Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Kọrịnt 1:1-24

1  Pọl, onyeozi+ nke Kraịst Jizọs site n’uche Chineke, na Timoti+ nwanna anyị, na-edetara ọgbakọ Chineke nke dị na Kọrịnt akwụkwọ, tinyere ndị nsọ+ niile nọ n’Akeya dum:+  Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo nke si n’aka Chineke bụ́ Nna anyị nakwa n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dịrị unu.+  Ka Chineke na Nna+ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, bụ́ Nna nke obi ebere+ na Chineke nke nkasi obi+ niile bụrụ onye a gọziri agọzi,  onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile,+ ka anyị wee nwee ike ịkasi ndị nọ n’ụdị mkpagbu ọ bụla obi+ site ná nkasi obi nke Chineke na-akasi anyị onwe anyị.+  N’ihi na dị nnọọ ka ahụhụ anyị na-ata n’ihi Kraịst dị ọtụtụ,+ otú ahụ ka nkasi obi anyị na-enweta site n’aka Kraịst dịkwa ukwuu.+  Ọ bụrụ na anyị nọ ná mkpagbu, ọ bụ maka nkasi obi na nzọpụta unu;+ ma ọ bụ, ọ bụrụ na a na-akasi anyị obi, ọ bụ maka nkasi obi unu nke na-eme ka unu nwee ike ịtachi obi n’otu ahụhụ ahụ anyị na-atakwa.+  N’ihi ya, olileanya anyị nwere n’ebe unu nọ siri ike, ebe anyị maara na, dị nnọọ ka unu so na-ata ahụhụ, otú ahụkwa ka unu ga-eso nweta nkasi obi.+  N’ihi na anyị achọghị ka unu ghara ịma, ụmụnna anyị, banyere mkpagbu nke dakwasịrị anyị n’ógbè Eshia,+ na anyị nọ n’oké nsogbu nke karịrị ike anyị, nke mere na anyị ejighị ọbụna ndụ anyị n’aka ma ọlị.+  N’eziokwu, anyị chere n’ime onwe anyị na a mawo anyị ikpe ọnwụ. Ihe mere anyị ji chee otú a bụ ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi,+ kama ka anyị tụkwasị Chineke obi, bụ́ onye na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ.+ 10  Ọ napụtara anyị n’oké ihe dị otú ahụ nke bụ́ ọnwụ, ọ ga-anapụtakwa anyị;+ olileanya anyị dịkwa n’ebe ọ nọ na ọ ga-anapụta anyị ọzọ.+ 11  Unu pụkwara inye aka site n’ịrịọsi arịrịọ ike n’ihi anyị,+ ka ọtụtụ ndị wee na-enye ekele+ n’ihi anyị maka ihe e ji obiọma nye anyị n’ihi ekpere nke ọtụtụ ndị.+ 12  N’ihi na ihe anyị ji na-anya isi, nke akọ na uche anyị na-agba àmà ya,+ bụ na anyị ji obi eziokwu nke si n’ebe Chineke nọ kpaa àgwà n’ụzọ dị nsọ n’ime ụwa, ma karịsịa n’ebe unu nọ, n’adabereghị n’amamihe sitere n’anụ ahụ́+ kama n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ. 13  N’ihi na, n’ezie, anyị adịghị edetara unu akwụkwọ ozi banyere ihe ọzọ ma e wezụga ihe unu maara nke ọma, ma ọ bụ, ihe unu ghọtakwara; ya bụ, ihe m nwere olileanya na unu ga na-amata ruo ọgwụgwụ,+ 14  dị nnọọ ka unu matawokwara, ruo n’ókè ụfọdụ, na anyị bụ ihe unu ga-eji na-anya isi,+ dị nnọọ ka unu ga-abụkwara anyị n’ụbọchị Onyenwe anyị Jizọs.+ 15  Ya mere, n’ihi obi ike a, ebu m n’uche ịbịakwute unu,+ ka unu wee nwee oge ịṅụrị ọṅụ nke ugboro abụọ,+ 16  mgbe m kwụsịtụchara na nke unu, m ga-aga Masedonia,+ sikwa na Masedonia lọghachikwute unu,+ unu ewee dupụtụ m+ ka m gaa Judia. 17  Mgbe m bu ihe dị otú ahụ n’uche, emeghị m omume ọ bụla na-egosi ejighị ihe kpọrọ ihe,+ ka m̀ mere? Ka ihe ndị m chọrọ ime, m̀ chọrọ ime ha dị ka anụ ahụ́ si dị,+ wee sị, “Ee, Ee,” sịkwa “Ee e, Ee e”?+ 18  Ma a pụrụ ịdabere n’ebe Chineke nọ na okwu anyị na-agwa unu abụghị Ee ma bụrụ Ee e. 19  N’ihi na Ọkpara Chineke,+ bụ́ Kraịst Jizọs, onye e kwusara n’etiti unu site n’ọnụ anyị, ya bụ, site n’ọnụ mụ na Silvenọs na Timoti,+ abụghị Ee ma bụrụkwa Ee e, kama Ee abụrụwo Ee n’ebe ọ nọ.+ 20  N’ihi na n’agbanyeghị ole nkwa+ Chineke dị, ha abụrụwo Ee site na ya.+ Ya mere, ọ bụkwa site na ya ka a na-asị Chineke “Amen”+ ka e wee site n’ọnụ anyị nye ya otuto. 21  Ma, ọ bụ Chineke nyere ihe na-emesi obi ike na anyị na unu bụ ndị nke Kraịst, ọ bụkwa ya tere anyị mmanụ.+ 22  Ọ kawokwa anyị akara+ ya, nyekwa anyị ihe àmà+ nke ihe gaje ịbịa, ya bụ, mmụọ nsọ,+ n’ime obi anyị. 23  Chineke bụ onye akaebe+ megide mkpụrụ obi m na ọ bụ iji zọọ unu+ mere na abịabeghị m Kọrịnt. 24  Ọ bụghị na anyị bụ ndị nwe+ okwukwe unu, kama anyị bụ ndị ọrụ ibe unu+ maka ọṅụ unu, n’ihi na ọ bụ okwukwe unu+ mere unu ji guzosie ike.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji