Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Samuel 9:1-27

9  E nwere otu nwoke bụ́ onye ebo Benjamin, aha ya bụ Kish,+ nwa Abayel, nwa Ziroa, nwa Bikorat, nwa Afaya, onye ebo Benjamin,+ ọ bụ nwoke bara ezigbo ọgaranya.+  O nwere otu nwa nwoke aha ya bụ Sọl,+ bụ́ nwa okorobịa mara mma, ọ dịghịkwa nwoke ọ bụla n’etiti ụmụ Izrel ka ya mma; site n’ubu ya gbagoo, o toro ogologo karịa mmadụ niile.+  Ụfọdụ nne ịnyịnya ibu+ Kish bụ́ nna Sọl furu. Kish wee sị Sọl nwa ya: “Biko, kpọrọ otu n’ime ndị na-ejere m ozi bilie, gaa chọọ nne ịnyịnya ibu ndị ahụ.”  O wee gafere ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu,+ gaferekwa ala Shalisha,+ ma ha ahụghị ha. Ha wee gafere ala Shealim, ma ha anọghị n’ebe ahụ. Ha wee gafere ala ndị ebo Benjamin, ma ha ahụghị ha.  Ha wee bata n’ala Zọf; Sọl wee gwa onye na-ejere ya ozi nke ya na ya so, sị: “Bịa ka anyị lawa, ka nna m ghara ịkwụsị iche banyere nne ịnyịnya ibu ndị ahụ wee chegbuwezie onwe ya banyere anyị.”+  Ma ọ sịrị ya: “Biko, lee! E nwere onye nke Chineke+ nọ n’obodo a, ọ bụ nwoke a na-asọpụrụ. Ihe niile ọ na-ekwu na-emezurịrị.+ Ka anyị gaa n’ebe ahụ ugbu a. Ma eleghị anya, o nwere ike ịgwa anyị ụzọ anyị ga-esi.”  Sọl wee gwa onye na-ejere ya ozi, sị: “Ọ bụrụ na anyị agaa, gịnị ka anyị ga-enye nwoke ahụ?+ n’ihi na achịcha agwụla n’akpa anyị, ọ dịghị ihe a ga-enye onye nke ezi Chineke dị ka onyinye.+ Gịnị ka anyị nwere?”  Onye ahụ na-ejere Sọl ozi wee zaakwa ya, sị: “Lee! M ji otu ụzọ n’ụzọ anọ nke shekel+ ọlaọcha, m ga-enyekwa ya onye nke ezi Chineke, ọ ga-agwakwa anyị ụzọ anyị ga-esi.”  (N’oge ochie n’Izrel, ọ bụrụ na nwoke na-aga ịjụta Chineke ase, ọ gaara ekwu, sị: “Bịanụ, ka anyị gakwuru onye ọhụ ụzọ.”+ N’ihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ihe a na-akpọ ya n’oge ochie bụ onye ọhụụ.) 10  Sọl wee gwa onye na-ejere ya ozi, sị: “Ihe i kwuru dị mma.+ Bịa ka anyị gaa.” Ha wee gaa n’obodo ebe onye nke ezi Chineke nọ. 11  Ka ha na-aga n’ụzọ gbagoro obodo ahụ, ha hụrụ ụmụ agbọghọ na-aga isere mmiri.+ Ha wee sị ha: “Onye ọhụ ụzọ+ ọ̀ nọ n’ebe a?” 12  Ha wee zaa ha, sị: “Ọ nọ ya. Lee! Ebe ọ nọ ka dị n’ihu. Meenụ ngwa, n’ihi na ọ bịara n’obodo a taa, n’ihi na e nwere àjà a ga-achụ+ maka ndị Izrel taa n’ebe dị elu.+ 13  Ozugbo unu banyere n’obodo, unu ga-ahụ ya tupu ya agbagoo n’ebe dị elu iri ihe; n’ihi na ndị mmadụ agaghị eri ihe ruo mgbe ọ bịara, n’ihi na ọ bụ ya na-agọzi àjà.+ E mesịa, ndị a kpọrọ òkù ga-eri ihe. Ma ugbu a, gbagoonụ, n’ihi na unu ga-ahụ ya ugbu a.” 14  Ha wee gbagoo n’obodo ahụ. Ka ha na-abata n’etiti obodo ahụ, lee, Samuel na-apụta izute ha ka ọ na-aga n’ebe dị elu. 15  N’ụbọchị bọtara ụbọchị Sọl bịara, Jehova kpugheere+ Samuel, sị: 16  “Ụdị ugbu a echi, m ga-ezitere gị otu nwoke si n’ala Benjamin,+ tee ya mmanụ+ ịbụ onye ndú nke ndị m bụ́ Izrel; ọ ga-azọpụtakwa ndị m n’aka ndị Filistia,+ n’ihi na ahụwo m mmekpa ahụ́ nke ndị m, mkpu ákwá ha eruwokwa m ntị.”+ 17  Samuel wee hụ Sọl, ma Jehova sịrị ya: “Lee nwoke ahụ m gwara gị banyere ya, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-achị ndị m.’”+ 18  Sọl wee bịakwute Samuel n’etiti ọnụ ụzọ ámá, sị ya: “Biko, gwa m, Olee ụlọ onye ọhụ ụzọ?” 19  Samuel wee zaa Sọl, sị: “Ọ bụ m bụ onye ọhụ ụzọ ahụ. Buru m ụzọ gbagowe n’ebe dị elu, mụ na unu ga-eri nri taa,+ m ga-ahapụkwa gị n’ụtụtụ ka ị lawa, m ga-agwakwa gị ihe niile dị gị n’obi.+ 20  Ma nne ịnyịnya ibu ndị ahụ funahụrụ gị ụbọchị atọ gara aga,+ etinyekwala obi+ gị na ha, n’ihi na a hụwo ha. Ònyekwa nwe ihe niile a na-achọsi ike n’Izrel?+ Ọ́ bụghị gị na ezinụlọ nna gị dum?” 21  Sọl wee zaa, sị: “Ọ̀ bụ na mụ abụghị onye ebo Benjamin nke kasị nta+ n’ebo niile nke Izrel,+ ọ̀ bụkwa na ezinụlọ m abụghị nke kasị nta n’ezinụlọ niile nke ebo Benjamin?+ Gịnịzi mere i ji gwa m ihe dị otú a?”+ 22  Samuel wee kpọrọ Sọl na onye na-ejere ya ozi kpọbata ha n’ụlọ iri ihe wee nye ha isi oche+ n’ebe ndị a kpọrọ òkù nọ, ha dịkwa ihe dị ka ndị ikom iri atọ. 23  E mesịa, Samuel gwara onye ahụ na-esi nri, sị: “Nye m ihe ahụ m nyere gị, nke m sịrị gị, ‘Debe ya iche.’” 24  Onye ahụ na-esi nri wee buru ụkwụ anụ na ihe dị n’elu ya ma debe ya n’ihu Sọl. O wee sị: “Lee anụ ahụ e debere iche. Debe ya n’ihu gị. Rie ya, n’ihi na e debeere gị ya ruo mgbe a kara aka ka gị na ndị a kpọrọ òkù rie ya.” Sọl na Samuel wee rikọọ ihe n’ụbọchị ahụ. 25  E mesịa, ha si n’ebe ahụ dị elu+ gbadaa n’obodo, ya na Sọl wee nọrọ n’elu ụlọ+ na-ekwurịta okwu. 26  Ha wee bilie n’isi ụtụtụ, o wee ruo na ozugbo chi bọrọ, Samuel kpọrọ Sọl n’elu ụlọ, sị: “Bilie, ka m dupụ gị.” Sọl wee bilie, ha abụọ, ya na Samuel, wee pụwa. 27  Ka ha na-agbadata ná ngwụcha ngwụcha obodo ahụ, Samuel sịrị Sọl: “Gwa onye na-ejere gị ozi+ ka ọ gafere anyị gatụwa”—o wee gafere—“ma gị onwe gị, guzo n’ebe a ka m mee ka ị nụrụ okwu Chineke.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji