Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 15:1-9

15  Okwu e kwuru megide Moab:+ N’ihi na e bukọrọwo ihe ya n’abalị, a lawo Aa+ nke Moab n’iyi. N’ihi na e bukọrọwo ihe ya n’abalị, a lawo Kia+ nke Moab n’iyi.  Ọ gbagowo n’Ụlọ Nsọ nakwa na Daịbọn,+ n’ebe ndị dị elu, ịkwa ákwá. Moab na-eti mkpu ákwá n’ihi Nibo+ nakwa n’ihi Medeba.+ Isi ndị niile nọ n’ime ya kwọchara akwọcha;+ a kpụrụ ajị agba ọ bụla akpụ.  Ha kere ákwà iru uju+ n’úkwù nọrọ n’okporo ámá ndị dị n’ime ya. Onye ọ bụla nke nọ n’ime ya na-eti mkpu ákwá n’elu ụlọ+ ndị dị n’ime ya nakwa n’ámá obodo ya, kwara ákwá na-agbada.+  Heshbọn na Iliele+ na-eti mkpu ákwá. A na-anụ olu ha na Jehaz.+ Ọ bụ ya mere ndị agha Moab ji na-eti mkpu. Mkpụrụ obi ya amawo jijiji n’ime ya.  Obi m na-akwara Moab ákwá.+ Ndị si n’ime ya gbapụ eruwo ọbụna Zoa+ na Eglat-shelaịshiya.+ N’ihi na n’ụzọ gbagoro Luhit+—onye ọ bụla ji ákwá na-agbago; n’ihi na ha nọ n’ụzọ Họroneyim+ na-akpasu iti mkpu ákwá banyere oké ọdachi ahụ.  N’ihi na mmiri Nimrim+ ga-atakọ. N’ihi na ahịhịa ndụ akpọnwụwo, ahịhịa adịkwaghị. Ọ dịghịzi ihe na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ.+  Ọ bụ ya mere ha ji na-eburu ihe fọdụrụ afọdụ na ihe ha kwakọbara na-agafere ndagwurugwu osisi pọpla.  N’ihi na mkpu ákwá ha eruwo ala Moab dum.+ Mkpu ákwá a na-eti n’ime ya eruwo Egleyim; mkpu ákwá a na-eti n’ime ya eruwo Bia-ilim,  n’ihi na mmiri nke Daịmọn ejupụtawo n’ọbara. N’ihi na m ga-eme ka ihe ndị ọzọ bịakwasị Daịmọn. Dị ka ihe atụ, ọdụm ga-awakpo ndị Moab gbapụrụ agbapụ na ndị fọdụrụ n’ala ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji