Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Samuel 31:1-13

31  Ndị Filistia nọ na-ebuso Izrel agha,+ ndị Izrel wee si n’ihu ndị Filistia gbaa ọsọ, e wee na-egbu ha,+ ha ana-ada n’Ugwu Gilboa.+  Ndị Filistia wee chụsie Sọl na ụmụ ya ọsọ ike; n’ikpeazụ, ndị Filistia gburu Jọnatan+ na Abinadab+ na Malkaị-shua,+ ụmụ Sọl.  Ọgụ ahụ wee siere Sọl ike, ndị na-agba ụta wee mesịa hụ ya, ndị na-agba ụta wee merụọ ya ahụ́ nke ukwuu.+  Sọl wee sị onye na-eburu ya ihe agha: “Mịrị mma agha gị+ maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù+ ghara ịbịa were mma agha ha magbuo m ma mee m ihe na-adịghị mma.” Ma obi ekweghị onye na-eburu ya ihe agha ime ya,+ n’ihi na egwu ji ya nke ukwuu. Sọl wee mịrị mma agha dakwasị na ya.+  Mgbe onye na-eburu ya ihe agha hụrụ na Sọl anwụwo,+ ya onwe ya kwa dakwasịrị ná mma agha nke ya wee soro ya nwụọ.+  Sọl na ụmụ ya atọ na onye na-eburu ya ihe agha, ọbụna ndị ikom ya niile, wee si otú a nwụkọta ọnụ n’ụbọchị ahụ.+  Mgbe ndị Izrel ndị nọ n’ógbè ndagwurugwu nakwa n’ógbè Jọdan hụrụ na ndị Izrel agbawo ọsọ, nakwa na Sọl na ụmụ ya anwụwo, ha malitere ịhapụ obodo ndị ahụ gbaa ọsọ,+ e mesịa, ndị Filistia batara biri na ha.+  O wee ruo n’echi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụsị ndị e gburu egbu ihe ha yi,+ na ha hụrụ Sọl na ụmụ ya atọ ka ha tọgbọ n’Ugwu Gilboa.+  Ha wee gbupụ ya isi+ ma yipụ ya uwe agha ya, zigakwa ozi n’ala ndị Filistia gbaa gburugburu iji gwa+ ụlọ arụsị+ ha nakwa ndị ha ihe merenụ. 10  N’ikpeazụ, ha debere ihe agha ya+ n’ụlọ arụsị Ashtọret,+ ha kedokwara ozu ya ná mgbidi Bet-shan.+ 11  Ndị bi na Jebesh-gilied+ wee nụ ihe ndị Filistia mere Sọl. 12  Ozugbo ahụ, ndị dike niile biliri wee jee ije n’abalị dum gaa bupụta ozu Sọl na ozu ụmụ ya ná mgbidi Bet-shan wee bịa Jebesh suo ha ọkụ n’ebe ahụ.+ 13  Ha wee chịrị ọkpụkpụ ha+ lie+ n’okpuru osisi tamarisk+ dị na Jebesh, ha wee buo ọnụ ụbọchị asaa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji