Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Samuel 1:1-27

1  O wee ruo mgbe Sọl nwụsịrị, mgbe Devid si n’igbu ndị Amalek lọta,+ na Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag.+  O wee ruo na n’ụbọchị nke atọ, lee! otu nwoke+ si n’ebe ndị agha Sọl mara ụlọikwuu na-abịa, o yi uwe dọwara adọwa,+ o kpokwasịkwara onwe ya ájá n’isi;+ o wee ruo na mgbe ọ bịakwutere Devid, ọ dara n’ala+ ozugbo wee kpọọ isiala.  Devid wee sị ya: “Olee ebe i si?” o wee sị ya: “Ọ bụ n’ebe ndị agha Izrel mara ụlọikwuu ka m si gbapụta.”  Devid wee sị ya: “Olee otú ihe si gaa? Biko, kọọrọ m.” O wee sị: “Ndị Izrel esiwo n’ọgbọ agha gbaa ọsọ, ọtụtụ n’ime ha adawokwa nwụọ,+ ọbụna Sọl+ na Jọnatan+ nwa ya anwụwo.”  Devid wee sị nwa okorobịa ahụ na-akọrọ ya ihe ahụ: “Olee otú i si mara n’ezie na Sọl na Jọnatan nwa ya anwụwo?”+  Nwa okorobịa ahụ na-akọrọ ya ihe ahụ wee sị: “Ọ dabara na m nọ n’Ugwu Gilboa,+ lee, Sọl dabeere n’ube ya;+ ma, lee! ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya na ndị nọ n’elu ịnyịnya chụkwutere ya.+  Mgbe ọ tụgharịrị hụ m, ọ kpọrọ m, m wee sị, ‘Lee m!’  O wee sị m, ‘Ị̀ bụ onye?’ m wee sị ya, ‘Abụ m onye Amalek.’+  O wee sị, ‘Biko, guzo n’akụkụ m gbuo m, n’ihi na anọ m n’oké ihe mgbu, n’ihi na mkpụrụ obi m dum+ ka dị n’ime m.’ 10  M wee guzo n’akụkụ ya gbuo ya,+ n’ihi na m maara na ọ gaghị adị ndụ mgbe ọ dasịrị. M wee were okpueze+ o kpu n’isi na ọla aka ọ gba n’aka, ka m wee chịtara ha onyenwe m n’ebe a.” 11  Devid wee jide uwe ya dọwaa,+ otú ahụkwa ka ndị ikom niile ya na ha nọ mere. 12  Ha wee malite iti mkpu arịrị na ịkwa ákwá+ na ibu ọnụ+ ruo anyasị n’ihi Sọl nakwa n’ihi Jọnatan nwa ya nakwa n’ihi ndị Jehova nakwa n’ihi ụlọ Izrel,+ n’ihi na e jiriwo mma agha gbuo ha. 13  Devid wee sị nwa okorobịa ahụ kọọrọ ya ihe ahụ: “Olee ebe i si?” o wee zaa, sị: “Abụ m nwa onye mbịarambịa, onye Amalek.”+ 14  Devid wee sị ya: “Gịnị mere na ị tụghị egwu+ isetị aka gị laa onye Jehova tere mmanụ+ n’iyi?” 15  Devid wee kpọọ otu n’ime ụmụ okorobịa ya wee sị: “Gakwuru ya. Gbuo ya.” O wee gbuo ya.+ 16  Devid wee sị ya: “Ka ọbara gị dị gị n’isi,+ n’ihi na ọnụ gị agbagidewo gị akaebe,+ sị, ‘Ọ bụ m gburu onye Jehova tere mmanụ.’”+ 17  Devid wee bụọ abụ iru uju+ a n’ihi Sọl na Jọnatan nwa ya+ 18  wee sị ka a kụziere ndị Juda+ abụ iru uju a nke a na-akpọ “Ụta.”+ Lee! E dere ya n’akwụkwọ Jesha,+ sị: 19  “E gbuwo ịma mma gị, Izrel, n’ebe gị ndị dị elu.+ Lee ka ndị dike si daa! 20  Unu akọla akụkọ ya n’ime Gat;+ Unu akọsala ya n’okporo ámá Ashkelọn,+ Ka ụmụ nwaanyị ndị Filistia ghara ịṅụrị ọṅụ, Ka ụmụ nwaanyị nke ndị a na-ebighị úgwù ghara inwe obi ụtọ.+ 21  Unu ugwu ndị dị na Gilboa,+ ka igirigi ghara ịdakwasị unu, ka mmiri ozuzo ghara izokwasị unu, ka ubi unu gharakwa imepụta onyinye dị nsọ;+ N’ihi na n’ebe ahụ ka e merụrụ ọta ndị dike, Ọta Sọl, nke mere na e nwekwaghị onye e tere mmanụ.+ 22  Ụta Jọnatan esighị n’ọbara ndị e gburu egbu, Nakwa n’abụba ndị dike laghachi azụ,+ Mma agha Sọl adịghịkwa alaghachi n’efu.+ 23  Sọl na Jọnatan,+ ndị a hụrụ n’anya, ndị bụkwa ndị ọma n’oge ha dị ndụ, E kewaghịkwa ha n’ọnwụ.+ Ha na-efe ọsọ karịa ugo,+ Ha dị ike karịa ọdụm.+ 24  Unu ụmụ nwaanyị Izrel, kwaaranụ Sọl ákwá, Onye yiwere unu uwe uhie a chọrọ mma, Onye tinyere ihe ịchọ mma ọlaedo n’uwe unu.+ 25  Lee ka ndị dike si daa n’ọgbọ agha!+ Lee ka e si gbuo Jọnatan n’ebe ndị dị elu unu!+ 26  M na-enwe mwute n’ihi gị, nwanne m Jọnatan, Ị dị m mma nke ukwuu.+ Ịhụnanya i nwere n’ebe m nọ dị ukwuu karịa ịhụnanya ndị inyom.+ 27  Lee ka ndị dike si daa,+ Ngwá agha alaakwa n’iyi!”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji