Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Samuel 18:1-30

18  O wee ruo na ngwa ngwa ọ gwasịrị Sọl okwu, e kekọtara+ mkpụrụ obi Jọnatan+ na mkpụrụ obi Devid, Jọnatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi nke ya.+  Sọl wee kpọrọ ya n’ụbọchị ahụ, o kweghịkwa ka ọ laa n’ụlọ nna ya.+  Jọnatan na Devid wee gbaa ndụ,+ n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi nke ya.+  Jọnatan yipụkwara uwe elu na-enweghị aka o yi, chịnye ya Devid, chịnyekwa ya uwe mwụda ya, nyekwa ya mma agha ya na ụta ya na ájị̀ ya.  Devid wee malite ije agha. Ebe ọ bụla Sọl zigara ya, ọ na-eji akọ eme ihe,+ nke mere na Sọl mere ya onyeisi ndị ikom na-aga agha;+ ọ dịkwa mma n’anya ndị Izrel niile nakwa n’anya ndị na-ejere Sọl ozi.  O wee ruo na mgbe ha na-abata, mgbe Devid si n’igbu ndị Filistia lọta, ndị inyom malitere ịpụta n’obodo niile nke Izrel, bụrụ abụ+ ma gbara egwú gaa izute Sọl bụ́ eze, na-akụkwa obere ịgbà,+ na-aṅụrị ọṅụ,+ na-akpọkwa une.  Ndị inyom ahụ bụ́ ndị na-enwe aṅụrị nọ na-agụ egwú, sị: “Sọl egbuwo puku kwuru puku, Devid egbuwokwa iri puku kwuru iri puku.”+  Sọl wee malite iwe oké iwe,+ okwu a jọkwara njọ n’anya ya, o wee sị: “Ha enyewo Devid iri puku kwuru iri puku, ma nye m puku kwuru puku, naanị ihe fọdụrụ inye ya bụ ọchịchị!”+  Sọl nọ na-ele Devid anya ọjọọ malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.+ 10  O wee ruo echi ya+ na mmụọ na-adịghị mma nke si n’ebe Chineke nọ kpawara ike n’ahụ́ Sọl,+ nke mere na o mewere dị ka onye amụma+ n’ime ụlọ, ka Devid nọ na-akpọ ụbọ,+ dị ka ọ na-eme na mbụ; Sọl jikwa ube n’aka.+ 11  Sọl wee tụọ ube+ ahụ, sị: “M ga-atụgide Devid n’ahụ́ ájá!”+ ma Devid zere wee gbapụ n’ihu ya ugboro abụọ.+ 12  Sọl wee malite ịtụ Devid egwu+ n’ihi na Jehova nọnyeere ya,+ ma ọ hapụwo Sọl.+ 13  N’ihi ya, Sọl wepụrụ ya ka ya na ya ghara ịdị na-anọ+ ma họpụta ya ịbụ ọchịagha otu puku ndị agha; ọ na-apụkwa ma na-abata mgbe niile n’ihu ndị Izrel.+ 14  Devid wee jiri akọ na-eme ihe+ mgbe niile n’ụzọ ya niile, Jehova nọnyekwaara ya.+ 15  Sọl wee na-ahụ na o ji akọ na-eme ihe,+ nke mere na ọ malitere ịtụ ya egwu. 16  Ma Izrel na Juda dum hụrụ Devid n’anya, n’ihi na ọ na-apụ ma na-abata n’ihu ha. 17  N’ikpeazụ, Sọl sịrị Devid: “Lee ada m bụ́ Mirab.+ Ọ bụ ya ka m ga-akpọnye gị ka ọ bụrụ nwunye gị.+ Naanị gosi m na ị bụ dike, lụọkwa agha Jehova.”+ Ma Sọl gwara onwe ya, sị: “Ka m ghara ịkpa ya aka, kama ka ọ bụrụ ndị Filistia ga-akpa ya aka.”+ 18  Devid wee sị Sọl: “Ònye ka m bụ, ònyekwa ka ndị ikwu m na ezinụlọ nna m, bụ n’Izrel, nke na m ga-abụ ọgọ eze?”+ 19  Otú ọ dị, o ruru mgbe a ga-akpọnye Devid Mirab, bụ́ ada Sọl, ya abụrụ na a kpọrọwo ya kpọnye Adriel+ onye Ebel-mehola+ ka ọ bụrụ nwunye ya. 20  Maịkal,+ nwa nwaanyị Sọl, hụrụ Devid n’anya, ha wee kọọrọ ya Sọl, ihe ahụ dịkwa ya mma. 21  Sọl wee sị: “M ga-ekenye ya nwa m nwaanyị ka ọ bụụrụ ya ọnyà,+ ka ndị Filistia wee kpaa ya aka.” Sọl wee sị Devid: “Ọ bụ otu n’ime ụmụ nwaanyị abụọ a ka ị ga-alụrụ taa.” 22  Sọl nyekwara ndị na-ejere ya ozi iwu, sị: “Gwanụ Devid na nzuzo, sị, ‘Lee! Ihe gị dị eze mma, ndị niile na-ejere ya ozi hụkwara gị n’anya. Ya mere, gị na eze gọọ ọgọ.’” 23  Ndị na-ejere Sọl ozi wee malite ikwu okwu ndị a ná ntị Devid, ma Devid sịrị: “Ọ̀ bụ obere ihe n’anya unu mụ na eze ịgọ ọgọ, ebe m bụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya+ na onye a na-ejighị kpọrọ ihe?”+ 24  Ndị na-ejere Sọl ozi wee kọọrọ ya, sị: “Ọ bụ ihe ndị a ka Devid kwuru.” 25  Sọl wee sị: “Nke a bụ ihe unu ga-agwa Devid, ‘Ọ bụghị ego isi nwaanyị+ ka eze chọrọ, kama ọ bụ otu narị apị́+ ndị Filistia, ka eze wee bọọrọ onwe ya ọbọ+ n’ahụ́ ndị iro ya.” Ma Sọl kpara nkata ka ndị Filistia gbuo Devid. 26  Ndị na-ejere ya ozi wee kọọrọ Devid ihe ndị a, ihe a masịkwara Devid, ya bụ, ka ya na eze gọọ ọgọ,+ oge e nyere ya agafebeghịkwa. 27  Devid wee bilie, ya na ndị ikom ya gaa gbuo+ narị ndị ikom abụọ n’etiti ndị Filistia, Devid wee chịtara eze apị́+ niile ọ sịrị ya weta, ka ya na eze wee gọọ ọgọ. Sọl wee kpọnye ya Maịkal nwa ya nwaanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.+ 28  Sọl wee hụ ma mata na Jehova nọnyeere Devid.+ Ma Maịkal, nwa Sọl, hụrụ ya n’anya.+ 29  Sọl wee na-atụkwu egwu n’ihi Devid, Sọl wee bụrụ onye iro Devid mgbe niile.+ 30  Ndị isi+ ndị Filistia na-aga agha, ọ na-erukwa na mgbe ọ bụla ha gara agha, Devid na-eji akọ eme ihe+ karịa ndị ọzọ niile na-ejere Sọl ozi; aha ya wee na-ede ude.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji