Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Timoti 1:1-18

1  Pọl, onyeozi nke Kraịst Jizọs site n’uche Chineke,+ dị ka nkwa nke ndụ+ ahụ e nwere n’ime Kraịst Jizọs si dị,+  na-edetara Timoti, bụ́ nwa a hụrụ n’anya,+ akwụkwọ: Ka obiọma na-erughịrị mmadụ, ebere, na udo nke si n’aka Chineke bụ́ Nna nakwa n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị dịnyere gị.+  Ana m ekele Chineke, bụ́ onye m na-ejere ozi dị nsọ+ dị ka nna nna m hà+ jere, sitekwa n’akọ na uche dị ọcha,+ na ọ dịbeghị mgbe m kwụsịrị icheta gị n’arịrịọ m na-arịọsi ike,+ abalị na ehihie.  Ọ na-agụsikwa m agụụ ike ịhụ gị,+ ebe m na-echeta anya mmiri gị, ka m wee jupụta n’ọṅụ.  N’ihi na m na-echeta okwukwe+ ahụ nke dị n’ime gị, nke na-abụghị nke ihu abụọ ọ bụla,+ nke bukwa ụzọ dịrị n’ime nne gị ochie bụ́ Lọịs na nne gị bụ́ Yunis, nke m nwere obi ike na ọ dịkwa n’ime gị.  Ọ bụ ya mere m ji na-echetara gị ka i mee ka onyinye+ Chineke nke dị n’ime gị site n’aka m bikwasịrị gị+ nwuo dị ka ọkụ.+  N’ihi na Chineke nyere anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụjọ,+ kama nke ike+ na nke ịhụnanya na nke uche zuru okè.+  Ya mere, ka ihere ịgba àmà banyere Onyenwe anyị ghara ime gị,+ ka ihere mụ onwe m, bụ́ onye mkpọrọ n’ihi Ya, ghara ime gị,+ kama kere òkè nke gị n’ịhụju anya+ n’ihi ozi ọma ahụ site n’ike Chineke.+  Ọ zọpụtara+ anyị ma kpọọ anyị òkù dị nsọ,+ ọ bụghị n’ihi ọrụ anyị,+ kama n’ihi nzube ya na obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ. E nyere anyị nke a n’ime Kraịst Jizọs tupu mgbe dị anya gara aga,+ 10  ma ugbu a, e mewo ka ọ pụta ìhè nke ọma site ná mpụta ìhè+ nke Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Kraịst Jizọs, onye wepụrụ ọnwụ+ ma mee ka ìhè nwukwasị+ ná ndụ+ nakwa n’ereghị ure+ site n’ozi ọma ahụ,+ 11  bụ́ nke a họpụtara m n’ihi ya ka m bụrụ onye nkwusa na onyeozi na onye ozizi.+ 12  Ọ bụ n’ihi nke a ka m na-atakwa ahụhụ+ ndị a, ma ihere adịghị eme m.+ N’ihi na amaara m onye m kweere na ya, enwekwara m obi ike na o nwere ike iche ihe m nyefere n’aka ya nche+ ruo ụbọchị ahụ.+ 13  Jidesie ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ+ ike bụ́ nke ị nụrụ n’ọnụ m, ya na okwukwe na ịhụnanya ndị dị n’ime Kraịst Jizọs.+ 14  Na-eche ezi ihe a nke e nyefere n’aka gị+ nche site na mmụọ nsọ nke dị n’ime anyị.+ 15  Ị maara nke a, na ndị niile nọ ná mpaghara Eshia+ agbakụtawo m azụ.+ Faịjelọs na Hemọjinis so n’ime ha. 16  Ka Onyenwe anyị meere ezinụlọ Onesịfọrọs+ ebere, n’ihi na mgbe mgbe o mere ka m nwee ume,+ ihere agbụ ígwè m emeghịkwa ya.+ 17  Kama nke ahụ, mgbe ọ bịara Rom, ọ chọsiri m ike wee chọta m.+ 18  Ka Onyenwe anyị mee ka o nweta ebere+ n’aka Jehova n’ụbọchị ahụ.+ Ị maara nke ọma banyere ozi niile o jere n’Efesọs.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji