Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Timoti 6:1-21

6  Ka ndị niile bụ́ ohu, bụ́ ndị nọ n’okpuru yok, na-agụ ndị nwe ha ná ndị ha kwesịrị ka e nye ha nsọpụrụ zuru ezu,+ ka a ghara ikwu okwu ọjọọ mgbe ọ bụla banyere aha Chineke na ozizi ahụ.+  Ka ndị nwere ndị kwere ekwe dị ka ndị nwe ha+ gharakwa ilelị ha,+ n’ihi na ha bụ ụmụnna.+ Kama nke ahụ, ka ha dịrị njikere karị ịbụ ohu, n’ihi na ọ bụ ndị kwere ekwe na ndị a hụrụ n’anya na-erite uru n’ozi dị mma ha na-eje. Na-akụzi ihe ndị a+ ma na-enye ndụmọdụ ndị a.  Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ezi ozizi dị iche,+ ọ bụrụkwa na onye ahụ adịghị ekwere okwu na-enye ezi ndụ,+ bụ́ okwu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ma ọ bụ ozizi ahụ nke kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke,+  nganga na-afụli ya elu,+ ọ dịghị aghọta ihe ọ bụla,+ kama ọ bụ onye oké ajụjụ na ịrụ ụka banyere okwu+ dị iche iche na-agba ara.+ Ihe na-esi n’ihe ndị a apụta bụ anyaụfụ,+ esemokwu, okwu mkparị,+ inyo mmadụ ajọ onyinyo,  oké esemokwu banyere ihe ndị na-abaghị uru, bụ́ nke ndị e merụrụ uche ha emerụ+ na ndị na-amaghị eziokwu+ ahụ na-ese, na-eche na nsọpụrụ Chineke bụ ụzọ isi rite uru.+  N’ezie, nsọpụrụ Chineke a,+ ya na inwe afọ ojuju,+ bụ ụzọ isi rite uru dị ukwuu.+  N’ihi na ọ dịghị ihe anyị ji bịa n’ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iwere si n’ime ya pụọ.+  Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.+  Otú ọ dị, ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa+ na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha,+ ndị na-emerụkwa ahụ́, ndị na-emekwa ka mmadụ mikpuo ná mbibi na ịla n’iyi.+ 10  N’ihi na ịhụ ego n’anya+ bụ mgbọrọgwụ+ nke ụdị ihe ọjọọ niile.+ Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, e duhiewo ụfọdụ, ha wee dapụ n’okwukwe. Ha wee jiri ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.+ 11  Otú ọ dị, gị onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a ọsọ.+ Kama chụsoo ezi omume, nsọpụrụ Chineke, okwukwe, ịhụnanya, ntachi obi, ịdị nwayọọ n’obi.+ 12  Lụọ ezi ọgụ nke okwukwe.+ Jidesie ndụ ebighị ebi ahụ aka ike, nke bụ́ ihe mere e ji kpọọ gị, i wee mee ezi nkwupụta ihu ọha+ n’ihu ọtụtụ ndị àmà. 13  N’ihu Chineke, onye na-echebe ihe niile ndụ, nakwa n’ihu Kraịst Jizọs, onye mere ezi nkwupụta ihu ọha+ n’ihu Pọntiọs Paịlet+ dị ka onye àmà,+ ana m enye gị iwu+ 14  ka i debe ihe ahụ e nyere n’iwu n’ụzọ na-enweghị ntụpọ, n’ụzọ a na-apụghịkwa ikwujọ ekwujọ, ruo mgbe Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ga-apụta ìhè.+ 15  N’oge ya a kara aka,+ onye obi ụtọ ahụ na onye naanị ya bụ Eze Ukwu+ ga-egosi onwe ya, onye bụ́ Eze+ nke ndị na-achị achị dị ka ndị eze, na Onyenwenụ+ nke ndị na-achị achị dị ka ndị nwenụ, 16  onye naanị ya nwere anwụghị anwụ,+ onye bi n’ìhè a na-apụghị iru nso,+ onye mmadụ ọ bụla na-ahụtụbeghị, ọ dịghịkwa mmadụ ọ bụla pụrụ ịhụ ya.+ Ka nsọpụrụ+ na ike ebighị ebi dịrị ya. Amen. 17  Na-enye ndị bara ọgaranya+ n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu,+ ka ha nweekwa olileanya, ọ bụghị n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka,+ kama n’ebe Chineke nọ bụ́ onye na-enye anyị ihe niile n’ụba ka anyị wee nwee ọṅụ;+ 18  ka ha na-arụ ọrụ ọma,+ ka ha bụrụ ọgaranya n’ezi ọrụ,+ ka ha na-emesapụ aka, ka ha dịrị njikere inye ndị ọzọ ihe,+ 19  ka ha na-atọrọ+ onwe ha ezi ntọala+ maka ọdịnihu dị ka akụ̀ n’ebe ihe ọ bụla na-agaghị eme ya, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.+ 20  Timoti, chee ihe ahụ e nyefere n’aka gị nche,+ na-agbakụta okwu nzuzu ndị na-emerụ ihe dị nsọ azụ nakwa ihe ndị ahụ na-emegiderịta onwe ha nke a na-akpọ “ihe ọmụma” n’ụzọ ụgha.+ 21  N’ihi iji ihe ọmụma dị otú ahụ na-akpa nganga, ụfọdụ adapụwo n’okwukwe.+ Ka obiọma na-erughịrị mmadụ dịnyere unu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji