Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 11:1-27

11  O wee ruo ná mmalite afọ,+ n’oge ndị eze na-eji aga agha,+ na Devid zipụrụ Joab na ndị na-ejere ya ozi na Izrel dum ka ha gaa bibie ụmụ Amọn,+ nọchibidokwa Raba,+ ma Devid nọ na Jeruselem.  O wee ruo n’oge mgbede na Devid biliri n’ihe ndina ya, na-ejegharị n’elu ụlọ+ eze; ọ nọkwa n’elu ụlọ ahụ hụ+ otu nwaanyị na-asa ahụ́, nwaanyị ahụ makwara mma nke ukwuu.+  Devid wee zie ozi jụta banyere nwaanyị ahụ,+ otu onye wee sị: “Onye a ọ́ bụghị Bat-shiba+ nwa Elayam,+ nwunye Yuraya+ onye Het?”+  E mesịa, Devid zigara ndị ozi ka o wee kpọrọ ya.+ Nwaanyị ahụ wee bịakwute ya,+ o wee dinaa ya.+ N’oge ahụ, nwaanyị ahụ nọ na-edo onwe ya nsọ n’ihi adịghị ọcha ya.+ E mesịa, ọ laghachiri n’ụlọ ya.  Nwaanyị ahụ wee tụrụ ime. O wee zie ozi gwa Devid, sị: “Adị m ime.”  Devid wee zie Joab ozi, sị: “Zitere m Yuraya onye Het.” Joab wee zigara Devid Yuraya.  Mgbe Yuraya bịakwutere Devid, Devid malitere ịjụ ya otú Joab mere na otú ndị Izrel mere nakwa otú agha si aga.  N’ikpeazụ, Devid sịrị Yuraya: “Laa n’ụlọ gị saa ụkwụ gị.”+ Yuraya wee si n’ụlọ eze pụọ, e wee jiri onyinye obiọma eze sochie ya azụ.  Otú ọ dị, Yuraya dinara n’ebe e si abanye n’ụlọ eze, ya na ndị ọzọ niile na-ejere onyenwe ya ozi, ọ laghịkwa n’ụlọ ya. 10  Ha wee gwa Devid, sị: “Yuraya alaghị n’ụlọ ya.” Devid wee sị Yuraya: “Ọ́ bụghị njem ka i si bata? Gịnị mere na ị laghị n’ụlọ gị?” 11  Yuraya wee sị Devid: “Igbe+ ahụ na Izrel na Juda nọ n’ụlọ ndò, onyenwe m Joab na ndị na-ejere onyenwe m ozi+ mara ụlọikwuu ha n’ọhịa, mụ onwe m kwa—m̀ ga-abanye n’ụlọ m iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ nakwa ka mụ na nwunye m dinaa?+ Dị nnọọ ka ị dị ndụ, dịkwa nnọọ ka mkpụrụ obi gị dị ndụ,+ m gaghị eme ya!” 12  Devid wee sị Yuraya: “Nọkwuo ebe a taa, echi m ga-ahapụ gị ka ị gawa.” Yuraya wee nọrọ na Jeruselem n’ụbọchị ahụ nakwa n’echi ya. 13  Devid kpọkwara ya ka o rie ihe ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ n’ihu ya. O wee mee ka ọ ṅụbiga mmanya ókè.+ Otú o sina dị, ọ pụrụ n’anyasị gaa dinara n’ihe ndina ya, ya na ndị na-ejere onyenwe ya ozi, ọ laghịkwa n’ụlọ ya. 14  O wee ruo n’ụtụtụ na Devid deere Joab akwụkwọ ozi+ wee nye ya Yuraya ka o nye ya. 15  O dere n’akwụkwọ ozi ahụ, sị:+ “Tinyenụ Yuraya n’ihu ihu ebe agha kpụ ọkụ n’ọnụ karịsịa,+ unu ga-esikwa n’ebe ọ nọ laa azụ, a ga-egbukwa ya.”+ 16  O wee ruo ka Joab na-eche obodo ahụ nche, na o tinyere Yuraya ebe ọ maara na e nwere ndị dike.+ 17  Mgbe ndị ikom obodo ahụ pụtara na-ebuso Joab agha, e gburu ụfọdụ n’ime ndị agha ahụ, bụ́ ndị na-ejere Devid ozi, Yuraya onye Het nwụkwara.+ 18  Joab wee zie ozi iji kọọrọ Devid ihe niile banyere agha ahụ. 19  O wee nye onye ozi ahụ iwu, sị: “Ngwa ngwa ị gwasịrị eze ihe niile banyere agha a, 20  ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na eze ewee oké iwe wee sị gị, ‘Gịnị mere unu ji jeruo obodo ahụ oké nso ibu agha? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ha ga-anọ n’elu mgbidi na-agba unu ụta? 21  Ònye gburu Abimelek+ nwa Jerọbeshet?+ Ọ́ bụghị nwaanyị nọ n’elu mgbidi tụọ ya aka nkume igwe nri,+ o wee nwụọ na Tibez?+ Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ oké nso?’ sị ya, ‘Onye na-ejere gị ozi bụ́ Yuraya onye Het nwụkwara.’”+ 22  Onye ozi ahụ gara, mgbe o ruru, ọ kọọrọ Devid ihe niile Joab ziri ya. 23  Onye ozi ahụ wee sị Devid: “Ndị ahụ ka anyị ike, ha wee pụta buso anyị agha n’ọhịa; ma anyị chụgidere ha ruo n’ọnụ ụzọ ámá. 24  Ndị na-agba ụta wee nọrọ n’elu mgbidi+ na-agba ndị na-ejere gị ozi ụta, ụfọdụ n’ime ndị na-ejere eze ozi wee nwụọ; onye na-ejere gị ozi bụ́ Yuraya onye Het nwụkwara.”+ 25  Devid wee sị onye ozi ahụ: “Nke a bụ ihe ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara ịdị njọ n’anya gị, n’ihi na mma agha na-eri+ otu onye dị ka ọ na-eri onye ọzọ. Lụsosie obodo ahụ agha ike, kwatuokwa ya.’+ Gbaakwa ya ume.” 26  Nwunye Yuraya wee nụ na Yuraya di ya anwụọla, o wee malite ịkwara onyenwe ya+ ákwá arịrị.+ 27  Mgbe oge iru uju+ gasịrị, Devid ziri ozi ozugbo wee kpọrọ ya laa n’ụlọ ya, o wee ghọọ nwunye ya.+ Ka oge na-aga, ọ mụụrụ ya nwa nwoke, ma ihe Devid mere dị njọ+ n’anya+ Jehova.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji