Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Eze 6:1-33

6  Ụmụ+ ndị amụma wee malite ịsị Ịlaịsha: “Leenụ! Ebe+ a anyị bi n’ihu gị abaghị+ anyị aba ma ọlị.  Biko, ka onye ọ bụla n’ime anyị gaa Jọdan gbute otu osisi n’ebe ahụ wee wuoro onwe anyị+ ebe anyị ga-ebi n’ebe ahụ.” O wee sị: “Gaanụ.”  Otu onye wee sị ya: “Biko, bịa soro ndị ohu gị gaa.” O wee sị: “Mụ onwe m ga-aga.”  O wee soro ha gaa, e mesịa, ha rutere Jọdan wee malite igbutusi osisi.+  O wee ruo na mgbe otu onye nọ na-egbutu osisi nke ya, isi anyụike+ ya dabara n’ime mmiri. O wee malite iti mkpu, sị: “Ewoo, nna m ukwu,+ a natara ya anata!”+  Onye nke ezi Chineke wee sị: “Olee ebe ọ danyere?” O wee gosi ya ebe ahụ. O gbutere osisi ozugbo wee tụnye ya n’ebe ahụ, mee ka isi anyụike ahụ see n’elu mmiri.+  O wee sị: “Were ya.” Ọ matịrị aka ozugbo were ya.  Ma Eze Siria+ malitere ibuso Izrel agha. Ya na ndị na-ejere ya ozi wee gbaa izu,+ sị: “Lekwa lekwa ebe mụ na unu ga-ama ụlọikwuu.”+  Onye nke ezi Chineke+ wee zigara eze Izrel ozi, sị: “Lezie anya ka ị ghara isi n’ebe a gafere,+ n’ihi na ọ bụ ebe ahụ ka ndị Siria na-agbadata.”+ 10  Eze Izrel wee ziga ozi n’ebe ahụ onye nke ezi Chineke gwara ya.+ O wee dọọ ya aka ná ntị,+ o wee ghara ịga n’ebe ahụ, ọ bụghị otu ugboro, ọ bụghịkwa ugboro abụọ. 11  Ihe a wee mee ka ọnụma ju eze Siria obi,+ nke mere na ọ kpọrọ ndị na-ejere ya ozi, sị ha: “Ọ̀ bụ na unu agaghị agwa m onye n’ime anyị bụ́ onye dịnyeere eze Izrel?”+ 12  Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi wee sị: “Onyenwe m eze, ọ dịghị onye ọ bụ n’ime anyị, kama ọ bụ Ịlaịsha+ onye amụma nke nọ n’Izrel na-akọrọ+ eze Izrel ihe niile ị na-ekwu n’ụlọ ndina gị nke dị n’ime.”+ 13  O wee sị: “Gaanụ chọpụta ebe ọ nọ, ka m wee ziga ndị mmadụ ka ha kpụta ya.”+ E mesịa, ha bịara kọọrọ ya, sị: “Ọ nọ na Dotan.”+ 14  Ozugbo ahụ, o zigara ịnyịnya na ụgbọ agha na ìgwè ndị agha+ dị ukwuu n’ebe ahụ; ha wee bịa n’abalị gbaa obodo ahụ gburugburu. 15  Mgbe onye na-ejere onye nke ezi Chineke ozi+ biliri n’isi ụtụtụ pụta n’èzí, lee, ìgwè ndị agha ejiriwo ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu. Onye na-ejere ya ozi sịrị ya ozugbo: “Ewoo, nna m ukwu!+ Gịnị ka anyị ga-eme?” 16  Ma ọ sịrị: “Atụla egwu,+ n’ihi na ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.”+ 17  Ịlaịsha wee malite ikpe ekpere,+ sị: “Jehova, biko, meghee anya+ ya ka ọ hụ ụzọ.” Ozugbo, Jehova meghere anya onye ahụ na-eje ozi, o wee hụ; ma, lee! ógbè ahụ bụ́ ugwu ugwu jupụtara n’ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya agha+ na-acha ọkụ ọkụ gburugburu Ịlaịsha.+ 18  Mgbe ha malitere ịgbadata gakwuru Ịlaịsha, o kpekuru Jehova ekpere, sị: “Biko, mee ka mba a kpuo ìsì.”+ O wee mee ka ha kpuo ìsì dị ka Ịlaịsha kwuru. 19  Ịlaịsha wee sị ha: “Ebe a abụghị ụzọ, nke a abụghịkwa obodo unu na-aga. Soronụ m, ka m duru unu gakwuru nwoke unu na-achọ.” Otú ọ dị, o duuru ha garuo Sameria.+ 20  O wee ruo na ozugbo ha bịarutere Sameria, Ịlaịsha sịrị: “Jehova, biko, meghee anya ndị a ka ha hụ ụzọ.”+ Jehova meghere anya ha ozugbo, ha wee hụ ụzọ; ma, lee, ha nọ n’etiti Sameria. 21  Ozugbo eze Izrel hụrụ ha, ọ gwara Ịlaịsha, sị: “Ọ̀ bụ m gbuo ha, ọ̀ bụ m gbuo ha,+ nna m?”+ 22  Ma ọ sịrị: “Egbula ha. Ọ̀ bụ ndị i ji mma agha gị na ụta gị dọrọ n’agha ka ị ga-egbu?+ Debe ihe oriri na mmiri n’ihu ha ka ha rie,+ ṅụọ ma lakwuru onyenwe ha.” 23  O wee meere ha oké oriri; ha wee malite iri na ịṅụ, o wee mesịa hapụ ha ka ha laa, ha wee lakwuru onyenwe ha. Ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga+ nke ndị Siria abataghị ọzọ ma ọlị n’ala Izrel. 24  O wee ruo mgbe nke ahụ gasịrị na Ben-hedad eze Siria kpọkọtara ndị agha ya niile wee gbagoo nọchibido+ Sameria. 25  Ka oge na-aga, oké ụnwụ dara na Sameria,+ ma, lee! ha nọchibidoro ya ruo mgbe otu isi ịnyịnya ibu+ dara mkpụrụ ego ọlaọcha iri asatọ, otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kab nsị nduru+ adaakwa mkpụrụ ego ọlaọcha ise. 26  O wee ruo mgbe eze Izrel na-agafe n’elu mgbidi na otu nwaanyị tikuru ya, sị: “Biko, zọpụta m, onyenwe m eze!”+ 27  O wee sị: “Ọ bụrụ na Jehova azọpụtaghị gị, olee ebe m ga-esi zọpụta gị?+ ọ̀ bụ n’ebe nzọcha mkpụrụ ka ọ̀ bụ n’ebe nzọchapụta mmanya ka ọ̀ bụ n’ebe nzọchapụta mmanụ?” 28  Eze wee gaa n’ihu ịsị ya: “Gịnị na-eme gị?” O wee sị: “Nwaanyị a sịrị m, ‘Weta nwa gị ka anyị rie taa, anyị ga-erikwa nwa nke m echi.’+ 29  Ya mere, anyị siri+ nwa m rie.+ M wee sị ya n’echi ya, ‘Weta nwa gị ka anyị rie.’ Ma o zoro nwa ya.” 30  O wee ruo na ngwa ngwa eze nụrụ ihe nwaanyị ahụ kwuru, ọ dọwara uwe+ ya ozugbo; ka ọ na-agakwa n’elu mgbidi ahụ, ndị mmadụ hụrụ, ma, lee! ihe o yi n’ime bụ ákwà iru uju. 31  O wee sị: “Ka Chineke mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya, ma ọ bụrụ na mụ egbupụghị Ịlaịsha nwa Shefat isi taa!”+ 32  Ịlaịsha nọ ọdụ n’ụlọ ya, ya na ndị okenye nọkwa,+ mgbe eze si n’ihu ya zipụ otu nwoke. Tupu onye ozi ahụ abịakwute ya, ọ sịrị ndị okenye ahụ: “Ùnu ahụwo otú nwa ogbu ọchụ+ a si zite ozi ka e gbupụ m isi? Lee ihe unu ga-eme: ozugbo onye ozi ahụ bịara, mechienụ ụzọ, jirikwanụ ibo ụzọ nughachi ya azụ. Ọ́ bụghị ụda+ ụkwụ onyenwe ya na-ada n’azụ ya?” 33  Mgbe ya na ha ka nọ na-ekwu okwu, lee onye ozi ahụ ka ọ na-abịakwute ya, eze wee sị: “Lee, nke a bụ ọdachi si n’aka Jehova.+ Gịnị mere m ga-eji ka na-echere Jehova?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji