Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Kọrịnt 4:1-18

4  Ọ bụ ya mere na, ebe anyị nwere ozi a+ dị ka ebere e meere anyị si dị,+ anyị adịghị ada mbà;  ma anyị ajụwo omume nzuzo ndị na-eme ihere,+ anyị adịghị eje ije n’aghụghọ, anyị adịghịkwa agwagbu okwu Chineke,+ kama site n’ime ka eziokwu ahụ pụta ìhè, n’ihu Chineke, anyị na-eme ihe n’ụzọ ga-adị akọ na uche mmadụ niile mma.+  Ma, ọ bụrụ na e kpuchiri ozi ọma anyị na-ezisa ihe, ọ bụ n’etiti ndị na-ala n’iyi+ ka e kpuchiri ya ihe,  ndị ọ bụ n’etiti ha ka chi nke usoro ihe a+ meworo ka uche ndị na-ekweghị ekwe+ kpuo ìsì, ka ìhè+ nke ozi ọma ahụ dị ebube+ banyere Kraịst, onye bụ́ onyinyo+ Chineke, wee ghara inwukwasị ha.+  N’ihi na ọ bụghị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama ọ bụ Kraịst Jizọs, na ọ bụ Onyenwe anyị,+ nakwa na anyị onwe anyị bụ ndị ohu+ unu n’ihi Jizọs.  N’ihi na ọ bụ Chineke sịrị: “Ka ìhè nwupụta n’ọchịchịrị,”+ ya onwe ya enwuwokwa n’obi anyị iji were ihe ọmụma ahụ dị ebube+ banyere Chineke mee ka ìhè dịrị+ na ha site n’ihu Kraịst.+  Otú ọ dị, anyị nwere akụ̀ a+ n’arịa+ e ji ụrọ kpụọ,+ ka ike+ karịrị ike nkịtị wee bụrụ nke Chineke,+ n’abụghịkwa nke si n’aka anyị onwe anyị.+  A na-akpagide anyị n’ụzọ niile,+ ma a kpagideghị anyị nke na anyị enweghị ike imegharị ahụ́; anyị na-enwe mgbagwoju anya, ma ọ bụghị n’enwetụghị ụzọ mgbapụ;+  a na-akpagbu anyị, ma a dịghị ahapụ anyị;+ a na-akwada anyị,+ ma a dịghị ebibi anyị.+ 10  N’ebe niile, anyị na-edi mgbe niile n’ahụ́ anyị mmeso na-eweta ọnwụ nke e mesoro Jizọs,+ ka e wee mee ka ndụ Jizọs pụtakwa ìhè n’ahụ́ anyị.+ 11  N’ihi na a na-eme ka anyị bụ́ ndị dị ndụ na-eche ọnwụ ihu+ mgbe niile n’ihi Jizọs, ka e wee mee ka ndụ Jizọs pụtakwa ìhè n’anụ ahụ́ anyị nke pụrụ ịnwụ anwụ.+ 12  Ya mere, ọnwụ nọ n’ọrụ n’ime anyị, ma ndụ nọ n’ọrụ n’ime unu.+ 13  Ma n’ihi na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ dị ka nke ahụ e dere banyere ya, sị: “Enwere m okwukwe, ya mere, ekwuru m okwu,”+ anyị onwe anyị nwekwara okwukwe, ya mere, anyị na-ekwu okwu, 14  ebe anyị maara na onye ahụ kpọlitere Jizọs ga-akpọlitekọkwa anyị na Jizọs, ọ ga-echekwa anyị na unu+ n’ihu ya onwe ya. 15  N’ihi na ihe niile bụ maka ọdịmma unu,+ ka obiọma na-erughịrị mmadụ nke e mere ka ọ mụbaa wee dị ukwuu n’ihi ekele nke ọtụtụ ndị ọzọ na-enye iji wetara Chineke otuto.+ 16  Ya mere, anyị adịghị ada mbà, kama ọ bụrụgodị na mmadụ anyị bụ n’elu ahụ́ na-ala n’iyi, n’ezie, a na-eme ka mmadụ anyị bụ n’ime dị ọhụrụ+ kwa ụbọchị. 17  N’ihi na ọ bụ ezie na mkpagbu ahụ na-adịru nwa oge,+ dịkwa mfe, ọ na-arụpụtara anyị ebube nke na-adịwanye ukwuu, nke na-adịrukwa mgbe ebighị ebi;+ 18  ebe anyị lekwasịrị anya, ọ bụghị n’ihe a na-ahụ anya, kama n’ihe a na-adịghị ahụ anya.+ N’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge,+ ma ihe a na-adịghị ahụ anya na-adịru mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji