Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Kọrịnt 5:1-21

5  N’ihi na anyị maara na ọ bụrụ na a kwatuo+ ụlọ anyị nke ụwa,+ bụ́ ụlọikwuu a,+ anyị ga-enwe ụlọ nke si n’aka Chineke, bụ́ ụlọ nke a na-ejighị aka wuo,+ nke na-adịru mgbe ebighị ebi+ n’eluigwe.  N’ihi na anyị na-asụ ude+ n’ezie n’ime ụlọ obibi a, na-achọsi ike iyiri nke anyị ga-esi n’eluigwe+ nweta,  ka o wee bụrụ na, mgbe anyị yirisịịrị ya n’ezie, anyị agaghị abụ ndị gba ọtọ.+  N’eziokwu, anyị ndị nọ n’ụlọikwuu a na-asụ ude, ebe ọ na-anyịgbu anyị; n’ihi na anyị chọrọ, ọ bụghị iyipụ ya, kama iyiri nke ọzọ,+ ka ndụ+ wee loda ihe ahụ nke pụrụ ịnwụ anwụ.  Ma onye mere anyị maka ihe a bụ Chineke,+ bụ́ onye nyere anyị ihe àmà+ nke ihe gaje ịbịa, ya bụ, mmụọ nsọ.+  Ya mere, anyị na-enwe obi ike mgbe niile, marakwa na, ka anyị nọ n’ebe obibi anyị n’anụ ahụ́, anyị anọghị n’ebe Onyenwe anyị nọ,+  n’ihi na anyị na-eje ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ.+  Ma anyị nwere obi ike, ọ dịkwa anyị ezi mma ka anyị ghara ịnọ n’ahụ́ a, ka anyị gaakwa binyere Onyenwe anyị.+  Ya mere, anyị na-emekwa ka ọ bụrụ nzube anyị, ma ànyị binyeere ya ma ọ bụ na anyị anọghị n’ebe ọ nọ,+ ka anyị bụrụ ndị ọ nabatara.+ 10  N’ihi na a ghaghị ime ka anyị niile pụta ìhè n’ihu oche ikpe Kraịst,+ ka onye ọ bụla wee nweta ụgwọ ọrụ ya maka ihe ndị o ji ahụ́ ya mee, dị ka ihe ndị o mere si dị, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ.+ 11  Ya mere, ebe anyị maara na anyị kwesịrị ịtụ egwu+ Onyenwe anyị, anyị na-eme ka ụmụ mmadụ kwere,+ ma e mewo ka anyị pụta ìhè n’anya Chineke. Otú ọ dị, enwere m olileanya na e mewokwa ka anyị pụtara akọ na uche unu+ ìhè. 12  Anyị adịkwaghị agwa unu okwu ọma+ banyere onwe anyị, kama anyị na-enye unu ihe ga-akpali unu iji anyị na-anya isi,+ ka unu wee nwee ihe unu ga-aza ndị na-anya isi n’ihi otú mmadụ dị n’elu ahụ́+ kama ịnya isi n’ihi otú obi mmadụ dị.+ 13  N’ihi na ọ bụrụ na uche ezughị anyị okè,+ ọ bụ maka Chineke; ọ bụrụ na uche zuru anyị okè,+ ọ bụ maka unu. 14  N’ihi na ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị, n’ihi na ihe anyị kwubiri bụ na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile;+ n’ihi ya, mmadụ niile nwụrụ; 15  ọ nwụkwara maka mmadụ niile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ,+ kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ,+ bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.+ 16  Ya mere, malite ugbu a gaa n’ihu, anyị amaghị onye ọ bụla dị ka anụ ahụ́ si dị.+ Ọ bụrụgodị na anyị amarawo Kraịst dị ka anụ ahụ́ si dị,+ n’ezie, anyị amakwaghị ya otú ahụ ugbu a.+ 17  Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla na Kraịst dị n’otu, ọ bụ ihe e kere ọhụrụ;+ ihe ochie agafewo,+ lee! ọ bụ ihe ọhụrụ dị ugbu a.+ 18  Ma ihe niile si n’aka Chineke, bụ́ onye mere ka anyị na ya dị ná mma+ site n’aka Kraịst, nyekwa anyị ozi+ nke ime ka a dị ná mma, 19  ya bụ, na Chineke si n’aka Kraịst+ na-eme ka ya+ na ụwa+ dị ná mma, n’agụrụghị ha njehie ha,+ o nyefekwara n’aka anyị okwu+ nke ime ka a dị ná mma.+ 20  Ya mere, anyị+ bụ ndị nnọchiteanya+ nọ n’ọnọdụ Kraịst,+ dị ka à ga-asị na Chineke na-arịọsi arịrịọ ike site n’ọnụ anyị.+ Dị ka ndị nọ n’ọnọdụ Kraịst, anyị na-arịọ,+ sị: “Meenụ ka unu na Chineke dị ná mma.” 21  Onye ahụ nke na-enweghị mmehie+ ka o mere ka ọ bụrụ mmehie+ n’ihi anyị, ka anyị wee si n’aka ya bụrụ ndị ezi omume+ n’anya Chineke.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji