Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Eze 19:1-37

19  O wee ruo na ngwa ngwa Eze Hezekaya+ nụrụ ya, ọ dọwara uwe+ ya ozugbo wee chịrị ákwà iru uju+ kpuchie onwe ya ma bata n’ụlọ Jehova.+  O zipụkwara Elayakim,+ bụ́ onye na-elekọta ezinụlọ ya, na Shebna+ bụ́ odeakwụkwọ nakwa ndị okenye si n’etiti ndị nchụàjà, bụ́ ndị ji ákwà iru uju kpuchie onwe ha, ka ha gakwuru Aịzaya+ onye amụma bụ́ nwa Emọz.+  Ha wee sị ya: “Nke a bụ ihe Hezekaya kwuru, ‘Taa bụ ụbọchị nsogbu+ na nke ịba mba+ nakwa nke ajọ mkparị;+ n’ihi na ụmụ erutewo n’ọnụ akpa nwa,+ ma ike e ji amụ ha adịghị.+  Ma eleghị anya, Jehova bụ́ Chineke gị ga-anụ+ ihe niile Rabshake kwuru, onye eze Asiria onyenwe ya zitere ka ọ kwaa Chineke dị ndụ emo,+ ọ ga-emekwa ka ọ zaa ajụjụ maka okwu Jehova bụ́ Chineke gị nụrụ.+ Kpeekwa ekpere+ maka ndị fọdụrụnụ.’”+  Ndị na-ejere Eze Hezekaya ozi wee bịakwute Aịzaya.+  Aịzaya wee sị ha: “Nke a bụ ihe unu ga-agwa onyenwe unu, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru:+ “Atụla egwu+ n’ihi okwu ị nụrụ, nke ndị na-ejere eze Asiria ozi kwuru iji kwutọọ m.+  Lee, ọ dị mmụọ m ga-etinye+ n’ime ya, ọ ga-anụkwa otu akụkọ+ wee laghachi n’ala ya; m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya n’ala ya.”’”+  E mesịa, Rabshake+ laghachiri wee hụ ka eze Asiria na-ebuso Libna+ agha; n’ihi na ọ nụrụ na o siwo na Lekish+ pụọ.  Ọ nụrụ ka e kwuru banyere Teheka eze Itiopia, sị: “Lee, ọ pụtawo ibuso gị agha.” Ya mere, o zigaara Hezekaya ndị ozi+ ọzọ, sị: 10  “Nke a bụ ihe unu ga-agwa Hezekaya eze Juda, ‘Ekwela ka Chineke gị bụ́ onye ị tụkwasịrị obi duhie gị,+ sị: “A gaghị enyefe Jeruselem+ n’aka eze Asiria.”+ 11  Lee! Gị onwe gị anụwo ihe ndị eze Asiria mere ala niile site n’ibibi ha;+ ọ̀ bụzi gị ka a ga-anapụta?+ 12  Chi+ nke mba dị iche iche nna nna m hà lara n’iyi, hà napụtara ha, ya bụ, Gozan+ na Heran+ na Rizef na ụmụ Iden+ bụ́ ndị biri na Tel-asa?+ 13  Ebee ka eze Hemat+ na eze Apad+ na eze obodo ndị dị na Sefaveyim na eze Hina na eze Iva nọ?’”+ 14  Hezekaya wee nata ndị ozi ahụ akwụkwọ ozi ahụ wee gụọ ya.+ E mesịa, Hezekaya gbagooro n’ụlọ Jehova wee gbasaa ya n’ihu Jehova.+ 15  Hezekaya wee malite ikpe ekpere+ n’ihu Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel,+ onye nọ ọdụ n’elu cherọb,+ naanị gị bụ ezi Chineke nke alaeze niile+ nke ụwa.+ Ọ bụ gị kere eluigwe+ na ụwa.+ 16  Jehova, biko, tọọ ntị n’ala nụrụ.+ Jehova, biko, meghee anya gị+ hụrụ, nụrụkwa ihe Senakerib kwuru, nke o zitere iji kwaa Chineke dị ndụ emo.+ 17  Jehova, ọ bụ eziokwu na ndị eze Asiria alawo mba dị iche iche na ala ha n’iyi.+ 18  Ha agbawokwa chi ha ọkụ, n’ihi na ha abụghị chi,+ kama ha bụ ọrụ aka mmadụ,+ osisi na nkume; ha wee bibie ha. 19  Ugbu a, Jehova bụ́ Chineke anyị,+ biko, zọpụta anyị+ n’aka ya, ka alaeze niile nke ụwa wee mara na ọ bụ naanị gị, Jehova, bụ Chineke.”+ 20  Aịzaya nwa Emọz wee zigara Hezekaya ozi, sị: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru,+ ‘Anụwo+ m ekpere+ i kpekuru m banyere Senakerib eze Asiria. 21  Nke a bụ ihe Jehova kwuru megide ya: “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Zayọn eledawo gị anya,+ o jiriwo gị mere ihe ọchị.+ N’azụ gị ka ada bụ́ Jeruselem+ fufere isi.+ 22  Ònye ka ị kwara emo+ ma kwutọọ?+ Ònye ka ị baara mba,+ Na-elekwa anya ọjọọ?+ Ọ bụ Onye Nsọ Izrel!+ 23  I si n’ọnụ ndị ozi gị+ kwaa Jehova emo, ị na-asịkwa,+ ‘Mụ onwe m ga-eji ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya agha m+ M ga-agbagorokwa n’ebe kasị elu n’ógbè ndị bụ́ ugwu ugwu,+ N’ebe ndị dị n’ime ime Lebanọn;+ M ga-egbutukwa osisi sida+ ya ndị dị oké elu, na osisi junipa ya ndị kasị mma.+ M ga-abanyekwa n’ime ime ya, n’oké ọhịa nke ubi mkpụrụ osisi ya.+ 24  Mụ onwe m ga-egwu olulu mmiri n’ala ọzọ, ṅụọkwa mmiri ya, M ga-ejikwa ọbụ ụkwụ m mee ka ọwa mmiri niile nke Naịl Ijipt taa.’+ 25  Ọ̀ bụ na ị nụbeghị ya?+ Malite na mgbe dị anya gara aga, ọ bụ ihe m ga-eme.+ Malite n’oge gara aga, echepụtawo m ya.+ Ugbu a, m ga-eme ya.+ Ị ga-emekwa ka obodo ndị e wusiri ike tọgbọrọ n’efu dị ka mkpọmkpọ ebe.+ 26  Aka agaghị esi ndị bi n’ime ha ike;+ Ha ga-atụ nnọọ ụjọ, ihere ga-emekwa ha.+ Ha ga-adị ka ihe a kụrụ n’ubi na ahịhịa ndụ na-akabeghị aka,+ Dịkwa ka ahịhịa nke dị n’elu ụlọ+ na nke dị na mbara ala mgbe ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mere ka ọ kpọnwụọ.+ 27  Amaara m nke ọma+ ma ịnọ jụụ gị ma ọpụpụ+ gị ma mbata gị, Nakwa iwe i na-eweso m,+ 28  N’ihi na iwe ị na-eweso m+ na mbigbọ ị na-ebigbọ eruwo m ntị.+ M ga-etinyekwa nko m n’imi gị, keekwa gị eriri m ji achịkwa ịnyịnya n’agbata egbugbere ọnụ gị abụọ,+ M ga-eduru gị ka i si n’ụzọ ahụ i si bịa laghachi.”+ 29  “‘Nke a ga-abụrụ gị ihe ịrịba ama:+ N’afọ a, a ga-eri ihe mkpụrụ ndị dapụrụ adapụ mịrị,+ n’afọ nke abụọ, a ga-erikwa mkpụrụ ndị puuru onwe ha; ma n’afọ nke atọ, ghaanụ mkpụrụ,+ ghọrọkwanụ mkpụrụ ya, kọọkwanụ ubi vaịn ma rie mkpụrụ ha.+ 30  Ndị lanahụrụ n’ụlọ Juda, bụ́ ndị fọdụrụnụ,+ ga-agbanye mgbọrọgwụ n’ala ma mịa mkpụrụ n’elu.+ 31  N’ihi na ọ bụ na Jeruselem ka ndị fọdụrụnụ ga-esi pụta,+ ọ bụkwa n’Ugwu Zayọn ka ndị gbapụrụ agbapụ ga-esi pụta.+ Ọ bụ ekworo+ Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eme ihe a. 32  “‘Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere eze Asiria:+ “Ọ gaghị abata n’obodo a,+ ọ gaghịkwa agba otu akụ́+ n’ime ya, ọ gaghị eji ọta bịa buso ya agha, ọ gaghịkwa ama ékpè+ iji buso ya agha. 33  Ụzọ ahụ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi, ọ gaghịkwa abata n’obodo a, ka Jehova kwuru.+ 34  M ga-echebekwa+ obodo a iji zọpụta ya n’ihi mụ onwe m+ nakwa n’ihi ohu m Devid.”’”+ 35  O wee ruo n’abalị ahụ na mmụọ ozi Jehova gara gbuo otu narị puku na iri puku mmadụ asatọ na puku ise n’ebe ndị Asiria+ mara ụlọikwuu.+ Mgbe ndị mmadụ biliri n’isi ụtụtụ, lee, ha niile bụ ozu ozu.+ 36  Ya mere, Senakerib+ eze Asiria hapụrụ ebe ahụ wee laghachi+ gaa biri na Ninive.+ 37  O wee ruo na mgbe ọ na-akpọ isiala n’ụlọ Nisrọk+ bụ́ chi ya,+ Adramelek na Shariza, bụ́ ụmụ ya ndị ikom, weere mma agha gbuo ya,+ ha wee gbaga n’ala Ararat.+ Isa-hadọn+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji