Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Eze 7:1-20

7  Ịlaịsha wee sị: “Geenụ ntị n’okwu Jehova.+ Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ụdị ugbu a echi, otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia ntụ ọka e gwere nke ọma ga-ada otu shekel, ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia abụọ nke ọka bali ga-adakwa otu shekel n’ọnụ ụzọ ámá Sameria.’”+  Osote onyeisi ndị agha, bụ́ onye eze dabeere+ n’aka ya, wee zaa onye nke ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụgodị na Jehova emeghee ọnụ ụzọ mmiri nke dị n’eluigwe,+ ihe a ọ̀ pụrụ ime eme?+ O wee sị ya: “Lee, i ji anya gị na-ahụ ya,+ ma ị gaghị eri ya.”+  E nwere ndị ikom anọ bụ́ ndị ekpenta nọ n’ọnụ ụzọ ámá;+ ha wee malite ịsị ibe ha: “Gịnị mere anyị ga-eji nọdụ n’ebe a ruo mgbe anyị nwụrụ?  Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Ka anyị banye n’ime obodo,’ ebe ọ bụ na ụnwụ dị n’ime obodo, anyị ga-anwụrịrị n’ebe ahụ.+ Ọ bụrụkwa na anyị anọdụ ebe a, anyị ga-anwụrịrị. Ya mere, bịanụ ka anyị waba n’ebe ndị Siria mara ụlọikwuu. Ọ bụrụ na ha ahapụ anyị ndụ, anyị adịrị ndụ; ma ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị anwụọnụ.”+  Ha wee bilie mgbe chi jiri ka ha banye n’ebe ndị Siria mara ụlọikwuu; ha wee bịa nso n’ebe ndị Siria mara ụlọikwuu, ma, lee! ọ dịghị onye nọ n’ebe ahụ.  Ọ bụ Jehova mere ka ndị agha Siria nụ+ ụda ụgbọ agha, ụda ịnyịnya, ụda ìgwè ndị agha,+ nke mere na ha sịrị ibe ha: “Lee! Eze Izrel egowo ndị eze ndị Het+ na ndị eze Ijipt+ ka ha bịa buso anyị agha!”  Ozugbo ahụ, ha biliri gbaa ọsọ mgbe chi jiri+ wee hapụ ụlọikwuu ha na ịnyịnya+ ha na ịnyịnya ibu ha—ebe ahụ ha mara ụlọikwuu dị nnọọ otú ahụ ọ dị—ha wee na-agba ọsọ maka mkpụrụ obi ha.+  Mgbe ndị ekpenta a rutere nso n’ebe ahụ ha mara ụlọikwuu, ha banyere n’otu ụlọikwuu wee na-eri, na-aṅụ, burukwa ọlaọcha na ọlaedo na uwe n’ebe ahụ gaa zoo ha. E mesịa, ha lọghachiri banye n’ụlọikwuu ọzọ buru ihe n’ebe ahụ gaa zoo ha.+  N’ikpeazụ, ha malitere ịsị ibe ha: “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị ozi ọma!+ Ọ bụrụ na anyị egbuo oge wee chere ruo mgbe chi bọrọ, ikpe ga-ama anyị.+ Ya mere, bịanụ ka anyị banye n’ụlọ eze kọọ ihe merenụ.” 10  Ha wee bịa kpọọ ndị nche ọnụ ụzọ ámá+ obodo òkù wee kọọrọ ha, sị: “Anyị banyere n’ebe ndị Siria mara ụlọikwuu, ma, lee! ọ dịghị onye nọ n’ebe ahụ, a nụghịkwa ụkpọrọ mmadụ, ma e wezụga ịnyịnya ndị e liwere eliwe na ịnyịnya ibu ndị e liwere eliwe na ụlọikwuu ndị dị nnọọ otú ha dị.”+ 11  Ndị nche ọnụ ụzọ ámá tiri mkpu ozugbo, ha wee zie ozi n’ụlọ eze nke dị n’ime. 12  Ozugbo ahụ, eze biliri n’abalị wee gwa ndị na-ejere ya ozi,+ sị: “Biko, ka m gwa unu ihe ndị Siria mere anyị.+ Ha maara nke ọma na agụụ na-agụ anyị;+ ọ bụ ya mere ha ji si n’ebe ha mara ụlọikwuu pụọ gaa zoo n’ọhịa,+ sị, ‘Ha ga-esi n’obodo ha pụta, anyị ga-ejide ha ná ndụ, anyị ga-abanyekwa n’obodo ha.’” 13  Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi wee zaa, sị: “Biko, ka ha jiri ịnyịnya ise n’ime ndị fọrọ afọ bụ́ ndị fọdụrụ n’obodo gaa.+ Lee! Ha na ndị Izrel niile bụ́ ndị fọdụrụ n’ime ya bụ otu ihe. Lee! Ha na ndị Izrel niile bụ́ ndị laworo n’iyi bụ otu ihe.+ Ka anyị zipụ ha wee hụ.” 14  Ha wee jiri ụgbọ ịnyịnya abụọ, eze wee zipụ ha ka ha chụwa ndị agha Siria, sị: “Gaanụ lee.” 15  Ha wee chụrụ ha ruo Jọdan; ma, lee! ụzọ dum jupụtara n’uwe na arịa+ ndị Siria tụhapụrụ ka ha ji ọsọ ọsọ na-apụ.+ Ndị ozi ahụ wee lọghachi kọọrọ eze. 16  Ndị Izrel wee pụọ ma bukọrọ ihe+ n’ebe ndị Siria mara ụlọikwuu; otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia ntụ ọka e gwere nke ọma wee daa otu shekel, ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia abụọ nke ọka bali adaakwa otu shekel, dị ka Jehova kwuru.+ 17  Eze họpụtara osote onyeisi ndị agha, bụ́ onye ọ dabeere+ n’aka ya, ka ọ na-elekọta ọnụ ụzọ ámá; ndị mmadụ wee na-azọ ya ụkwụ+ n’ọnụ ụzọ ámá ahụ, nke mere na ọ nwụrụ, dị nnọọ ka onye nke ezi Chineke kwuru,+ mgbe o kwuru okwu n’oge ahụ eze bịakwutere ya. 18  O wee si otú a mee dị nnọọ ka onye nke ezi Chineke gwara eze, sị: “Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia abụọ nke ọka bali ga-ada otu shekel, otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ sia ntụ ọka e gwere nke ọma ga-adakwa otu shekel, ọ ga-eme ụdị ugbu a echi n’ọnụ ụzọ ámá Sameria.”+ 19  Ma osote onyeisi ndị agha ahụ zara onye nke ezi Chineke, sị: “Ọ bụrụgodị na Jehova emeghee ọnụ ụzọ mmiri nke dị n’eluigwe, ihe a i kwuru ọ̀ pụrụ ime eme?”+ O wee sị: “Lee, i ji anya gị na-ahụ ya, ma ị gaghị eri ya.”+ 20  Ihe a wee si otú ahụ mee ya,+ mgbe ndị mmadụ na-azọ ya ụkwụ+ n’ọnụ ụzọ ámá, o wee nwụọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji