ọnụ.+  Ala ha jupụtakwara na chi na-abaghị uru.+ Ihe aka mmadụ rụrụ ka ha na-akpọrọ isiala, bụ́ ihe mkpịsị aka mmadụ mere.+  A na-ewetu mmadụ ala, wee mee ka mmadụ dị ala, ị pụghịkwa ịgbaghara ha.+ 10  Banye n’oké nkume, zookwa n’ájá n’ihi ịdị egwu Jehova, zookwa n’ihi ịdị ukwuu ya dị ebube.+ 11  A ga-eme ka anya dị mpako nke mmadụ dịrị ala, a ga-ewedakwa ịdị elu nke ndị mmadụ ala;+ ọ bụkwa naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ.+ 12  N’ihi na ọ bụ ụbọchị Jehova nke ụsụụ ndị agha.+ Ọ ga-abịakwasị onye ọ bụla dị mpako na onye na-ebuli onwe ya elu, bịakwasịkwa onye ọ bụla e buliri elu ma ọ bụ onye e wedara ala;+ 13  ọ ga-abịakwasịkwa osisi sida niile nke Lebanọn+ ndị dị elu na ndị e buliri elu nakwa oké osisi niile nke Beshan;+ 14  ọ ga-abịakwasịkwa ugwu niile dị elu na ugwu nta niile e buliri elu;+ 15  ọ ga-abịakwasịkwa ụlọ nche niile dị elu na mgbidi niile e wusiri ike;+ 16  ọ ga-abịakwasịkwa ụgbọ mmiri niile nke Tashish+ na ụgbọ epeepe niile a na-achọsi ike. 17  A ga-eweda mpako nke mmadụ ala, a ga-emekwa ka ịdị elu nke ndị mmadụ dị ala;+ ọ bụkwa naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ.+ 18  Chi ndị na-abaghị uru agaghị adịkwa ma ọlị.+ 19  Ndị mmadụ ga-abanyekwa n’ọgba nkume nakwa n’ime ọnụ n’ihi ịtụ Jehova ụjọ nakwa iji zoo n’ihi ịdị ukwuu ya dị ebube,+ mgbe ọ ga-ebili ka ụwa wee maa jijiji.+ 20  N’ụbọchị ahụ, mmadụ ga-atụfusị chi ya na-abaghị n’ihe, ndị e ji ọlaọcha mee, na chi ya na-abaghị uru ndị e ji ọlaedo mee, ndị e meere ya ka ọ na-akpọ isiala n’ihu ha. Ọ ga-atụpụrụ ha nkapị na ụsụ,+ 21  iji banye n’oghere ndị dị n’oké nkume nakwa n’ebe ndị gbawara agbawa na nkume dị elu, n’ihi ịtụ Jehova ụjọ nakwa iji zoo n’ihi ịdị ukwuu ya dị ebube,+ mgbe ọ ga-ebili ka ụwa wee maa jijiji. 22  Maka ọdịmma unu, hapụnụ mmadụ, bụ́ onye na-eji imi ya eku ume,+ n’ihi na ọ̀ bụ gịnị mere a ga-eji jiri ya kpọrọ ihe?+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji