Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Kọrịnt 6:1-18

6  Ebe anyị na ya na-arụkọ ọrụ,+ anyị na-arịọsikwa unu ike ka unu ghara ịnara obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ ma nzube ya efunahụ unu.+  N’ihi na ọ na-asị: “Ọ bụ n’oge a na-anabata ndị mmadụ ka m nụrụ olu gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọpụta ka m nyeere gị aka.”+ Lee! Ugbu a bụ oge a na-anabata ndị mmadụ karịsịa.+ Lee! Ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.+  Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ n’ụzọ ọ bụla,+ ka e wee ghara ịhụta mmejọ n’ozi anyị;+  kama, n’ụzọ niile, anyị na-eme ka a mata anyị+ dị ka ndị ozi Chineke, site n’ịtachi obi n’ọtụtụ ihe, ya bụ, site n’ịtachi obi ná mkpagbu, ịtachi obi ná mkpa, ịtachi obi n’ihe isi ike,+  ịtachi obi n’iti ihe, ịtachi obi n’ụlọ mkpọrọ,+ ịtachi obi n’ọgba aghara, site n’ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ, site n’ịmụ anya abalị, site n’ịnọ ọtụtụ ugboro n’erighị nri,+  site n’ịdị ọcha, site n’ihe ọmụma, site n’ogologo ntachi obi,+ site n’obiọma,+ site na mmụọ nsọ, site n’ịhụnanya nke na-abụghị nke ihu abụọ,+  site n’okwu bụ́ eziokwu, site n’ike Chineke;+ site n’iji ngwá ọgụ+ nke ezi omume n’aka nri nakwa n’aka ekpe,  site n’otuto na ihe ihere, site n’akụkọ ọjọọ na akụkọ ọma; dị ka ndị nduhie,+ ọ bụ ezie na anyị na-ekwu eziokwu,  dị ka ndị a na-amaghị ma anyị bụ ndị a maara,+ dị ka ndị na-anwụ anwụ, ma, lee! anyị dị ndụ,+ dị ka ndị a dọrọ aka ná ntị+ ma e nyefeghị anyị n’aka ọnwụ,+ 10  dị ka ndị na-eru uju ma bụrụ ndị na-aṅụrị ọṅụ mgbe niile, dị ka ndị dara ogbenye ma bụrụ ndị na-eme ka ọtụtụ ndị baa ọgaranya, dị ka ndị na-enweghị ihe ọ bụla ma anyị nwere ihe niile.+ 11  Ndị Kọrịnt, anyị ezoroghị unu ọnụ, obi anyị emeghewo.+ 12  Ohere dịịrị unu n’ime obi anyị,+ ma unu enweghị ohere maka igosi obi ọmịiko.+ 13  Ya mere, iji kwụọ anyị ụgwọ—m na-ekwu dị ka m̀ na-agwa ụmụntakịrị+—unu onwe unu, megheenụ obi unu. 14  Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu,+ nke bụ́ nkekọ na-ekwekọghị ekwekọ. N’ihi na olee ihe jikọrọ ezi omume na mmebi iwu?+ Ma ọ bụ, olee òkè ìhè na ọchịchịrị nwere?+ 15  Oleekwa nkwekọ dị n’etiti Kraịst na Bilial?+ Ma ọ bụ, olee òkè+ onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwere? 16  Oleekwa nkwekọrịta ụlọ nsọ Chineke na arụsị nwere?+ N’ihi na anyị bụ ụlọ nsọ+ nke Chineke dị ndụ; dị nnọọ ka Chineke kwuru, sị: “M ga-ebi n’etiti ha,+ na-ejegharịkwa n’etiti ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.”+ 17  “‘Ya mere, sinụ n’etiti ha pụọ, kewapụnụ onwe unu,’ ka Jehova sịrị, ‘kwụsịkwanụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka’”;+ “‘m ga-akpọbatakwa unu.’”+ 18  “‘M ga-abụkwara unu nna,+ unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom,’+ ka Jehova Onye Pụrụ Ime Ihe Niile+ kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji