Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 NdịTesalonaịka 1:1-12

1  Pọl na Silvenọs na Timoti+ na-edetara ọgbakọ ndị Tesalonaịka, nke ya na Chineke bụ́ Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị n’otu, akwụkwọ:  Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo nke si n’aka Chineke bụ́ Nna na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dịrị unu.+  Anyị aghaghị ịdị na-enye Chineke ekele mgbe niile n’ihi unu,+ ụmụnna anyị, dị ka o kwesịrị, n’ihi na okwukwe unu na-eto eto+ nke ukwuu, ịhụnanya unu niile nwere n’otu n’otu na-amụbakwa n’ebe ibe unu nọ.+  N’ihi ya, anyị onwe anyị ji unu akpa nganga+ n’ọgbakọ dị iche iche nke Chineke n’ihi ntachi obi unu na okwukwe unu n’ime mkpagbu na ahụhụ niile unu na-edi.+  Nke a bụ ihe àmà nke ikpe ezi omume Chineke,+ nke na-eme ka a gụọ unu ná ndị ruru eru inweta alaeze Chineke,+ bụ́ nke unu na-atara ahụhụ.+  Nke a na-egosi na ọ bụ ezi omume n’ebe Chineke nọ iji mkpagbu kwụọ ndị na-akpagbu unu ụgwọ.+  Ma ọ ga-eme ka unu onwe unu bụ́ ndị a na-akpagbu nwere onwe unu, tinyere anyị onwe anyị, mgbe a ga-ekpughe+ Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike,+  n’ọkụ na-enwu enwu, mgbe ọ na-abọ ọbọ+ n’ahụ́ ndị na-amaghị Chineke,+ na ndị na-adịghị erube isi+ n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.+  Ndị a ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma+ nke bụ́ mbibi ebighị ebi+ wee pụọ n’ihu Onyenwe anyị, pụọkwa n’ebube nke ike ya,+ 10  mgbe ọ ga-abịa ka e nye ya na ndị nsọ+ ya otuto, ka ndị niile nwere okwukwe wee lee ya anya dị ka onye dị ebube n’ụbọchị ahụ, n’ihi na unu nwere okwukwe n’àmà anyị gbara. 11  N’ezie, ọ bụ ya mere anyị ji na-ekpe ekpere n’ihi unu mgbe niile, ka Chineke anyị wee gụọ unu ná ndị ruru eru maka òkù ọ kpọrọ unu,+ jirikwa ike ya mezuo ihe niile dị ya mma n’ihe banyere ịdị mma na ọrụ okwukwe; 12  ka e wee nye aha Onyenwe anyị Jizọs otuto n’ime unu,+ unu na ya ewee dị n’otu,+ dị ka obiọma Chineke anyị na nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ si dị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji