Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Eze 25:1-30

25  O wee ruo n’afọ nke itoolu+ nke ọchịchị ya, n’ọnwa nke iri, n’abalị iri+ n’ọnwa ahụ, na Nebukadneza+ eze Babịlọn bịara,+ ee, ya na ndị agha ya niile, ibuso Jeruselem agha, o wee malite ịma ụlọikwuu ibuso ya agha, na-ewukwa mgbidi nnọchibido gburugburu ya.+  E wee nọchibido obodo ahụ ruo n’afọ nke iri na otu nke ọchịchị Eze Zedekaya.  N’abalị itoolu+ n’ọnwa nke anọ, ụnwụ+ siri ike n’obodo ahụ, ndị ala ahụ enweghịkwa ihe oriri ọ bụla.+  E wee kwatuo mgbidi obodo+ ahụ, ndị agha niile wee si n’ụzọ ọnụ ụzọ ámá nke dị n’agbata mgbidi abụọ ndị dị n’akụkụ ubi eze gbaa ọsọ n’abalị,+ ka ndị Kaldia+ gbara obodo ahụ gburugburu ibuso ya agha; eze wee gbara gawa+ n’ụzọ gara Araba.+  Ndị agha ndị Kaldia+ wee chụwa eze, ha wee chụkwute ya+ na mbara ọzara Jeriko;+ ndị agha ya niile wee hapụ ya gbasasịa.  Ha wee jide eze,+ kpụrụ ya bịakwute eze Babịlọn n’ime Ribla,+ ka ha kpee ya ikpe.  Ha wee gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya n’ihu ya,+ ọ rụkpọsịkwara Zedekaya anya,+ e mesịa, ọ tụrụ ya ịgà e ji ọla kọpa mee+ wee kpụrụ ya bịa Babịlọn.+  N’ọnwa nke ise, n’abalị asaa n’ọnwa ahụ, ya bụ, n’afọ nke iri na itoolu+ nke ọchịchị Eze Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn, Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche, bụ́ onye na-ejere eze Babịlọn ozi, bịara na Jeruselem.+  O wee gbaa ụlọ Jehova ọkụ+ nakwa ụlọ eze+ na ụlọ niile dị na Jeruselem;+ ọ gbakwara ụlọ onye ukwu ọ bụla ọkụ.+ 10  Ndị agha dum nke ndị Kaldia, bụ́ ndị ha na onyeisi ndị nche ahụ so, kwaturu mgbidi gbara Jeruselem gburugburu.+ 11  Nebuzaradan onyeisi ndị nche dọọrọ ndị fọdụrụ+ n’agha,+ bụ́ ndị a hapụrụ n’obodo ahụ, tinyere ndị chịliri aka elu gbakwuru eze Babịlọn nakwa ìgwè mmadụ ndị ọzọ. 12  Onyeisi ndị nche ahụ hapụrụ ụfọdụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha+ n’ala ahụ ka ha fọdụ wee bụrụ ndị ọrụ ubi vaịn na ndị a na-amanye ịrụ ọrụ.+ 13  Ndị Kaldia kụrisịkwara ogidi+ ọla kọpa ndị dị n’ụlọ Jehova, nakwa ihe ndị e ji ebu ihe+ na oké osimiri e ji ọla kọpa rụọ,+ bụ́ ndị dị n’ụlọ Jehova, burukwa ọla kọpa e ji rụọ ha laa Babịlọn.+ 14  Ha bukọkwaara ite na shọvel na ihe ndị e ji emenyụ ọkụ na iko na arịa niile+ e ji ọla kọpa rụọ, ndị ụmụ Izrel jibu na-eje ozi. 15  Onyeisi ndị nche ahụ wee bukọrọ ihe ịgụ ọkụ na ọkwá ndị e ji ezigbo ọlaedo+ mee nakwa ndị e ji ezigbo ọlaọcha mee.+ 16  Ma ogidi abụọ ahụ, oké osimiri ahụ nakwa ihe ndị ahụ e ji ebu ihe Sọlọmọn mere maka ụlọ Jehova, o nweghị otú a pụrụ isi mata ịdị arọ nke ọla kọpa e ji mee ihe ndị a niile.+ 17  Nke ọ bụla n’ime ogidi ndị ahụ dị kubit iri na asatọ+ n’ịdị elu, e jikwa ọla kọpa kpụọ ihe a kpụkwasịrị+ n’elu ogidi ahụ; ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ dị kubit atọ n’ịdị elu; e ji naanị ọla kọpa kpụọ ihe a kpara akpa na mkpụrụ pọmigranet+ bụ́ ndị gbara ihe ahụ a kpụkwasịrị n’elu ogidi ahụ gburugburu; ogidi nke abụọ nwekwara ihe ndị a n’elu ihe ahụ a kpara akpa. 18  Onyeisi ndị nche ahụ kpụkwaara Seraya+ bụ́ onyeisi nchụàjà na Zefanaya+ bụ́ onye nchụàjà na-esote ya nakwa mmadụ atọ bụ́ ndị nche ọnụ ụzọ;+ 19  o sikwa n’obodo ahụ kpụrụ otu onye na-eje ozi n’obí eze bụ́ onyeisi ndị ikom na-aga agha, nakwa ndị ikom ise n’ime ndị na-abịa n’ihu eze mgbe niile, bụ́ ndị nọ n’obodo ahụ; ọ kpụkwaara odeakwụkwọ onyeisi ndị agha, bụ́ onye na-akpọkọta ndị ala ahụ maka ibu agha, nakwa ndị ikom iri isii n’ime ndị ala ahụ bụ́ ndị nọ n’obodo ahụ;+ 20  Nebuzaradan+ onyeisi ndị nche wee kpụrụ ha+ bịakwute eze Babịlọn n’ime Ribla.+ 21  Eze Babịlọn wee gbuo+ ha n’ime Ribla, n’ala Hemat.+ E wee si otú a dọrọ Juda n’agha pụọ n’ala ya.+ 22  Ma Nebukadneza eze Babịlọn họpụtara Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan+ ịbụ onyeisi ndị+ a hapụrụ n’ala Juda, bụ́ ndị ọ hapụrụ. 23  Mgbe ndị isi niile nke ndị agha,+ ha na ndị agha ha, nụrụ na eze Babịlọn họpụtara Gedalaya, ha bịakwutere Gedalaya n’obodo Mizpa+ ozugbo ahụ, ya bụ, Ishmel nwa Netanaya na Johenan nwa Kariya na Seraya nwa Tanhumet onye Netofa na Jeazanaya nwa onye Meakat, ha na ndị agha ha. 24  Gedalaya wee ṅụọrọ ha na ndị agha ha iyi,+ sị ha: “Unu atụla egwu ịbụ ndị na-ejere ndị Kaldia ozi. Birinụ n’ala a jeere eze Babịlọn ozi, ihe ga-agazikwara unu.”+ 25  O wee ruo n’ọnwa nke asaa+ na Ishmel+ nwa Netanaya nwa Elishama, bụ́ onye si n’ezinụlọ eze, bịara, ya na ndị agha iri, ha wee gbuo Gedalaya,+ tinyere ndị Juu na ndị Kaldia ya na ha nọ na Mizpa.+ 26  E mesịa, mmadụ niile, malite n’onye nta ruo n’onye ukwu, tinyekwara ndị isi ìgwè ndị agha, biliri wee bata n’Ijipt;+ n’ihi na egwu jidere ha n’ihi ndị Kaldia.+ 27  O wee ruo n’afọ nke iri atọ na asaa mgbe a dọsịịrị Jehoyakin+ eze Juda n’agha, n’ọnwa nke iri na abụọ, n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa ahụ, na Ivil-merodak+ eze Babịlọn, n’afọ ọ ghọrọ eze, kpọpụtara+ Jehoyakin eze Juda wee mee ka o si n’ụlọ mkpọrọ pụta; 28  o wee malite ịgwa ya okwu ọma, meekwa ka ocheeze ya dị elu karịa ocheeze ndị eze ya na ha nọ na Babịlọn.+ 29  O wee yipụ ya uwe mkpọrọ;+ o wee na-eri ihe+ mgbe niile n’ihu ya n’ụbọchị niile nke ndụ ya. 30  A bịa n’ihe a na-enye ya,+ a na-esi n’ihe eze nwere enye ya ihe mgbe niile, kwa ụbọchị dị ka o kwesịrị, n’ụbọchị niile nke ndụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji