Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Samuel 17:1-58

17  Ndị Filistia+ wee kpọkọta ndị agha ha maka agha. Mgbe ha zukọtara na Soko+ nke Juda, ha mara ụlọikwuu ha n’agbata Soko na Azika,+ n’Ifes-damim.+  Ma Sọl na ndị Izrel zukọtara wee maa ụlọikwuu ha na ndagwurugwu Ila,+ ha wee hazie onwe ha n’usoro iji buso ndị Filistia agha.  Ndị Filistia guzokwa n’ugwu dị n’otu akụkụ, ndị Izrel wee guzo n’ugwu dị n’akụkụ nke ọzọ, ndagwurugwu dị n’etiti ha.  Otu dike n’agha wee malite isi n’ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu na-apụta, aha ya bụ Golayat,+ onye si Gat,+ ọ dị kubit isii na otu ntụ ọbụ aka n’ogo.+  O kpukwa okpu agha e ji ọla kọpa mee, yirikwa uwe agha nke nwere akpịrịkpa ndị dị n’elu ibe ha, uwe agha+ ahụ dịkwa puku shekel ọla kọpa ise n’ịdị arọ.  O yi ihe mkpuchi ụkwụ e ji ọla kọpa mee n’ụkwụ ya, árọ̀+ ọla kọpa dịkwa n’etiti ubu ya abụọ.  Osisi ube ya dị ka okporo osisi nke ndị na-ekwe ákwà,+ ọnụ ube ya dị narị shekel ígwè isii; onye bu ọta ukwu ya na-agakwa n’ihu ya.  O wee kwụrụ otu ebe, malite ịkpọ ndị agha Izrel,+ sị ha: “Gịnị mere unu ji pụta hazie onwe unu n’usoro ibu agha? Ọ̀ bụ na mụ abụghị onye Filistia, unu abụrụkwa ndị na-ejere Sọl ozi?+ Họpụtaranụ onwe unu otu nwoke, ka ọ gbadata zute m.  Ọ bụrụ na o nwee ike ịlụso m ọgụ ma gbuo m, anyị ga-aghọ ndị na-ejere unu ozi. Ma ọ bụrụ na ọ kaghị m ike m wee gbuo ya, unu ga-aghọ ndị na-ejere anyị ozi, unu ga na-ejekwara anyị ozi.”+ 10  Onye Filistia ahụ wee sị: “Mụ onwe m na-ama ndị agha Izrel aka+ taa. Nyenụ m otu nwoke, ka anyị lụọ ọgụ!”+ 11  Mgbe Sọl+ na ndị Izrel niile nụrụ ihe ndị a onye Filistia ahụ kwuru, ụjọ jidere ha, egwu tụkwara ha nke ukwuu.+ 12  Devid bụ nwa otu onye Efrata+ nke si Betlehem nke Juda, onye aha ya bụ Jesi. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asatọ.+ N’ụbọchị Sọl, nwoke ahụ emeworị agadi. 13  Ụmụ Jesi ndị ikom atọ, bụ́ ndị kasị mee okenye, wee gaa. Ha so Sọl gaa agha,+ aha ụmụ ya ndị ikom atọ gara agha bụ Elayab,+ nke ọkpara, na nwa ya nke abụọ bụ́ Abinadab,+ nakwa nke atọ bụ́ Shama.+ 14  Devid bụ ọdụdụ nwa,+ atọ ndị kasị mee okenye sokwa Sọl. 15  Devid nọkwa na-aga n’ụlọ Sọl ma na-alọta iji lekọta ìgwè atụrụ+ nna ya na Betlehem. 16  Ruo ụbọchị iri anọ, onye Filistia ahụ na-apụta n’isi ụtụtụ nakwa n’uhuruchi gaa guzoro otu ebe. 17  Jesi wee sị Devid nwa ya: “Biko, buru ọka* a a ṅara n’ọkụ+ nke dị otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa na ogbe achịcha iri a bugara ụmụnne gị, buru ha ngwa ngwa bugara ụmụnne gị n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu. 18  Burukwa òkè iri a nke mmiri ara ehi bugara ọchịagha otu puku ndị agha;+ gaakwa leta ụmụnne gị ka ị mara otú ha mere,+ natakwa ha ihe àmà.” 19  N’oge ahụ, ha na Sọl na ndị Izrel ndị ọzọ nọ na ndagwurugwu Ila,+ na-ebuso ndị Filistia agha.+ 20  Devid wee bilie n’isi ụtụtụ hapụ ìgwè atụrụ ahụ n’aka onye na-elekọta atụrụ, buru ihe ndị ahụ gawa dị nnọọ ka Jesi nyere ya n’iwu.+ Mgbe ọ batara n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu,+ ìgwè ndị agha nọ na-aga n’ọgbọ agha,+ ha wee tie mkpu agha. 21  Izrel na ndị Filistia wee malite ịhazi ndị agha ha ka ha buso ibe ha agha. 22  Ozugbo ahụ, Devid hapụrụ ibu+ ahụ n’aka onye na-elekọta ibu+ wee gbara gawa n’ọgbọ agha. Mgbe o rutere, ọ malitere ịjụ otú ụmụnne ya mere.+ 23  Ka ya na ha nọ na-ekwu okwu, lee, dike ahụ, nke aha ya bụ Golayat,+ onye Filistia nke si Gat,+ si n’ebe ndị agha ndị Filistia nọ na-agbagote, o wee malite ikwu ihe ndị ahụ o kwuru na mbụ,+ Devid wee nụpere ya. 24  Ma mgbe ndị Izrel niile hụrụ nwoke ahụ, lee, ha gbara ọsọ n’ihi ya, egwu tụkwara ha nke ukwuu.+ 25  Ndị Izrel wee malite ịsị: “Ùnu hụrụ nwoke a nke na-agbagote? Ọ bụ ka ọ maa Izrel aka+ mere o ji na-agbagote. Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke ga-egbu ya, eze ga-eme ka ọ baa ọgaranya site n’inye ya akụnụba dị ukwuu, ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwaanyị,+ ọ ga-emekwa ka ụlọ nna ya nwere onwe ha n’Izrel.”+ 26  Devid wee malite ịgwa ndị guzo ya nso, sị: “Gịnị ka a ga-emere onye ọ bụla nke gburu onye Filistia+ ahụ ma wepụ nkọcha a na-akọcha Izrel?+ N’ihi na, ònye bụ onye Filistia nke a a na-ebighị úgwù+ nke na ọ ga-ama ndị agha nke Chineke dị ndụ+ aka?”+ 27  Ha wee gwa ya otu ihe ahụ e kwuru na mbụ, sị: “Otú a ka a ga-emere onye gburu ya.” 28  Elayab+ bụ́ ọkpara nne ya wee nụ ka ọ na-agwa ndị ahụ okwu, Elayab wee weso Devid iwe+ dị ọkụ, nke mere na ọ sịrị: “Gịnị mere i ji bịa? Ọ̀ bụkwa onye ka ị hapụụrụ atụrụ ole na ole ahụ n’ala ịkpa?+ Mụ onwe m maara na ị dị mpako, nweekwa obi ọjọọ,+ n’ihi na ihe mere i ji bịa bụ ka ị hụ agha a.”+ 29  Devid wee sị: “Gịnịkwa ka m mere ugbu a? Ọ́ bụghị naanị okwu ka m kwuru?”+ 30  O wee si n’akụkụ ya tụgharịa chee onye ọzọ ihu ma kwuo otu ihe ahụ o kwuru na mbụ,+ ha zakwara ya otu ihe ahụ ha zara ya na mbụ.+ 31  E wee nụ ihe ahụ Devid kwuru, ha wee kọọrọ ya Sọl. O wee kpọrọ ya. 32  Devid wee sị Sọl: “Ka obi ghara ịwụba onye ọ bụla n’afọ.+ Ohu gị ga-aga lụso onye Filistia nke a ọgụ.”+ 33  Ma Sọl sịrị Devid: “Ị gaghị enwe ike ịga zute onye Filistia nke a lụso ya ọgụ,+ n’ihi na ị ka bụ nwata,+ ma ya onwe ya bụ dike n’agha malite n’oge ọ bụ nwata.” 34  Devid wee sị Sọl: “Ohu gị ghọrọ onye na-azụ ìgwè atụrụ nna ya, otu ọdụm wee bịa,+ otu anụ ọhịa bea bịakwara, nke ọ bụla buuru otu atụrụ n’ìgwè atụrụ ahụ. 35  M wee chụwa ya kụgbuo+ ya ma napụta ya n’ọnụ ya. Mgbe ọ malitere ịlụso m ọgụ, m jidere ya n’ọzà wee kụgbuo ya. 36  Ohu gị kụgburu ma ọdụm ahụ ma anụ ọhịa bea ahụ; onye Filistia nke a a na-ebighị úgwù+ ga-adị ka otu n’ime ha, n’ihi na ọ mawo ndị agha+ nke Chineke dị ndụ+ aka.”+ 37  Devid kwukwara, sị: “Jehova, bụ́ onye napụtara m n’aka ọdụm nakwa n’aka anụ ọhịa bea, ọ bụ ya ga-anapụta m n’aka onye Filistia nke a.”+ Sọl wee sị Devid: “Gawa, ka Jehova nọnyekwara gị.”+ 38  Sọl wee yiwe Devid uwe nke ya, kpuwekwa ya okpu agha e ji ọla kọpa mee, yiwezie ya uwe agha. 39  Devid wee kegide mma agha ya n’uwe ya wee chọọ ịgawa, ma o nweghị ike, n’ihi na o yitụbeghị ha. N’ikpeazụ, Devid sịrị Sọl: “Enweghị m ike iyi ihe ndị a gaa, n’ihi na eyitụbeghị m ha.” Devid wee yipụ ha.+ 40  O wee were mkpara ya, họrọkwa nkume ise ndị kasị kwọọ mụrụmụrụ n’iyi ndagwurugwu wee wụnye ha n’akpa o ji azụ atụrụ nke o ji mere ihe ntinye ihe, o jikwa èbè+ ya n’aka. O wee gawa izute onye Filistia ahụ. 41  Onye Filistia ahụ wee bịawa, na-abịaru Devid nso karị, nwoke nke bu ọta ukwu ya nọkwa na-aga ya n’ihu. 42  Mgbe onye Filistia ahụ lere anya hụ Devid, ọ malitere ileda ya anya+ n’ihi na ọ bụ nwata,+ na-achakwa ọbara ọbara+ ma maa mma ile anya.+ 43  Onye Filistia ahụ wee sị Devid: “M̀ bụ nkịta,+ mere i ji jiri mkpara na-abịa izute m?” Onye Filistia ahụ wee jiri aha chi+ ya kọchaa Devid. 44  Onye Filistia ahụ sịkwara Devid: “Bịa m nso, m ga-ewere anụ gị nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa.”+ 45  Devid wee gwa onye Filistia ahụ, sị: “I ji mma agha na ube na árọ̀+ na-abịa izute m, ma m ji aha Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ bụ́ Chineke nke ndị agha Izrel, onye ị maworo aka,+ na-abịa izute gị. 46  Taa, Jehova ga-enyefe gị n’aka m,+ m ga-egbukwa gị ma bepụ gị isi; taa, m ga-ewerekwa ozu ndị agha Filistia nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa;+ ndị bi n’ụwa dum ga-amarakwa na Izrel nwere Chi.+ 47  Ìgwè mmadụ a dum ga-amara na Jehova adịghị eji mma agha ma ọ bụ ube eweta nzọpụta,+ n’ihi na ọ bụ Jehova nwe agha a,+ ọ ga-enyefekwa unu n’aka anyị.”+ 48  O wee ruo na onye Filistia ahụ biliri bịawa, na-abịa nso izute Devid, Devid wee mee ngwa ngwa gbara gawa n’ọgbọ agha izute onye Filistia ahụ.+ 49  Devid wee tinye aka n’akpa ya wepụta otu nkume, gbapụ ya, o wee gbaa+ ya onye Filistia ahụ n’egedege ihu, nkume ahụ wee bamie n’egedege ihu ya, o wee daa kpuo ihu n’ala.+ 50  Devid wee jiri èbè na nkume merie onye Filistia ahụ, o wee gbatuo onye Filistia ahụ, gbuo ya; ọ dịghịkwa mma agha ọ bụla Devid ji.+ 51  Devid wee gbara ọsọ gaa guzoro n’akụkụ onye Filistia ahụ. O wee were mma agha nwoke ahụ,+ mịpụta ya n’ọbọ ya ma gbunyụọ ya anya mgbe o ji ya gbupụ ya isi.+ Ndị Filistia wee hụ na dike ha anwụọla, ha wee gbaa ọsọ.+ 52  Ndị Izrel na ndị Juda wee bilie tiwe mkpu ma chụrụ+ ndị Filistia ruo na ndagwurugwu,+ ruo n’ọnụ ụzọ ámá Ekrọn,+ ndị Filistia e merụrụ ahụ́ nke ukwuu wee na-ada n’ụzọ malite na Shearem+ ruo Gat na Ekrọn. 53  E mesịa, ụmụ Izrel si n’ajọ ọsọ ha chụrụ ndị Filistia lọta wee malite ịkwakọrọ+ ihe dị n’ebe ha mara ụlọikwuu. 54  Devid wee buru isi+ onye Filistia ahụ bute ya Jeruselem, o bubakwara ngwá ọgụ ya n’ụlọikwuu ya.+ 55  Ozugbo Sọl hụrụ Devid ka ọ na-aga ibuso onye Filistia ahụ agha, ọ jụrụ Abna+ onyeisi ndị agha, sị: “Abna, nwa ònye+ ka nwa okoro+ a bụ?” Abna wee zaa, sị: “Dị nnọọ ka mkpụrụ obi gị dị ndụ, eze, amaghị m ma ọlị!” 56  Eze wee sị: “Jụta onye nwa okoro ahụ bụ nwa ya.” 57  N’ihi ya, ngwa ngwa Devid si n’igbu onye Filistia ahụ lọta, Abna kpọtara ya n’ihu Sọl, o bukwa isi+ onye Filistia ahụ n’aka. 58  Sọl wee sị ya: “Nwa m, ị̀ bụ nwa onye?” Devid wee zaa, sị: “Abụ m nwa ohu gị bụ́ Jesi+ onye Betlehem.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

1Sa 17:17*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.