Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

2 Ndị Eze 17:1-41

17  N’afọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Ehaz eze Juda, Hoshia+ nwa Ila ghọrọ eze Izrel wee chịa na Sameria+ ruo afọ itoolu.  O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, ọ bụ naanị na ọ bụghị dị ka ndị eze Izrel ndị bu ya ụzọ.+  Ọ bụ ya ka Shalmaniza+ eze Asiria+ gbagotere buso agha, Hoshia wee ghọọ ohu ya ma malite ịtụrụ ya ụtụ.+  Otú ọ dị, eze Asiria chọpụtara izu ọjọọ Hoshia gbara,+ n’ihi na o zigaara Soo bụ́ eze Ijipt+ ndị ozi, o wetaghịkwara eze Asiria ụtụ dị ka ọ na-eme n’afọ ndị gara aga. N’ihi ya, eze Asiria kpọchiri ya ma kee ya agbụ n’ụlọ mkpọrọ.+  Eze Asiria wee gbagote ibuso ala ahụ dum agha, gbagotekwa Sameria wee nọchibido+ ya ruo afọ atọ.  N’afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshia, eze Asiria weghaara Sameria,+ dọrọkwa Izrel n’agha+ laa Asiria ma mee ka ha biri na Hela+ nakwa na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan+ nakwa n’obodo dị iche iche nke ndị Midia.+  O wee ruo na n’ihi na ụmụ Izrel mehiere+ Jehova bụ́ Chineke ha, bụ́ onye kpọpụtara ha n’ala Ijipt n’aka Fero eze Ijipt,+ ha wee malite ịtụ egwu chi ọzọ;+  ha wee na-eje ije n’ụkpụrụ+ mba ndị Jehova chụpụrụ n’ihu ụmụ Izrel, nakwa n’ụkpụrụ ndị eze Izrel mere;  ụmụ Izrel wee na-etinye aka n’ihe na-ezighị ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke ha,+ na-ewukwara onwe ha ebe ndị dị elu+ n’obodo ha niile, malite n’ụlọ nche+ nke ndị nche ruo n’obodo e wusiri ike; 10  ha wee na-eguzobere onwe ha ogidi nsọ+ na ogwe osisi dị nsọ+ n’elu ugwu niile dị elu+ nakwa n’okpuru osisi niile jupụtara n’akwụkwọ ndụ;+ 11  ọ bụkwa n’ebe ahụ, n’ebe niile dị elu, ka ha nọ na-esure ihe nsure ọkụ dị ka mba ndị ahụ+ Jehova mere ka a dọrọ n’agha n’ihi ha, ha wee na-eme ihe ọjọọ iji kpasuo Jehova iwe.+ 12  Ha wee na-efe arụsị na-asọ oyi ka nsị,+ bụ́ ndị Jehova gwara ha banyere ha, sị: “Unu emela ihe a”;+ 13  Jehova wee na-adọ Izrel+ na Juda+ aka ná ntị+ site n’ọnụ ndị amụma+ ya niile na ndị ọhụụ+ niile, sị: “Hapụnụ ụzọ ọjọọ+ unu ma debe ihe m nyere n’iwu+ na ụkpụrụ+ m, dị ka iwu+ dum m nyere nna nna unu hà+ si dị, nke m ziteere unu site n’ọnụ ndị ohu m bụ́ ndị amụma”;+ 14  ma ha egeghị ntị, kama ha nọ na-ekwesi olu ike+ dị ka ndị nna nna ha, bụ́ ndị na-enweghị okwukwe+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke ha nọ, kwesiri olu ike; 15  ha wee na-ajụ ụkpụrụ ya na ọgbụgba ndụ ya+ nke ya na ndị nna nna ha gbara, tinyere ihe ncheta ya+ ndị o ji dọọ ha aka ná ntị, ha wee na-eso arụsị na-abaghị uru,+ ha onwe ha wee ghọọ ndị na-abaghị uru,+ dị ka mba ndị gbara ha gburugburu, bụ́ ndị Jehova nyere ha iwu banyere ha ka ha ghara ime dị ka ha.+ 16  Ha wee na-ahapụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke ha nyere n’iwu,+ ha wee meere onwe ha ihe oyiyi a wụrụ awụ,+ bụ́ ụmụ ehi abụọ,+ meekwa ogwe osisi dị nsọ,+ ha wee malite ịkpọrọ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe isiala,+ na-efekwa Bel ofufe;+ 17  ha wee na-esure*+ ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom n’ọkụ, na-agba afa,+ na-achọkwa ihe mgbaàmà ọdịnihu,+ ha wee na-ere+ onwe ha ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, iji kpasuo ya iwe.+ 18  Ya mere, Jehova wesoro Izrel oké iwe,+ nke mere na o wepụrụ ha n’ihu ya.+ O kweghị ka ebo ọ bụla fọdụ ma e wezụga naanị ebo Juda.+ 19  Ọbụna Juda edebeghị ihe Jehova bụ́ Chineke ha nyere n’iwu,+ kama ha jere ije n’ụkpụrụ Izrel+ mere. 20  N’ihi ya, Jehova jụrụ mkpụrụ+ niile nke Izrel wee na-emekpa ha ahụ́, na-enyefekwa ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe, ruo mgbe ọ chụpụrụ ha n’ihu ya.+ 21  N’ihi na ọ dọkapụrụ Izrel n’ụlọ Devid, ha wee mee Jeroboam+ nwa Nibat eze; Jeroboam wee mee ka Izrel kwụsị iso Jehova, o wee mee ka ha mee mmehie dị ukwuu.+ 22  Ụmụ Izrel wee na-eje ije ná mmehie niile Jeroboam mere.+ Ha ahapụghị ha, 23  ruo mgbe Jehova wepụrụ Izrel n’ihu ya,+ dị nnọọ ka o kwuru site n’ọnụ ndị ohu ya bụ́ ndị amụma.+ E wee si n’ala Izrel dọrọ ha n’agha laa Asiria ruo taa.+ 24  E mesịa, eze Asiria si na Babịlọn+ na Kuta na Ava+ na Hemat+ na Sefaveyim+ kpọta ndị mmadụ, meekwa ka ha bichie ụmụ Izrel n’obodo ndị dị na Sameria;+ ha wee malite iweghara Sameria, birikwa n’obodo ya dị iche iche. 25  O wee ruo na mgbe ha malitere ibi n’ebe ahụ, ha atụghị egwu+ Jehova. N’ihi ya, Jehova zigara ọdụm+ n’etiti ha, ha wee na-adọgbu ụfọdụ n’ime ha. 26  Ha wee zigara eze Asiria ozi, sị: “Mba ndị ahụ ị dọọrọ n’agha wee mee ka ha biri n’obodo ndị dị na Sameria amaghị okpukpe nke Chi ala ahụ, o wee na-eziga ọdụm n’etiti ha;+ lee! ha na-adọgbu ha, ebe ọ bụ na ọ dịghị onye n’ime ha maara okpukpe nke Chi ala ahụ.” 27  Eze Asiria wee nye iwu, sị: “Meenụ ka otu n’ime ndị nchụàjà+ gaa n’ebe ahụ, bụ́ onye unu si n’ebe ahụ dọrọ n’agha, ka o biri n’ebe ahụ wee na-akụziri ha otú e si ekpere Chi ala ahụ.” 28  Ya mere, otu n’ime ndị nchụàjà nke ha si na Sameria dọrọ n’agha bịara wee malite ibi na Betel,+ o wee bụrụ onye na-akụziri ha otú ha kwesịrị isi na-atụ egwu Jehova.+ 29  Otú ọ dị, mba nke ọ bụla na-eme chi nke ya,+ nke ha na-edebe n’ụlọ dị n’ebe ndị dị elu nke ndị Sameria rụrụ, mba nke ọ bụla n’obodo ha bi. 30  Ndị Babịlọn mere Sọkọt-binọt, ndị Kọt+ emee Negal, ndị Hemat emee Ashaịma. 31  Ma ndị Ava+ mere Nibhaz na Tatak; ndị Sefaveyim+ na-esurere Adramelek na Anamelek bụ́ chi Sefaveyim ụmụ ha n’ọkụ.+ 32  Ha wee bụrụ ndị na-atụ egwu Jehova, ha wee si ná ndị nkịtị họrọ ndị ha na-eme ndị nchụàjà+ nke ebe ndị dị elu, ha wee na-arụrụ ha ọrụ n’ụlọ dị n’ebe ndị dị elu. 33  Ha ghọrọ ndị na-atụ egwu Jehova,+ ma, ọ bụ chi ha ka ha na-efe ofufe,+ dị ka okpukpe nke mba ndị ahụ si dị, bụ́ ebe e si dọrọ ha n’agha.+ 34  Ruo taa, ha na-eme ihe dị ka okpukpe mbụ ha si dị.+ Ọ dịghị onye n’ime ha na-atụ egwu Jehova,+ ọ dịghịkwa onye na-agbaso ụkpụrụ ya na mkpebi ikpe+ ya na iwu+ ya na ntụziaka+ Jehova nyere ụmụ Jekọb,+ bụ́ onye o mere ka aha ya bụrụ Izrel;+ 35  mgbe ha na Jehova gbara ndụ,+ ya enyekwa ha iwu, sị: “Unu atụla egwu chi ọzọ,+ unu akpọrọla ha isiala, unu efekwala ha ofufe, unu achụkwarala ha àjà.+ 36  Kama ọ bụ Jehova, bụ́ onye ji ike dị ukwuu na ogwe aka ọ gbatịrị agbatị+ kpọpụta unu n’ala Ijipt, ka unu ga-atụ egwu,+ ọ bụkwa ya ka unu ga-akpọrọ isiala,+ ọ bụkwa ya ka unu ga-achụrụ àjà.+ 37  Ụkpụrụ+ na mkpebi ikpe+ na iwu na ntụziaka ndị o deere unu+ ka unu ga-elezi anya na-eme mgbe niile;+ unu atụkwala egwu chi ọzọ. 38  Unu echefula ọgbụgba ndụ nke mụ na unu gbara;+ unu atụkwala egwu chi ọzọ.+ 39  Kama ọ bụ Jehova+ bụ́ Chineke unu ka unu ga-atụ egwu, n’ihi na ọ bụ ya ga-anapụta unu n’aka ndị iro unu niile.”+ 40  Ma ha erubeghị isi, kama ha na-eme ihe dị ka okpukpe mbụ ha si dị.+ 41  Mba ndị a wee na-atụ egwu Jehova,+ ma, ọ bụ ihe oyiyi ha a pịrị apị ka ha na-efe ofufe. Ruo taa, ma ụmụ ha ma ụmụ ụmụ ha na-eme nnọọ dị ka ndị nna nna ha mere.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

2Ez 17:17*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “na-eme ka ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom gabiga n’ọkụ.”