Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Timoti 5:1-25

5  Abasirila okenye mba ike.+ Kama nke ahụ, na-arịọ ya arịrịọ dị ka nna gị, na-emeso ụmụ okorobịa dị ka ụmụnne gị ndị nwoke,  na-emeso ụmụ nwaanyị mere okenye+ dị ka ndị nne, na-emeso ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne gị ndị nwaanyị+ n’ịdị ọcha niile.  Na-asọpụrụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ndị bụ́ n’ezie ndị di ha nwụrụ.+  Ma ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ha buru ụzọ mụta itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ezinụlọ nke ha,+ mụtakwa ịdị na-akwụ ndị mụrụ ha+ na ndị nne na nna ha ochie ụgwọ ruuru ha, n’ihi na ọ bụ ihe dị mma n’anya Chineke.+  Ma nwaanyị nke bụ́ nwaanyị di ya nwụrụ n’ezie na onye nọ n’ụkọ+ etinyewo olileanya ya n’ebe Chineke nọ,+ ọ na-arịọsikwa arịrịọ ike ma na-ekpe ekpere abalị na ehihie.+  Ma nwaanyị nke na-ebi ndụ dị ka agụụ anụ ahụ́+ si dị nwụrụ anwụ,+ ọ bụ ezie na ọ dị ndụ.  Ya mere, na-enye iwu ndị a,+ ka ha wee bụrụ ndị a na-apụghị ikwujọ ekwujọ.+  N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha,+ karịsịa, ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya,+ ọ jụwo+ okwukwe anyị,+ jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.  Ka e denye aha nwaanyị di ya nwụrụ n’akwụkwọ, bụ́ onye gbara afọ iri isii ma ọ dịkarịa ala, onye bụ́ nwunye nke otu di,+ 10  onye a na-agbara àmà na ọ na-arụ ọrụ ọma,+ ma ọ bụrụ na ọ zụlitere ụmụ,+ ma ọ bụrụ na o lekọtara ndị ọbịa,+ ma ọ bụrụ na ọ sara ụkwụ ndị nsọ,+ ma ọ bụrụ na o nyeere ndị nọ ná mkpagbu aka,+ ma ọ bụrụ na o ji ịdị uchu gbasoo ezi ọrụ niile.+ 11  N’aka nke ọzọ, edenyela aha ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ n’akwụkwọ, bụ́ ndị na-akatabeghị ahụ́, n’ihi na mgbe agụụ mmekọahụ nke na-agụ ha kewapụrụ ha n’ebe Kraịst nọ,+ ha na-achọ ịlụ di, 12  a na-amakwa ha ikpe n’ihi na ha ledara nkwupụta mbụ nke okwukwe ha anya.+ 13  N’otu mgbe ahụ, ha na-amụtakwa ịnọ nkịtị, na-epiogharị n’ụlọ dị iche iche; ee, ọ bụghị naanị na ha na-anọ nkịtị, kama, ha na-aghọkwa ndị asịrị na ndị na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha,+ na-ekwu okwu banyere ihe ha na-ekwesịghị ikwu. 14  Ya mere, achọrọ m ka ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, bụ́ ndị na-akatabeghị ahụ́, lụọ di,+ ka ha mụọ ụmụ,+ ka ha na-elekọta ezinụlọ, ka ha ghara inye onye na-emegide anyị ihe ọ ga-eji kwujọọ anyị.+ 15  N’eziokwu, ụfọdụ atụgharịworị soro Setan. 16  Ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla nke kwere ekwe nwere ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ya nyere ha aka,+ ka ọgbakọ gharakwa iburu ibu arọ ahụ. Mgbe ahụ, ọgbakọ pụrụ inyere ndị bụ́ n’ezie ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ aka.+ 17  Ka a gụọ ndị okenye bụ́ ndị na-arụ ọrụ nlekọta+ n’ụzọ dị mma ná ndị ruru eru inweta nsọpụrụ okpukpu abụọ,+ karịsịa, ndị na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe.+ 18  N’ihi na Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ”;+ ọ sịkwara: “Onye ọrụ kwesịrị ụgwọ ọrụ ya.”+ 19  Ekwetala ebubo e boro okenye, ọ gwụla naanị ma è nwere akaebe nke ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ gbara.+ 20  Na-adọ ndị na-eme mmehie+ aka ná ntị+ n’ihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ wee tụọkwa egwu.+ 21  Ana m enyesi gị iwu ike n’ihu Chineke na Kraịst Jizọs,+ na ndị mmụọ ozi a họọrọ, ka ị na-eme ihe ndị a n’ebughị ụzọ mee mkpebi, ghara iji echiche hiere ụzọ na-eme ihe ọ bụla.+ 22  Ebikwasịla+ onye ọ bụla aka n’isi ngwa ngwa;+ ekerela òkè ná mmehie nke ndị ọzọ;+ debe onwe gị ọcha.+ 23  Aṅụkwala naanị mmiri ọzọ, kama na-aṅụ ntakịrị mmanya+ n’ihi afọ gị na ọrịa nke ị na-arịakarị. 24  Mmehie ụfọdụ ndị na-apụta ìhè n’ihu ọha,+ wee duga ha n’ikpe, ma mmehie nke ndị ọzọ na-apụta ìhè mgbe e mesịrị.+ 25  Otú ahụkwa, ọrụ ọma na-apụta ìhè n’ihu ọha,+ a pụghịkwa ịnọgide na-ezochi ndị+ na-apụtaghị ìhè.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji