Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 14:1-33

14  Joab+ nwa Zeruya+ wee mara na obi eze dị n’ebe Absalọm nọ.+  Joab wee ziga ozi na Tekoa+ ma si n’ebe ahụ kpọta otu nwaanyị maara ihe+ wee sị ya: “Biko, ruwe uju, yirikwa uwe iru uju, etekwala mmanụ;+ dịrịkwa ka nwaanyị nke nọworo na-eruru onye nwụrụ anwụ uju ọtụtụ ụbọchị.+  Gakwuru eze, gwa ya ihe dị otú a.” Joab wee gwa ya ihe ọ ga-ekwu.+  Nwaanyị Tekoa ahụ wee bịakwute eze, gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala+ wee kpọọ isiala, sị: “Biko, eze, zọpụta m!”+  Eze wee jụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ gịnị na-eme gị?” Nwaanyị ahụ wee sị: “N’ezie, abụ m nwaanyị isi mkpe,+ ebe ọ bụ na di m anwụwo.  Ohu gị nwaanyị nwere ụmụ nwoke abụọ, ha abụọ wee malite ịlụ ọgụ n’ọhịa+ n’enweghị onye nnapụta+ ga-egbo ha. N’ikpeazụ, otu wee gbuo ibe ya.  Lee, ndị ezinụlọ m dum ebiliwo megide ohu gị nwaanyị wee sị, ‘Kpọpụta onye ahụ gburu nwanne ya ka anyị gbuo ya n’ihi mkpụrụ obi nwanne ya,+ bụ́ onye o gburu,+ ka anyị laakwa onye nketa n’iyi!’ Ha ga-emenyụkwa icheku ọkụ m fọdụrụnụ, wee mee ka di m ghara inwe aha ma ọ bụ onye ga-afọdụrụ ya n’elu ala.”+  Eze wee sị nwaanyị ahụ: “Laa n’ụlọ gị, mụ onwe m ga-enye iwu banyere gị.”+  Nwaanyị Tekoa ahụ wee sị eze: “Onyenwe m eze, ka njehie ahụ dịrị n’isi m nakwa n’isi ụlọ nna m,+ ma ka aka eze na ocheeze ya dịrị ọcha.” 10  Eze wee sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa gị okwu, kpọtara m ya, ọ gaghịkwa enye gị nsogbu ọ bụla ọzọ.” 11  Ma ọ sịrị: “Biko, eze, cheta Jehova bụ́ Chineke gị,+ ka onye ọbọ ọbara+ ghara ịnọ na-akpata mbibi mgbe niile, ka a gharakwa ịla nwa m nwoke n’iyi.” O wee sị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ otu ntutu isi+ nke nwa gị nwoke agaghị ada n’ala.” 12  Nwaanyị ahụ wee sị: “Biko, ka ohu gị nwaanyị+ gwatụ onyenwe m eze okwu.”+ O wee sị: “Kwuo!”+ 13  Nwaanyị ahụ wee sị: “Gịnịzi mere i ji chee ihe dị otú a+ imegide ndị Chineke?+ Ka eze na-ekwu ihe a, ya onwe ya dị ka onye ikpe mara,+ n’ihi na eze akpọlatabeghị onye nke ya a chụpụrụ achụpụ.+ 14  N’ihi na anyị ga-anwụrịrị+ wee dị ka mmiri nke a na-awụpụ n’ala, bụ́ nke na-enweghị mkpokọta. Ma Chineke agaghị ebipụ otu mkpụrụ obi,+ o chepụtawokwa ihe mere onye a chụpụrụ achụpụ ga-eji bụrụ onye a na-achụpụghị n’ebe ọ nọ. 15  Ugbu a m batara ịgwa onyenwe m eze okwu a, ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ menyere m ụjọ. Ọ bụ ya mere ohu gị nwaanyị ji sị, ‘Biko, ka m gwa eze okwu. Ma eleghị anya, eze ga-eme ihe banyere ihe ohu ya nwaanyị kwuru. 16  N’ihi na eze gere ntị iji napụta ohu ya nwaanyị n’aka nwoke na-achọ ibipụ mụ na naanị otu nwa nwoke m nwere n’ihe nketa Chineke nyere,’+ 17  ọ bụ ya mere ohu gị nwaanyị ji sị, ‘Biko, ka okwu onyenwe m eze weta ezumike.’ N’ihi na dị nnọọ ka mmụọ ozi+ nke ezi Chineke dị, ọ bụ otú ahụ ka onyenwe m eze dị, n’ịmata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ,+ ka Jehova bụ́ Chineke gị nọnyekwara gị.” 18  Eze wee zaa nwaanyị ahụ, sị: “Biko, ezorola m ihe ọ bụla n’ihe m ga-ajụ gị.”+ Nwaanyị ahụ wee sị: “Biko, onyenwe m eze, jụwa.” 19  Eze wee jụọ ya, sị: “Aka Joab+ ọ̀ dị n’ihe a dum i kwuru?”+ Nwaanyị ahụ wee zaa, sị: “Dị nnọọ ka mkpụrụ obi gị dị ndụ,+ onyenwe m eze, ọ dịghị onye pụrụ ịhapụ ihe niile onyenwe m eze kwuru gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe; n’ihi na ọ bụ onye na-ejere gị ozi bụ́ Joab nyere m iwu, ọ bụkwa ya gwara ohu gị nwaanyị ihe a niile m kwuru.+ 20  Ọ bụ ka e wee lee okwu a anya n’ụzọ dị iche mere onye na-ejere gị ozi bụ́ Joab ji mee ihe a, ma onyenwe m nwere amamihe yiri amamihe mmụọ ozi+ nke ezi Chineke iji mara ihe niile dị n’ụwa.” 21  Eze wee sị Joab: “Lee, m ga-eme ya.+ Ya mere, gaa kpọlata nwa okorobịa ahụ bụ́ Absalọm.”+ 22  Joab wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpọọ isiala wee gọzie+ eze; Joab wee sị: “Taa ka ohu gị maara na ihe m masịrị gị,+ onyenwe m eze, n’ihi na eze emewo ihe ohu ya kwuru.” 23  Joab wee bilie gaa Geshọ+ wee kpọlata Absalọm na Jeruselem.+ 24  Otú ọ dị, eze sịrị: “Ya lawa n’ụlọ ya, ma ọ gaghị ahụ ihu m.”+ Absalọm wee laa n’ụlọ ya, ọ hụghịkwa ihu eze. 25  Ọ dịghị nwoke mara mma+ n’Izrel dum dị ka Absalọm, nke a ga-eto otú e si eto ya. Malite n’ọbụ ụkwụ ya ruo n’opu isi ya, ntụpọ adịghị ya n’ahụ́. 26  Mgbe ọ kpụrụ isi ya—ọ na-abụkwa ná ngwụcha afọ ọ bụla ka ọ na-akpụ ya; ebe ọ na-adị arọ+ n’isi ya, ọ na-akpụ ya—ọ tụrụ ntutu isi ya atụ̀, ya adịrị narị shekel abụọ ma e jiri nkume ihe ọ̀tụ̀tụ̀ eze tụọ ya. 27  E wee mụọrọ Absalọm ụmụ nwoke atọ+ na otu nwaanyị onye aha ya bụ Tema. Ọ bụ nwaanyị mara mma nke ukwuu.+ 28  Absalọm wee bie na Jeruselem afọ abụọ zuru ezu, ma ọ hụghị ihu eze.+ 29  Absalọm wee zie ozi ka a kpọọ Joab, ka o zie ya ka ọ gakwuru eze, ma o kweghị abịakwute ya. O wee zie ozi ọzọ, nke ugboro abụọ, ma o kweghị abịa. 30  N’ikpeazụ, ọ sịrị ndị na-ejere ya ozi: “Ùnu hụrụ ibé ala Joab ahụ dị n’akụkụ nke m, bụ́ ebe ọ kụrụ ọka bali? Gaanụ sunye ya ọkụ.”+ Ndị na-ejere Absalọm ozi wee sunye ibé ala ahụ ọkụ.+ 31  Joab wee bilie bịakwute Absalọm n’ụlọ, jụọ ya, sị : “Gịnị mere ndị na-ejere gị ozi ji sunye ibé ala m ọkụ?” 32  Absalọm wee sị Joab: “Lee! M ziri gị ozi, sị, ‘Bịa ebe a ka m zie gị ozi ka ị gakwuru eze, sị: “Olee ihe mere m ji si Geshọ lọta?+ Ọ gaara akara m mma ma a sị na m ka nọ n’ebe ahụ. Ma, ugbu a, ka m hụ ihu eze. Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m mere,+ ya gbuo m.”’” 33  Joab wee bịakwute eze, kọọrọ ya. O wee kpọọ Absalọm. Absalọm wee bịakwute eze, gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala n’ihu eze wee kpọọrọ ya isiala; e mesịa, eze susuru Absalọm ọnụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji