Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 19:1-43

19  E mesịa, a kọọrọ Joab, sị: “Lee! Eze na-akwa ákwá, ọ na-erukwara Absalọm uju.”+  Nzọpụta e nwere n’ụbọchị ahụ wee ghọọrọ mmadụ niile ihe iru uju, n’ihi na ha nụrụ ka a na-ekwu n’ụbọchị ahụ, sị: “Eze nọ ná mwute n’ihi nwa ya.”  Ndị agha wee zoro ezoro na-abata n’obodo+ n’ụbọchị ahụ, dị nnọọ ka ndị agha na-esi ezoro ezoro alọta mgbe e menyere ha ihere n’ihi na ha si n’agha gbaa ọsọ.  Eze wee kpuchie ihu ya, eze wee nọrọ na-akwa ákwá n’oké olu, sị: “Nwa m Absalọm! Absalọm nwa m, nwa m!”+  N’ikpeazụ, Joab bịakwutere eze n’ụlọ wee sị: “I menyewo ndị niile na-ejere gị ozi ihere n’ihu taa, bụ́ ndị na-emere mkpụrụ obi gị ụzọ mgbapụ taa,+ na-emekwara mkpụrụ obi ụmụ gị ndị ikom+ na ụmụ gị ndị inyom+ nakwa mkpụrụ obi ndị nwunye gị+ nakwa mkpụrụ obi ndị iko gị+ ụzọ mgbapụ,  site n’ịhụ ndị kpọrọ gị asị n’anya, sitekwa n’ịkpọ ndị hụrụ gị n’anya asị; n’ihi na i gosiwo taa na ndị isi na ndị na-eje ozi abụghịrị gị ihe ọ bụla, n’ihi na m maara nke ọma taa na a sị nnọọ na Absalọm dị ndụ ma anyị niile anwụchaa taa, mgbe ahụ, ọ gaara adị gị mma.  Ugbu a, bilie, pụọ n’èzí gaa gwa ndị na-ejere gị ozi okwu ga-eru ha n’obi,+ n’ihi na, m ji Jehova na-aṅụ iyi na, ọ bụrụ na ị pụghị n’èzí, ọ dịghị nwoke ọ bụla gị na ya ga-anọ n’abalị a;+ nke a ga-adịkwara gị njọ karịa ihe ọjọọ niile dakwasịworo gị malite n’oge ị bụ nwata ruo ugbu a.”  Eze wee bilie gaa nọrọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá,+ ha wee gwa mmadụ niile, sị: “Lee, eze nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá.” Mmadụ niile wee malite ịbịa n’ihu eze. Ma Izrel gbalara, onye ọ bụla n’ụlọ ya.+  Mmadụ niile wee na-eserịta okwu n’ebo niile nke Izrel, na-asị: “Ọ bụ eze napụtara anyị n’ọbụ aka ndị iro anyị,+ ọ bụkwa ya mere ka anyị gbapụ n’ọbụ aka ndị Filistia; ugbu a, ọ gbapụwokwa n’ala a n’ihi Absalọm.+ 10  Ma Absalọm, onye anyị tere mmanụ ịchị anyị,+ anwụwo n’agha.+ Gịnịzi mere na ọ dịghị ihe unu na-eme iji mee ka eze lọta?”+ 11  Ma Eze Devid ziri Zedọk+ na Abayata+ bụ́ ndị nchụàjà ozi, sị: “Gwanụ ndị okenye Juda,+ sị, ‘Gịnị mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-eme ka eze lọta n’ụlọ ya, ebe ọ bụ na okwu Izrel dum eruwo eze ntị n’ụlọ ya? 12  Unu bụ ụmụnne m; mụ na unu bụ otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́.+ Gịnịzi mere unu ga-eji bụrụ ndị ikpeazụ ga-eme ka eze lọta?’ 13  Gwakwanụ Amesa, sị,+ ‘Ọ̀ bụ na mụ na gị abụghị otu ọkpụkpụ na otu anụ ahụ́? Ka Chineke mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya+ ma ọ bụrụ na ị gaghị abụ onyeisi ndị agha n’ihu m mgbe niile n’ọnọdụ Joab.’”+ 14  O wee gbanwee obi ndị Juda niile dị ka otu onye,+ ha wee zie eze ozi, sị: “Lọta, gị na ndị niile na-ejere gị ozi.” 15  Eze wee lawa wee rute Jọdan. Ma Juda bịarutere Gilgal+ ka ha gaa zute eze, iji duru eze gafee Jọdan. 16  Shimiaị+ nwa Gira+ onye ebo Benjamin, bụ́ onye si Bahurim,+ mere ngwa ngwa soro ndị ikom Juda gbadaa izute Eze Devid. 17  Otu puku ndị ikom bụ́ ndị si n’ebo Benjamin so ya. (Zaịba+ onye na-eje ozi n’ụlọ Sọl na ụmụ ya ndị ikom iri na ise,+ na mmadụ iri abụọ na-ejere ya ozi sokwa ya, ha wee bịarute Jọdan n’ihu eze n’enweghị nsogbu. 18  O wee si n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri+ gafee iji dufeta ezinụlọ eze nakwa iji mee ihe dị mma n’anya ya.) Ma Shimiaị nwa Gira daara eze n’ala mgbe ọ chọrọ ịgafeta Jọdan.+ 19  O wee sị eze: “Ka onyenwe m ghara ịgụrụ m njehie m, echetakwala ihe ọjọọ ohu gị mere+ n’ụbọchị onyenwe m eze si na Jeruselem pụọ, ka eze ghara iburu ya n’obi.+ 20  N’ihi na ohu gị maara nke ọma na ọ bụ m mehiere; ya mere, abụ m onye mbụ si n’ụlọ Josef+ dum gbadata izute onyenwe m eze.” 21  Ozugbo ahụ, Abishaị+ nwa Zeruya+ zara, sị: “Ọ̀ bụ na e kwesịghị igbu Shimiaị iji kwụọ ya ụgwọ maka ịkpọ onye Jehova tere mmanụ iyi?”+ 22  Ma Devid sịrị: “Unu ụmụ Zeruya, gịnị jikọrọ mụ na unu,+ mere unu ga-eji na-eguzogide m taa?+ È kwesịrị igbu onye ọ bụla taa n’Izrel?+ Ọ̀ bụ na mụ amaghị nke ọma na abụ m eze Izrel taa?” 23  Eze wee sị Shimiaị: “Ị gaghị anwụ.” Eze wee ṅụọrọ ya iyi.+ 24  Ma Mefiboshet+ nwa nwa Sọl gbadatara izute eze; ọ saghị ụkwụ+ ya,* o dozighịkwa afụ ọnụ ya,*+ ọ sụghịkwa uwe ya mmiri malite n’ụbọchị eze pụrụ ruo n’ụbọchị ọ lọtara n’udo. 25  O wee ruo mgbe ọ bịara Jeruselem izute eze na eze jụrụ ya, sị: “Mefiboshet, gịnị mere i soghị m gaa?” 26  O wee zaa, sị: “Onyenwe m eze, ọ bụ onye na-ejere m ozi+ ghọgburu m. N’ihi na ohu gị sịrị, ‘Ka m dokwasịrị onwe m ihe m ji anọkwasị n’elu nne ịnyịnya wee nọkwasị na ya soro eze gawa,’ n’ihi na ohu gị dara ngwọrọ.+ 27  O wee kwutọọ+ ohu gị n’ihu onyenwe m eze. Ma onyenwe m eze dị ka mmụọ ozi+ nke ezi Chineke, ya mere, mee ihe dị mma n’anya gị. 28  N’ihi na ezinụlọ nna m dum gaara abụ ndị onyenwe m eze gbuchapụrụ, ma i mere ka ohu gị soro ná ndị na-eri ihe na tebụl gị.+ Olee ezi ihe ọzọ mere m ka ga-eji na-ebesara eze ákwá?”+ 29  Otú ọ dị, eze sịrị ya: “Gịnị mere ị ka ji na-ekwu ihe ndị a? Ana m asị, Gị na Zaịba kee ala ahụ.”+ 30  Mefiboshet wee sị eze: “Ya werechaa ya,+ ugbu a onyenwe m eze lọtara n’ụlọ ya n’udo.” 31  Bazilaị+ onye Gilied wee si Rogilim gbadata ka ya na eze gawa Jọdan, ka o wee duruo ya Jọdan. 32  Bazilaị emewokwa nnọọ agadi, ọ dị afọ iri asatọ;+ ọ bụkwa ya nyere eze ihe oriri mgbe o bi na Mahaneyim,+ n’ihi na ọ bụ nnukwu mmadụ.+ 33  Eze wee sị Bazilaị: “Soro m gafere, mụ na gị ga-anọ na Jeruselem, m ga na-enye gị nri.”+ 34  Ma Bazilaị sịrị eze: “Ọ̀ fọkwaaranụ m afọ ole ná ndụ mere m ga-eji soro eze gbagoo Jeruselem? 35  Adị m afọ iri asatọ taa.+ M̀ pụrụ ịma ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ, ka ohu gị ọ̀ ka pụrụ ịnụ ụtọ ihe o riri na ihe ọ ṅụrụ,+ ka m̀ pụrụ ịnụ olu+ ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ?+ Gịnịzi mere ohu gị ka ga-eji bụụrụ onyenwe m eze ibu arọ?+ 36  N’ihi na ohu gị pụrụ naanị idurute eze na Jọdan, gịnị mere eze ga-eji were ihe ndị a kwụọ m ụgwọ?+ 37  Biko, hapụ ohu gị ka ọ lawa, ka m nwụọkwa+ n’obodo m n’ebe dị nso n’ili nna m na nne m.+ Ma, lee ohu gị bụ́ Kimham.+ Ka o soro onyenwe m eze gafere; meere ya ihe ọ bụla dị mma n’anya gị.” 38  Eze wee sị: “Kimham ga-eso m gafee, mụ onwe m ga-emekwara ya ihe dị mma n’anya gị; m ga-emere gị ihe ọ bụla ị chọrọ ka m meere gị.” 39  Mmadụ niile wee malite ịgafe Jọdan, eze gafekwara; ma eze susuru Bazilaị ọnụ+ wee gọzie+ ya, e mesịa, ọ laghachiri n’obodo ya. 40  Mgbe eze gafere wee bịarute Gilgal,+ Kimham sokwa ya gafee, tinyere ndị Juda niile nakwa ọkara ndị Izrel, ka ha wee kpọfeta eze. 41  Ma, lee! ndị Izrel niile nọ na-abịakwute eze, ha wee jụọ eze, sị: “Gịnị mere+ ụmụnne anyị ndị Juda ji kpọrọ gị na nzuzo ka ha wee kpọrọ eze na ezinụlọ ya na ndị ikom niile nke Devid gafee Jọdan?”+ 42  Ndị Juda niile wee zaa ndị Izrel, sị: “N’ihi na eze bụ onye ikwu anyị;+ oleekwanụ ihe unu na-ewere iwe n’ihe a? Ọ̀ dịwo ihe anyị riri nke si n’akpa eze, ka è buteworo anyị onyinye?” 43  Otú ọ dị, ndị Izrel zara ndị Juda, sị: “Anyị nwere òkè iri n’ebe eze nọ,+ ya mere, òkè anyị nwere n’ebe Devid nọ karịrị nke unu. Gịnịzi mere unu ji lelịa anyị anya, gịnịkwa mere na ọ bụghị anyị bụ ndị mbụ+ ga-eme ka eze anyị lọta?” Ma olu ndị Juda karịrị nke ndị Izrel.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

2Sa 19:24*  Okwu Hibru a pụkwara ịgụnye ibe mbọ ụkwụ.
2Sa 19:24*  Ya bụ, ajị dị n’elu egbugbere ọnụ.