Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 3:1-39

3  Agha nke dị n’etiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid wee dịtee aka;+ Devid wee na-adịwanye ike,+ ma ụlọ Sọl nọ na-ada.+  Ka nke a na-eme, a mụụrụ Devid ụmụ ndị ikom+ na Hibrọn,+ ọkpara ya bụ Amnọn,+ onye Ahịnoam+ nwaanyị Jezril mụrụ.  Nwa ya nke abụọ bụ Kiliab+ nke Abigel+ nwunye Nebal onye Kamel mụrụ, nke atọ bụ Absalọm+ nwa Meaka ada Talmaị+ bụ́ eze Geshọ.  Nke anọ bụ Adọnaịja+ nwa Hagit,+ nke ise bụ Shefataya+ nwa Abaịtal.  Nke isii bụ Itriam,+ onye Egla, nwunye Devid, mụrụ. Ọ bụ ndị a ka a mụụrụ Devid n’ime Hibrọn.  O wee ruo na ka agha ahụ nke dị n’etiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid nọ na-aga n’ihu, Abna+ nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike n’ụlọ Sọl.  Sọl nwere iko nwaanyị aha ya bụ Rizpa,+ ada Eya.+ E mesịa, Ish-boshet+ sịrị Abna: “Gịnị mere i ji dinaa iko+ nna m?”  Abna wee wee iwe nke ukwuu+ n’ihi ihe ahụ Ish-boshet kwuru, o wee sị: “M̀ bụ isi nkịta+ nke Juda? Taa, m na-egosi ụlọ Sọl nna gị obiọma,* tinyere ụmụnne ya na ndị enyi ya, ekweghịkwa m ka aka Devid kpara gị; ma, ị chọrọ ka m zaa ajụjụ taa maka njehie metụtara nwaanyị.  Ka Chineke mee Abna otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya,+ ma ọ bụrụ na ọ bụghị dị ka Jehova ṅụụrụ Devid n’iyi+ ka m ga-emere ya, 10  iji wepụ alaeze n’ụlọ Sọl, meekwa ka ocheeze Devid guzosie ike ịchị Izrel na Juda malite na Dan ruo Bia-shiba.”+ 11  O nweghịkwa ike ịza Abna ihe ọ bụla n’ihi na ọ tụrụ ya egwu.+ 12  Abna wee zigara Devid ndị ozi ozugbo, sị: “Ònye nwe ala a?” o wee sịkwa: “Ka mụ na gị gbaa ndụ, lee! aka m ga-akwado gị wee mee ka Izrel dum dịnyere gị.”+ 13  O wee sị: “Ọ dị mma! Mụ na gị ga-agba ndụ. Naanị otu ihe ka m na-achọ n’aka gị: ‘Ị gaghị ahụ ihu m+ ọ gwụkwala ma ì bu ụzọ kpọta Maịkal,+ ada Sọl, mgbe ị ga-abịa ịhụ ihu m.’” 14  Devid zigakwaara Ish-boshet,+ nwa Sọl, ndị ozi, sị: “Kpọnyeghachi m nwunye m bụ́ Maịkal, onye m ji otu narị apị́+ ndị Filistia kwe nkwa ọlụlụ.” 15  Ish-boshet wee zie ozi kpọpụta ya n’aka di ya, bụ́ Pọltaị+ nwa Leyish. 16  Ma di ya so ya na-eje, bere ákwá na-eso ya n’azụ ruo Bahurim.+ Abna wee sị ya: “Laghachi!” O wee laghachi. 17  Ka ihe ndị a na-eme, Abna zigaara ndị okenye Izrel ozi, sị: “Ma ụnyaahụ ma n’oge gara aga,+ unu nọ na-achọ ka Devid bụrụ eze unu. 18  Ugbu a, meenụ ihe, n’ihi na Jehova sịrị Devid, ‘M ga-esite n’aka ohu m Devid+ zọpụta ndị m bụ́ Izrel n’aka ndị Filistia nakwa n’aka ndị iro ha niile.’” 19  Abna wee kwuo okwu ná ntị ụmụ Benjamin,+ e mesịa, Abna gakwara na Hibrọn kwuo ná ntị Devid ihe niile dị mma n’anya Izrel nakwa n’anya ụlọ Benjamin dum. 20  Mgbe Abna bịakwutere Devid n’ime Hibrọn, ya na ndị ikom iri abụọ, Devid meere Abna na ndị ikom ya na ha so oriri.+ 21  Abna wee sị Devid: “Ka m bilie gaa kpọkọta Izrel dum ka ha bịakwute onyenwe m eze, ka gị na ha gbaa ndụ, ị ga-abụkwa eze ndị niile na-agụ mkpụrụ obi gị agụụ.”+ Devid wee zipụ Abna, o wee lawa n’udo.+ 22  Ma, lee, Joab na ndị na-ejere Devid ozi si n’ebe ha gara mwakpo na-alọta, ihe ha kwatara+ dịkwa ukwuu. Ma Abna esoghị Devid nọrọ na Hibrọn, n’ihi na ọ hapụla ya ka ọ laa, ọ lawakwara n’udo. 23  Joab+ na ndị agha niile ya na ha so lọtara, e wee kọọrọ Joab, sị: “Abna+ nwa Nee+ bịakwutere eze, o wee hapụ ya ka ọ lawa, ọ lawala n’udo.” 24  Joab wee bakwuru eze, sị: “Gịnị bụ ihe a i mere?+ Lee! Abna bịakwutere gị. Gịnị mere i ji hapụ ya ka ọ lawa, o wee lawa n’udo? 25  Ị maara Abna nwa Nee nke ọma, na ihe ọ bịara bụ ka ọ ghọgbuo gị, ka ọ mara ọpụpụ gị na mbata gị,+ marakwa ihe niile ị na-eme.”+ 26  Joab wee si n’ebe Devid nọ pụọ ma zipụ ndị ozi ka ha chụwa Abna, ha wee mee ka o si n’olulu mmiri Saịra lọghachite;+ ma Devid amaghị banyere ya. 27  Mgbe Abna lọghachitere na Hibrọn,+ Joab kpọpụrụ ya iche, ha wee banye n’ọnụ ụzọ ámá ka ọ gwa ya okwu na nzuzo.+ Otú ọ dị, ọ mara ya mma n’afọ n’ebe ahụ,+ o wee nwụọ n’ihi ọbara Asahel+ nwanne ya. 28  Mgbe Devid mesịrị nụ ya, ọ sịrị ozugbo: “N’anya Jehova, ọbara+ Abna nwa Nee adịghị n’isi mụ na alaeze m ruo mgbe ebighị ebi. 29  Ka ọ dịrị n’isi+ Joab nakwa n’isi ụlọ nna ya dum, ka ọ gharakwa ịdị mgbe a na-agaghị enwe n’ụlọ+ Joab nwoke ihe na-agbapụta n’ihe o ji bụrụ nwoke+ ma ọ bụ onye ekpenta+ ma ọ bụ nwoke na-ejide ihe e ji akpa ákwà+ ma ọ bụ onye e ji mma agha gbuo ma ọ bụ onye nri kọrọ!”+ 30  Joab na Abishaị+ nwanne ya gburu Abna+ n’ihi na o gburu Asahel nwanne ha n’agha+ na Gibiọn. 31  Devid wee gwa Joab na ndị niile ya na ha nọ, sị: “Dọwaanụ uwe unu,+ keekwanụ ákwà iru uju n’úkwù,+ kwaakwanụ ákwá arịrị n’ihu Abna.” Ọbụna Eze Devid nọ na-ejegharị n’azụ ihe ndina ya. 32  Ha wee lie Abna n’ime Hibrọn; eze wee malite ịkwa ákwá n’olu dara ụda n’ebe e liri Abna, mmadụ niile wee kwaa ákwá.+ 33  Eze wee bụọ abụ iru uju n’ihi Abna, sị: “Abna ò kwesịrị ịnwụ dị ka onye nzuzu?+ 34  E keghị aka gị agbụ,+ A tụghịkwa gị ịgà e ji ọla kọpa mee.+ Dị ka onye na-ada n’ihu ụmụ ajọ omume+ ka ị daworo.” Mmadụ niile wee kwaara ya ákwá+ ọzọ. 35  E mesịa, mmadụ niile bịara inye Devid nri+ iji gụgụọ ya obi n’otu ụbọchị ahụ, ma Devid ṅụrụ iyi, sị: “Ka Chineke mee m otú a,+ ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya, ma ọ bụrụ na m detụ nri ma ọ bụ ihe ọ bụla ọnụ tupu anyanwụ adaa!”+ 36  Mmadụ niile hụkwara ihe merenụ, o wee dị ha mma. Ọ dị mmadụ niile mma, dịkwa ka ihe niile eze na-eme si adị ha.+ 37  Mmadụ niile na Izrel dum wee mara n’ụbọchị ahụ na ọ bụghị eze kwuru ka e gbuo Abna nwa Nee.+ 38  Eze wee gaa n’ihu ịsị ndị na-ejere ya ozi: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụ onyeisi na onye ukwu nwụrụ taa n’Izrel?+ 39  Taa, adịghị m ike, ọ bụ ezie na e tere m mmanụ+ ịbụ eze, obi ọjọọ ndị ikom a, bụ́ ụmụ Zeruya,+ karịrị m.+ Ka Jehova kwụọ onye na-eme ihe ọjọọ ụgwọ dị ka ihe ọjọọ ya si dị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

2Sa 3:8*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”