Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Kọrịnt 3:1-18

3  Ànyị na-amaliteghachi ikwu okwu ọma banyere onwe anyị?+ Ka ọ̀ dị anyị mkpa, ma eleghị anya, dị ka ọ dị ndị ụfọdụ, idetara unu akwụkwọ ozi,+ ma ọ bụ ịnata akwụkwọ ozi nkọwa n’aka unu?  Ọ bụ unu bụ akwụkwọ ozi+ anyị, nke e dere n’obi anyị, nke mmadụ niile maara ma na-agụ.+  N’ihi na e gosiwo na unu bụ akwụkwọ ozi Kraịst nke anyị onwe anyị bụ́ ndị ozi dere,+ nke a na-ejighị ink dee, kama e ji mmụọ+ nke Chineke dị ndụ dee ya, ọ bụghị ná mbadamba nkume,+ kama ná mbadamba anụ ahụ́, ya bụ, n’obi.+  Site na Kraịst, anyị nwere ụdị obi ike a+ n’ebe Chineke nọ.  Ọ bụghị anyị mere onwe anyị ka anyị ruo eru nke ọma, o siteghịkwa n’ike aka anyị,+ kama ọ bụ Chineke na-eme ka anyị ruo eru nke ọma,+  bụ́ onye meworo n’ezie ka anyị ruo eru nke ọma ịbụ ndị ozi nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ,+ ọ bụghị nke iwu e dere ede,+ kama nke mmụọ nsọ;+ n’ihi na iwu e dere ede na-ama ikpe ọnwụ,+ ma mmụọ nsọ na-eme ka a dị ndụ.+  Ọ bụrụkwa na Iwu ahụ nke na-eweta amamikpe ọnwụ+ na nke a kanyere mkpụrụ akwụkwọ ya na nkume+ bịara n’ebube,+ nke mere na ụmụ Izrel enweghị ike ilegide anya n’ihu Mozis n’ihi ebube nke si n’ihu ya na-egbukepụ,+ bụ́ ebube nke a ga-ewepụ ewepụ,  gịnị mere nkesa nke mmụọ nsọ+ na-agaghị eji nwee ebube ka ukwuu?+  N’ihi na ọ bụrụ na Iwu ahụ nke na-ekesa amamikpe+ dị ebube,+ nkesa ezi omume+ nwere ebube ka ukwuu.+ 10  N’eziokwu, ọbụna ihe ahụ e mere ka ọ dị ebube mgbe mbụ abụrụwo ihe e wepụrụ ebube+ ya n’ihi ebube nke karịrị ya.+ 11  N’ihi na ọ bụrụ na e ji ụzọ dị ebube webata ihe ahụ a ga-ewepụ ewepụ,+ ihe ahụ nke na-adịgide adịgide ga-enwe ebube ka ukwuu.+ 12  Ya mere, ebe anyị nwere olileanya dị otú ahụ,+ anyị nwere nkwuwa okwu dị ukwuu, 13  ọ bụghịkwa ime dị ka mgbe Mozis na-ekpukwasị ákwà mkpuchi+ n’ihu ya ka ụmụ Izrel wee ghara ilegide anya n’ọgwụgwụ+ nke ihe ahụ a ga-ewepụ ewepụ. 14  Ma e mere ka ike iche echiche ha ghara ịdịkwa nkọ.+ N’ihi na ruo taa, a dịghị ekpupụ otu ákwà mkpuchi ahụ mgbe a na-agụ ọgbụgba ndụ+ ochie ahụ, n’ihi na a na-ewepụ ya site n’aka Kraịst.+ 15  N’eziokwu, ruo taa, mgbe ọ bụla a na-agụ akwụkwọ Mozis,+ ákwà mkpuchi na-adị n’obi ha.+ 16  Ma mgbe a laghachiri n’ebe Jehova nọ, a na-ewepụ ákwà mkpuchi ahụ.+ 17  Jehova bụ Mmụọ ahụ;+ ebe ọ bụla mmụọ+ Jehova+ dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe+ dị. 18  Ọ bụ ezie na anyị na-egbukepụ ebube Jehova+ dị ka enyo n’ihu a na-ekpuchighị ákwà, a na-agbanwe+ anyị niile+ inwe otu onyinyo ahụ+ site n’ebube ruo n’ebube,+ kpọmkwem dị ka Jehova bụ́ Mmụọ ahụ na-eme.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji