Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Aịzaya 10:1-34

10  Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eti iwu ọjọọ+ na ndị na-ede ihe na-eweta nsogbu,  iji kwapụ ndị ogbenye n’okwu ikpe, napụkwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’etiti ndị m+ ikpe ziri ezi, ka ndị inyom di ha nwụrụ wee ghọọrọ ha ihe nkwata, ka ha wee bukọrọ ihe ụmụ na-enweghị nna!+  Gịnị ka unu ga-eme n’ụbọchị a ga-elebara unu anya+ nakwa mgbe mbibi ga-esi n’ebe dị anya bịa?+ Ònye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka,+ ebeekwa ka unu ga-ahapụ ebube unu,+  ma ọ́ bụghị mmadụ ihuru ala n’etiti ndị mkpọrọ, ndị mmadụ ana-adakwa n’etiti ndị e gburu egbu?+ N’ihi ihe a dum, iwe ya adajụbeghị, kama aka ya ka setịrị esetị.+  “Lee, onye Asiria+ bụ ụtarị nke iwe m,+ ọ bụ mkpara o ji n’aka ka m ga-eji weta amamikpe m!  M ga-eziga ya ka o buso mba dapụrụ n’ezi ofufe+ agha, m ga-enyekwa ya iwu ka o buso ndị m na-eweso iwe agha,+ ka ọ kwata ọtụtụ ihe, bukọrọkwa ọtụtụ ihe, meekwa ka ọ bụrụ ebe a ga na-azọtọ azọtọ dị ka ájá dị n’okporo ámá.+  Ọ bụ ezie na ya onwe ya adịghị otú ahụ, ọ ga-achọ ime otú ahụ; ọ bụ ezie na obi ya adịghị otú ahụ, ya onwe ya ga-akpa nkata, n’ihi na ihe dị ya n’obi bụ ịla ihe n’iyi,+ na ibipụ ọtụtụ mba.+  N’ihi na ọ ga-asị, ‘Ọ̀ bụ na ndị m mere ndị isi abụghịkwa ndị eze?+  Ọ̀ bụ na Kalno+ adịghị ka Kakemish?+ Ọ̀ bụ na Hemat+ adịghị ka Apad?+ Ọ̀ bụ na Sameria+ adịghị ka Damaskọs?+ 10  Mgbe ọ bụla aka m kpaara alaeze ndị nwere chi na-abaghị uru, bụ́ ndị ihe oyiyi ha a pịrị apị dị ọtụtụ karịa ndị dị na Jeruselem nakwa na Sameria,+ 11  ọ́ bụghị nnọọ otú m ga-eme Sameria na chi ya na-abaghị uru+ ka m ga-eme ọbụna Jeruselem na arụsị ya niile?’+ 12  “Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova rụchara ọrụ ya dum n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem, m ga-eme ka eze Asiria zaa ajụjụ maka ihe obi nganga ya rụpụtara nakwa maka mpako nke anya ya dị elu.+ 13  N’ihi na ọ sịwo, ‘M ga-eji aka m dị ike na amamihe m mee ihe,+ n’ihi na m nwere nghọta; m ga-ewepụ ókèala nke ndị dị iche iche,+ m ga-akwakọrọkwa ihe ha kpakọbara,+ dị ka onye dị ike ka m ga-akwada ndị bi n’ime ya.+ 14  Dị nnọọ ka ọ̀ bụ akwụ́, aka m+ ga-eru n’ebe akụ̀+ nke ndị dị iche iche dị; dịkwa ka mgbe mmadụ na-achịrị àkwá a hapụrụ ahapụ, mụ onwe m ga-achịkọrọ ọbụna ụwa dum, ọ dịghị nke ga-efegharị nku ya, ọ dịghịkwa nke ga-emeghe ọnụ ya ma ọ bụ bee ubé.’” 15  Anyụike ọ̀ ga-anyara onye ji ya egbutu ihe isi, ka mma e ji akwọ osisi ọ̀ ga-eche na ya ka onye ji ya akwọ osisi, dị ka à ga-asị na mkpanaka na-efegharị ndị na-eweli ya elu, dị ka à ga-asị na mkpara na-ebuli mmadụ nke na-abụghị osisi elu?+ 16  Ya mere, ezi Onyenwe anyị, Jehova nke ụsụụ ndị agha, ga na-ezigara ndị ya buru ibu ọrịa na-ata mmadụ ahụ́,+ ọkụ ga na-ere n’okpuru ebube ya dị ka mgbe ihe na-agba ọkụ.+ 17  Ìhè Izrel+ ga-aghọ ọkụ,+ Onye Nsọ ya ga-aghọkwa ire ọkụ;+ ọ ga-enwusi ike wee repịa ahịhịa na osisi ogwu ya+ n’otu ụbọchị. 18  Ọ ga-emekwa ka ebube nke oké ọhịa ya na nke ubi mkpụrụ osisi ya ghara ịdịkwa,+ malite ná mkpụrụ obi ruo n’anụ ahụ́ ya, ọ ga-adịkwa ka ịta ahụ́ nke onye ahụ́ na-esighị ike.+ 19  Osisi ndị ọzọ fọdụrụ n’oké ọhịa ya ga-adịzi ole na ole nke na nwatakịrị ga-enwe ike ide ole ha dị.+ 20  Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ, na ọ dịkwaghị mgbe ndị fọdụrụ n’Izrel+ na ndị lanahụrụ alanahụ n’ụlọ Jekọb ga-adabere n’onye ahụ nke na-eti ha ihe,+ ha ga-adaberekwa n’ebe Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ nọ, n’eziokwu.+ 21  Ọ bụ ndị fọdụrụ afọdụ, bụ́ ndị Jekọb fọdụrụnụ, ga-alọghachikwute Chineke bụ́ Dike.+ 22  N’ihi na ọ bụ ezie na ndị gị, gị Izrel, ga-adị ka ájá nke oké osimiri,+ naanị ndị fọdụrụ n’etiti ha ga-alọta.+ Mkpochapụ+ e kpebiworo ga na-asọ dị ka idei mmiri n’ezi omume,+ 23  n’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ga-eweta mkpochapụ,+ mezuokwa ihe o kpebisiri ike ime n’ala ahụ dum.+ 24  Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa+ Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru: “Unu ndị m bi na Zayọn,+ unu atụla egwu n’ihi onye Asiria ahụ, bụ́ onye na-apịabu unu ụtarị,+ onye na-ebulikwa mkpara ya n’oge gara aga megide unu otú Ijipt mere unu.+ 25  N’ihi na n’oge na-adịghị anya—amamikpe+ ga-akwụsịworị, iwe m emeekwa ka ha laa n’iyi.+ 26  Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-ewere ụtarị pịa ya+ dị ka mgbe o meriri Midian n’akụkụ oké nkume Oreb;+ mkpanaka ya ga-adị n’elu oké osimiri,+ ọ ga-ewelikwa ya elu otú ahụ o mere Ijipt.+ 27  “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ibu ya ga-apụ n’ubu gị,+ yok ya ga-apụkwa n’olu gị,+ a ga-ebibikwa yok ahụ+ n’ihi mmanụ.” 28  Ọ bịakwasịwo Ayat;+ ọ gaferela Migrọn; ọ kwasawo arịa ya na Mikmash.+ 29  Ha esila n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri gafee, Giba+ bụ ebe ha ga-arahụ, Rema+ amaala jijiji, Gibia+ nke Sọl agbaala ọsọ. 30  Tisie mkpu ike, gị ada bụ́ Galịm.+ Ṅaa ntị, Leisha. Ṅaa ntị, Anatọt, gị onye nọ n’ahụhụ!+ 31  Madmina agbaala ọsọ. Ndị bi na Gibịm agawo zoo. 32  Mgbe ìhè ka dị, ọ ga-akwụsịtụ na Nọb.+ Ọ na-atụ ugwu nke ada bụ́ Zayọn, bụ́ ugwu Jeruselem,+ aka iji yie ya egwu. 33  Lee! Ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, na-egbukapụsị alaka ka ha dajisie;+ a na-egbutukwa ndị toro ogo, na-emekwa ka ndị dị elu dị ala.+ 34  O jiriwo ngwá ọrụ e ji ígwè kpụọ gbutuo alụghụlụ ndị dị n’oké ọhịa, onye dị ike ga-emekwa ka Lebanọn daa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji