Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 12:1-6

12  Ị ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ:+ “M ga-ekele gị, Jehova, n’ihi na ọ bụ ezie na i wesoro m iwe, iwe gị dajụrụ,+ i wee kasie m obi.+  Lee! Chineke bụ nzọpụta m.+ M ga-atụkwasị ya obi, m gaghịkwa atụ ụjọ;+ n’ihi na Jaa Jehova bụ ike m+ na ume m,+ o wee ghọọrọ m nzọpụta.”+  Unu ga-eji aṅụrị sere mmiri n’isi iyi nke nzọpụta.+  Unu ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ: “Keleenụ+ Jehova! Kpọkuonụ aha ya.+ Meenụ ka a mara ọrụ ya n’etiti ndị dị iche iche.+ Kpọsaanụ na aha ya dị elu.+  Bụkuonụ Jehova abụ olu ụtọ,+ n’ihi na o meela oké ihe.+ A na-eme ka a mara nke a n’ụwa dum.  “Tisienụ mkpu ike, tiekwanụ mkpu ọṅụ, unu ndị bi na Zayọn, n’ihi na Onye Nsọ Izrel dị ukwuu n’etiti unu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji