Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Timoti 1:1-20

1  Pọl, onyeozi+ nke Kraịst Jizọs site n’iwu nke Chineke+ bụ́ Onye Nzọpụta anyị,+ sitekwa n’iwu nke Kraịst Jizọs, bụ́ olileanya anyị,+  na-edetara Timoti+ akwụkwọ, onye bụ́ ezigbo nwa+ n’okwukwe: Ka obiọma na-erughịrị mmadụ, ebere, na udo nke si n’aka Chineke bụ́ Nna nakwa n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị dịnyere gị.+  Dị nnọọ ka m gbara gị ume ka ị nọrọ n’Efesọs mgbe m chọrọ ịgawa Masedonia,+ otú ahụ ka m na-eme ugbu a, ka i wee nye ụfọdụ ndị iwu+ ka ha ghara izi ozizi dị iche,+  ka ha gharakwa ịṅa ntị n’akụkọ ụgha+ nakwa n’usoro ọmụmụ, bụ́ ndị na-emesị bụrụ ihe efu,+ ndị na-ebutekwa ajụjụ ndị a na-emere nnyocha kama ịdị na-ekesa ihe ọ bụla si n’aka Chineke n’ihe banyere okwukwe.  N’ezie, ihe mere e ji nye iwu a bụ ka e nwee ịhụnanya+ nke si n’obi dị ọcha,+ n’ezi akọ na uche+ nakwa n’okwukwe nke na-abụghị nke ihu abụọ.+  Site n’ịhapụ ihe ndị a, ụfọdụ ndị adapụwo+ wee na-ekwu okwu na-abaghị uru,+  na-achọ ka ha bụrụ ndị na-akụzi+ iwu,+ ma ha adịghị aghọta ihe ndị ha na-ekwu ma ọ bụ ihe ndị ha na-ekwusi okwu ike banyere ha.  Anyị maara na Iwu ahụ dị mma+ ma ọ bụrụ na mmadụ ejiri ya mee ihe n’ụzọ iwu kwadoro+  ma ọ bụrụ na ọ maara nke a, na a na-eme iwu, ọ bụghị n’ihi onye ezi omume, kama n’ihi ndị na-emebi iwu+ na ndị isi ike,+ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke na ndị mmehie, ndị na-enweghị obiọma,*+ ndị na-emerụ ihe dị nsọ, ndị na-egbu nna ha na ndị na-egbu nne ha, ndị ogbu mmadụ, 10  ndị na-akwa iko,+ ndị nwoke na-edina ndị nwoke, ndị na-atọrọ mmadụ, ndị ụgha, ndị na-aṅụ iyi ụgha,+ na ihe ọ bụla ọzọ nke na-emegide+ ozizi nke na-enye ezi ndụ,+ 11  dị ka ozi ọma dị ebube nke Chineke bụ́ onye obi ụtọ+ si dị, nke e nyefere m n’aka.+ 12  Ana m ekele Kraịst Jizọs Onyenwe anyị, onye nyere m ike, n’ihi na ọ gụrụ m n’onye kwesịrị ntụkwasị obi+ site n’ikenye m ozi,+ 13  ọ bụ ezie na n’oge gara aga, abụ m onye nkwulu na onye mkpagbu+ na onye na-akparị mmadụ.+ Otú ọ dị, e meere m ebere,+ n’ihi na amaghị m ihe mgbe ahụ,+ emekwara m ya n’ihi enweghị okwukwe. 14  Ma obiọma Onyenwe anyị nke na-erughịrị mmadụ dị nnọọ ukwuu,+ ya na okwukwe na ịhụnanya nke dị n’ime Kraịst Jizọs.+ 15  Okwu a+ kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịkwa ka a nabata ya n’ụzọ zuru ezu, ya bụ, na Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie.+ N’ime ndị a, abụ m onye mbụ.+ 16  Otú ọ dị, ihe mere e ji meere m ebere+ bụ ka Kraịst Jizọs wee site n’aka mụ onwe m, bụ́ onye kasị bụrụ onye mmehie, gosi ogologo ntachi obi ya niile ka m wee ghọọrọ ndị ga-enwe okwukwe+ n’ebe ọ nọ ihe atụ, ka ha wee nweta ndụ ebighị ebi.+ 17  Ka Eze mgbe ebighị ebi,+ onye a na-apụghị ibibi ebibi,+ onye a na-apụghị ịhụ anya,+ onye naanị ya bụ Chineke,+ bụrụ onye nsọpụrụ na otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Amen. 18  Timoti nwa m, m na-enyefe gị iwu a+ n’aka dị ka amụma+ ndị e buru banyere gị si dị, ka i wee site n’ihe ndị a na-ebu agha ọma ahụ;+ 19  jidesie okwukwe na ezi akọ na uche ike,+ nke ụfọdụ jụrụ,+ ụgbọ ha wee kpuo n’ihe banyere okwukwe ha.+ 20  Haịmeniọs+ na Alegzanda+ so ná ndị a, enyefewokwa m ha n’aka Setan+ ka e site n’ịdọ ha aka ná ntị kụziere ha ka ha ghara ikwulu Chineke.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

1Ti 1:9*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”