Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 13:1-39

13  O wee ruo mgbe ihe ndị ahụ gasịrị na Absalọm+ nwa Devid nwere nwanne nwaanyị mara mma, onye aha ya bụ Tema,+ Amnọn+ nwa Devid hụkwara ya n’anya.+  Ọ nọkwa na-enye Amnọn nsogbu n’obi nke na ọ dara ọrịa+ n’ihi Tema nwanne ya nwaanyị, n’ihi na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ọ bụkwa ihe siri ike n’anya+ Amnọn ime ya ihe ọ bụla.+  Ma Amnọn nwere otu enyi aha ya bụ Jehọnadab,+ nwa Shimea,+ nwanne Devid; Jehọnadab bụkwa nwoke maara ihe nke ukwuu.  O wee jụọ ya, sị : “Gịnị mere ihu gị, bụ́ nwa eze, ji agbarụ agbarụ otú a, kwa ụtụtụ? Ị́ gaghị agwa m?”+ Amnọn wee sị ya: “Ahụrụ m Tema nwanne+ Absalọm bụ́ nwanne m nwoke n’anya.”+  Jehọnadab wee sị ya: “Dinara n’elu ihe ndina gị mee dị ka à ga-asị na ị na-arịa ọrịa.+ Nna gị ga-abịa ịhụ gị, ị ga-asịkwa ya, ‘Biko, ka Tema nwanne m nwaanyị bata nye m nri dị ka onye ọrịa, ọ ga-esikwa nri ngụgụ obi n’ihu m ka m wee hụ ya, ọ ga-enyekwa m ya n’ọnụ.’”+  Amnọn wee dinara ala mee dị ka à ga-asị na ọ na-arịa ọrịa,+ eze wee bata ịhụ ya. Amnọn wee sị eze: “Biko, ka Tema nwanne m nwaanyị bata mee achịcha abụọ n’ihu m, ka o wee nye m nri n’ọnụ dị ka onye ọrịa.”  Devid wee zigara Tema ozi n’ụlọ, sị: “Biko, gaa n’ụlọ Amnọn nwanne gị meere ya achịcha ngụgụ obi.”  Tema wee gaa n’ụlọ Amnọn+ nwanne ya nwoke mgbe o dina ala. O wee were ntụ ọka* a gwọrọ agwọ, kpụọ ya n’ihu ya wee mee achịcha.  N’ikpeazụ, o buuru ite o ji mee ya, wụpụ ya n’ihu ya, ma Amnọn jụrụ iri ya wee sị: “Meenụ ka mmadụ niile si n’ebe m nọ pụọ!”+ Mmadụ niile wee si n’ebe ọ nọ pụọ. 10  Amnọn wee sị Tema: “Weta achịcha ngụgụ obi ahụ n’ọnụ ụlọ dị n’ime, ka i wee nye m ya n’ọnụ dị ka onye ọrịa.” Tema wee were achịcha ahụ o mere wetara Amnọn nwanne ya nwoke n’ọnụ ụlọ dị n’ime. 11  Mgbe ọ bịarutere ya nso ka o nye ya nri ka o rie, ọ bagidere+ ya wee sị ya: “Bịa ka mụ na gị dinaa,+ nwanne m nwaanyị.”+ 12  Otú ọ dị, ọ sịrị ya: “Ee e, nwanne m! Ewedala m ala;+ n’ihi na a dịghị eme otú ahụ n’Izrel.+ Emela ihe nzuzu a na-eweta ihere.+ 13  Mụ onwe m—olee ebe m ga-eme ka nkọcha m gaa? Gị onwe gị ga-adịkwa ka otu n’ime ndị nzuzu n’Izrel. Ugbu a, biko, gwa eze okwu; n’ihi na ọ gaghị egbochi m ịbụ nke gị.” 14  Ma o kweghị ige ntị n’olu ya, kama o ji ike karịrị nke ya weda ya ala+ ma dinaa ya.+ 15  Amnọn wee malite ịkpọ ya asị nke ukwuu, n’ihi na asị ọ kpọrọ ya karịrị ịhụnanya o nweburu n’ebe ọ nọ, Amnọn wee sị ya: “Bilie, pụọ!” 16  O wee sị ya: “Ee e, nwanne m; n’ihi na omume ọjọọ a nke ịchụpụ m dị njọ karịa nke ọzọ i mere m!” Ma o kweghị ige ya ntị. 17  O wee kpọọ onye na-ejere ya ozi, sị: “Biko, chụpụrụ m onye a n’èzí, kpọchiekwa ụzọ ma ọ pụọ.” 18  (Ma o yi uwe mwụda nwere akara;+ n’ihi na ọ bụ uwe elu na-enweghị aka dị otú ahụ ka ndị ada eze, bụ́ ndị na-amaghị nwoke, na-eyi.) Onye na-ejere ya ozi wee dupụ ya n’èzí, ọ kpọchikwara ụzọ mgbe ọ pụsịrị. 19  Tema wee wụọ ntụ+ n’isi ya, dọwaakwa uwe mwụda nwere akara nke o yi; o wee buru aka n’isi+ pụwa, bere ákwá na-aga. 20  Absalọm+ nwanne ya nwoke wee sị ya: “Ọ̀ bụ Amnọn+ nwanne gị nwoke dinara gị? Ugbu a, nwanne m nwaanyị, gbachi nkịtị. Ọ bụ nwanne gị nwoke.+ Etinyela obi gị n’ihe a.” Tema wee biri n’ụlọ Absalọm nwanne ya nwoke, ya na ndị ọzọ adịghịkwa akpakọrịta. 21  Eze Devid wee nụ ihe a niile,+ iwe ya wee dị ọkụ nke ukwuu.+ 22  Absalọm agwaghịkwa Amnọn okwu ọ bụla, ma ọ bụ okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu ọma; n’ihi na Absalọm kpọrọ Amnọn asị+ maka na o wedara Tema nwanne ya ala. 23  O wee ruo mgbe afọ abụọ zuru ezu gasịrị na Absalọm nwere ndị na-akpacha ajị atụrụ+ na Bel-hezọ, nke dị nso n’Ifrem;+ Absalọm wee kpọọ ụmụ ndị ikom niile nke eze òkù.+ 24  Absalọm wee bịakwute eze wee sị: “Lee, ohu gị nwere ndị na-akpacha ajị atụrụ! Biko, ka eze na ndị na-ejere ya ozi soro ohu gị gaa.” 25  Ma eze sịrị Absalọm: “Ee e, nwa m! Biko, ka anyị niile ghara ịga ka anyị ghara ịbụrụ gị ibu arọ.” Ọ bụ ezie na ọ nọ na-arịọsi ya arịrịọ ike,+ o kweghị ịga, kama ọ gọziri+ ya. 26  N’ikpeazụ, Absalọm sịrị: “Ọ bụrụ na ị gaghị aga, biko, ka Amnọn nwanne m nwoke soro anyị gaa.”+ Eze wee jụọ ya, sị: “Gịnị mere ọ ga-eji soro gị gaa?” 27  Absalọm malitere ịrịọsi ya arịrịọ ike,+ o wee zie Amnọn na ụmụ ndị ikom niile nke eze ka ha soro ya. 28  Absalọm wee nye ndị na-ejere ya ozi iwu, sị: “Biko, legidenụ Amnọn anya, ngwa ngwa obi dị ya ụtọ n’ihi mmanya ọ ṅụrụ,+ m wee sị unu, ‘Gbuonụ Amnọn!’ gbuonụ ya. Unu atụla egwu.+ Ọ́ bụghị mụ onwe m nyere unu iwu? Dịnụ ike, meenụ ka ndị dike.” 29  Ndị na-ejere Absalọm ozi wee mee Amnọn dị nnọọ ka Absalọm nyere ha n’iwu;+ ndị ikom niile ọzọ bụ́ ụmụ eze wee malite ibili rịgoro, onye nke ọ bụla n’ịnyịnya ibu ya, wee gbalaga. 30  O wee ruo ka ha nọ n’ụzọ, na akụkọ ruru Devid ntị, sị: “Absalọm egbuwo ụmụ ndị ikom niile nke eze, ọ dịghịkwa otu onye n’ime ha fọdụrụnụ.” 31  Eze wee bilie dọwaa uwe ya,+ dinara n’ala,+ ndị niile na-ejere ya ozi guzokwa n’akụkụ ya, ha dọwakwara+ uwe ha. 32  Otú ọ dị, Jehọnadab+ nwa Shimea,+ nwanne Devid, zara, sị: “Ka onyenwe m ghara iche na ọ bụ ụmụ okorobịa niile, bụ́ ụmụ ndị ikom eze, ka ha gburu, n’ihi na ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ,+ n’ihi na ọ bụ Absalọm nyere iwu, e wee mee ihe a dị ka ihe a kara aka+ malite n’ụbọchị o wedara+ Tema nwanne ya nwaanyị ala.+ 33  Ugbu a, ka onyenwe m eze ghara iji okwu a bụ́ na ‘Ụmụ ndị ikom niile nke eze anwụọla’ kpọrọ ihe; kama ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.” 34  Ka ọ dị ugbu a, Absalọm gbara ọsọ.+ E mesịa, otu nwa okorobịa, bụ́ onye nche,+ lepụrụ anya wee hụ, ma, lee! ọtụtụ mmadụ nọ na-abịa n’azụ ya n’ụzọ dị n’akụkụ ugwu. 35  Jehọnadab+ wee sị eze: “Lee! Ụmụ ndị ikom eze abatawo. Dị ka ohu gị kwuru, otú ahụ ka o mere.”+ 36  O wee ruo na ngwa ngwa o kwusịrị okwu, lee, ụmụ eze batara, ha wee malite ịkwa ákwá n’olu dara ụda; ọbụna eze na ndị niile na-ejere ya ozi kwara ákwá nke ukwuu. 37  Ma Absalọm gbapụrụ ka ọ gakwuru Talmaị+ nwa Amaịhọd eze Geshọ.+ Devid nọ na-eruru nwa ya uju+ ụbọchị niile. 38  Ma Absalọm gbapụrụ wee gbaga Geshọ;+ o wee nọọ n’ebe ahụ afọ atọ. 39  N’ikpeazụ, ọ gụsiri mkpụrụ obi Devid bụ́ eze agụụ ike ịhụ Absalọm; n’ihi na ọ kasiwo onwe ya obi banyere Amnọn, n’ihi na ọ nwụwo.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

2Sa 13:8*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.