Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Samuel 14:1-52

14  O wee ruo otu ụbọchị na Jọnatan+ nwa Sọl gwara onye na-ejere ya ozi nke bu ngwá agha ya, sị: “Bịa ka anyị gafere banye n’ebe ndị Filistia, bụ́ ndị nọ n’ofe nke ọzọ, na-eche nche.” Ma ọ gwaghị nna ya.+  Sọl bi ná mpụga Gibia+ n’okpuru osisi pọmigranet nke dị na Migrọn; ndị ya na ha nọ dị ihe dị ka narị ndị ikom isii.+  (Ahaịja nwa Ahaịtọb,+ nwanne Ịkabọd,+ nwa Finihas,+ nwa Ilaị,+ onye nchụàjà Jehova na Shaịlo,+ yi efọd.)+ Ma ndị Izrel amaghị na Jọnatan apụọla.  Ma n’agbata ụzọ Jọnatan chọrọ isi gafere ka ọ gaa buso ndị Filistia na-eche nche+ agha, e nwere nkume dị elu nke pịrị ọnụ n’otu akụkụ, nweekwa nkume dị elu nke pịrị ọnụ n’akụkụ nke ọzọ, aha otu bụ Bozez, aha nke ọzọ abụrụ Sine.  Otu ọnụ ugwu ahụ bụ ogidi n’ebe ugwu ma chee ihu na Mikmash,+ nke ọzọ dị na ndịda ma chee ihu na Giba.+  Jọnatan wee gwa onye na-ejere ya ozi, nke na-eburu ya ihe agha, sị: “Bịa ka anyị gafere banye n’ebe ahụ ndị ikom ahụ a na-ebighị úgwù+ nọ na-eche nche. Ma eleghị anya, Jehova ga-arụrụ anyị ọrụ, n’ihi na ọ dịghị ihe na-egbochi Jehova isi n’aka ọtụtụ mmadụ ma ọ bụ n’aka mmadụ ole na ole mee ka e nwee nzọpụta.”+  Onye na-eburu ya ihe agha wee sị ya: “Mee ihe ọ bụla dị gị n’obi. Chee ihu ebe ọ bụla masịrị gị. Lee, eso m gị dị ka obi gị si chọọ.”+  Jọnatan wee sị: “Lee, anyị ga-agafere banye n’ebe ndị ikom ahụ nọ, ka anyị mee ka ha hụ anyị.  Ọ bụrụ na ha asị anyị, ‘Guzonụ ebe ahụ ruo mgbe anyị bịakwutere unu!’ anyị ga-eguzo n’ebe ahụ, anyị agaghịkwa agbago n’ebe ha nọ. 10  Ma ọ bụrụ na ha asị, ‘Bịanụ buso anyị agha!’ anyị ga-agbagokwa, n’ihi na Jehova ga-enyeferịrị ha n’aka anyị, nke a ga-abụkwara anyị ihe ịrịba ama.”+ 11  Ha abụọ wee mee ka ndị agha Filistia na-eche nche hụ ha. Ndị Filistia wee sị: “Lee ndị Hibru ka ha si n’ọgba ha zoro na-apụta.”+ 12  Ndị ikom ahụ na-eche nche wee sị Jọnatan na onye na-eburu ya ihe agha: “Gbagokwutenụ anyị, ka anyị gosi unu ihe!”+ Ozugbo ahụ, Jọnatan sịrị onye na-eburu ya ihe agha: “Sowe m, n’ihi na Jehova ga-enyeferịrị ha n’aka Izrel.”+ 13  Jọnatan wee jiri aka ya+ na ụkwụ ya na-agbago, onye na-eburu ya ihe agha sokwa ya n’azụ; ha wee malite ịda n’ihu Jọnatan,+ onye na-eburu ya ihe agha nọkwa na-egbu ha n’azụ ya.+ 14  Ndị mbụ Jọnatan na onye na-eburu ya ihe agha gburu n’ime ala dị otu eka dị ihe dị ka ndị ikom iri abụọ. 15  Mgbe ahụ, ndị niile nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu n’ọhịa mara jijiji,+ tinyere ndị niile na-eche nche; ìgwè ndị agha na-akwakọrọ ihe+ makwara jijiji, ọbụna ha onwe ha, ala malitekwara ịma jijiji,+ o wee ghọọ ịma jijiji si n’aka Chineke.+ 16  Ndị nche Sọl bụ́ ndị nọ na Gibia+ nke Benjamin wee hụ ya, ma, lee! ọgba aghara na-agbasa ebe niile.+ 17  Sọl wee sị ndị ya na ha so: “Biko, gụọ mmadụ niile ọnụ ma mara onye si n’etiti anyị pụọ.” Mgbe ha gụrụ ndị mmadụ ọnụ, lee! Jọnatan na onye na-eburu ya ihe agha anọghị n’ebe ahụ. 18  Sọl wee sị Ahaịja:+ “Bute igbe ezi Chineke n’ebe a!”+ (N’ihi na ụmụ Izrel bu igbe ezi Chineke n’ụbọchị ahụ.)+ 19  O wee ruo na ka Sọl na-agwa onye nchụàjà ahụ okwu,+ ọgba aghara ahụ nke dị n’ebe ndị Filistia mara ụlọikwuu gara n’ihu, na-adịwanye ukwuu. Sọl wee sị onye nchụàjà ahụ: “Hapụwa.” 20  E wee kpọpụta Sọl na ndị niile ya na ha so.+ Ha wee bịarute n’ọgbọ agha ahụ, ma, lee, mma agha onye nke ọ bụla gburu mmadụ ibe ya;+ ọgba aghara ahụ dị nnọọ ukwuu. 21  Ndị Hibru bụ́ ndị dụnyeere ndị Filistia+ úkwù n’oge gara aga, ndị sokwa ha gbagoo wee gbaa ebe ha mara ụlọikwuu gburugburu, ọbụna ha onwe ha nọ na-adụnyere Izrel bụ́ ndị so Sọl na Jọnatan úkwù. 22  Ndị Izrel niile bụ́ ndị zoro+ n’ógbè Ifrem nke bụ́ ugwu ugwu nụrụ na ndị Filistia agbaala ọsọ, ha onwe ha kwa wee chụrụ ha banye n’ọgbọ agha ahụ. 23  Jehova wee zọpụta+ Izrel n’ụbọchị ahụ, agha ahụ wee ruo Bet-even.+ 24  Ihe taara ndị Izrel akpụ n’ụbọchị ahụ, n’agbanyeghịkwa nke ahụ, Sọl mere ka ha ṅụọ iyi,+ sị: “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ga-eri ihe tupu anyasị bụ, ruokwa mgbe m ga-abọworị ọbọ+ n’ahụ́ ndị iro m!” Ọ dịghịkwa onye ọ bụla detụrụ nri ire.+ 25  Ndị ala ahụ niile wee bata n’ọhịa, mgbe mmanụ aṅụ+ jupụtara n’ala. 26  Mgbe ndị ahụ batara n’ọhịa, lee! mmanụ aṅụ na-atasị,+ ma ọ dịghị onye tinyere aka ya n’ọnụ, n’ihi na ha na-atụ egwu iyi ahụ ha ṅụrụ.+ 27  Ma Jọnatan anụghị mgbe nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi,+ o wee matịa mkpara o ji n’aka rụnye ọnụ ya n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ ahụ, tinye ya n’ọnụ ya, anya wee doo ya.+ 28  Otu n’ime ndị ahụ wee zaa, sị: “Nna gị mere ka ndị Izrel ṅụọ iyi, sị, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ga-eri nri taa bụ!”+ (Ike wee malite ịgwụ ha.)+ 29  Otú ọ dị, Jọnatan sịrị: “Nna m ebutewo nsogbu+ n’ala a. Biko, leenụ otú anya doworo m maka na m detụrụ ntakịrị mmanụ aṅụ a ire.+ 30  Lezienụ ihe gaara eme ma a sị na taa ndị Izrel riri ihe+ ha hụrụ bụ́ ndị ha kwatara n’aka ndị iro ha!+ N’ihi na ka ọ dị ugbu a, ndị Filistia e gburu ehibeghị nne.”+ 31  N’ụbọchị ahụ, ha nọ na-egbu ndị Filistia malite na Mikmash+ ruo Aịjalọn,+ ike wee gwụ ndị Izrel nke ukwuu.+ 32  Ndị Izrel wee jiri anyaukwu na-amaburu ihe a kwatara n’agha,+ na-akpụrụ atụrụ na ehi na ụmụ ehi ma na-egbu ha n’ala nkịtị, ndị Izrel wee malite irikọta ha na ọbara ha.+ 33  Ha wee gwa Sọl, sị: “Lee! Ndị Izrel na-emehie Jehova site n’irikọta anụ na ọbara ha.”+ O wee sị: “Unu emewo omume aghụghọ. Burugodịnụ ụzọ kwatara m otu nnukwu nkume.” 34  E mesịa, Sọl sịrị: “Gbasaanụ n’etiti ndị Izrel, sịkwanụ ha, ‘Ka onye ọ bụla n’ime unu kpụtara m ehi ya, onye ọ bụla n’ime unu kpụtakwara m atụrụ ya, gbuokwanụ ha ma rie ha n’ebe a, unu emehiekwala Jehova site n’irikọta ha na ọbara ha.”+ N’ihi ya, onye nke ọ bụla n’ime ndị Izrel kpụtara ehi ya n’abalị ahụ wee gbuo ya n’ebe ahụ. 35  Sọl wee wuoro Jehova ebe ịchụàjà.+ O ji ya malite iwuru Jehova ebe ịchụàjà.+ 36  Mgbe e mesịrị, Sọl sịrị: “Ka anyị gbadaa chụwa ndị Filistia n’abalị ma na-ebukọrọ ihe ha ruo n’isi ụtụtụ,+ ka anyị gharakwa ịhapụ onye ọ bụla n’ime ha.”+ Ha wee sị: “Mee ihe ọ bụla dị gị mma.” Onye nchụàjà ahụ wee sị: “Ka anyị bịaruo ezi Chineke nso n’ebe a.”+ 37  Sọl wee malite ịjụ Chineke ase, sị: “Ọ̀ bụ m gbadaa chụwa ndị Filistia?+ Ị̀ ga-enyefe ha n’aka Izrel?”+ Ma ọ zaghị ya n’ụbọchị ahụ.+ 38  Sọl wee sị: “Bịanụ nso n’ebe a,+ unu niile bụ́ ndị isi Izrel,+ chọọnụ ka unu mata otú e si mee mmehie a taa. 39  N’ihi na dị nnọọ ka Jehova, bụ́ Onye Nnapụta Izrel, dị ndụ, ọ bụrụgodị na ọ bụ Jọnatan nwa m mere ya, ọ ga-anwụrịrị.”+ Ma ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ahụ niile zara ya ihe ọ bụla. 40  O wee gwa Izrel dum, sị: “Unu onwe unu ga-anọ n’otu akụkụ, mụ na Jọnatan nwa m ga-aga n’akụkụ nke ọzọ.” Ha wee sị Sọl: “Mee ihe dị gị mma.”+ 41  Sọl wee sị Jehova: “Chineke Izrel, biko, jiri Tọmịm zaa anyị!”+ Nza wee ma Jọnatan na Sọl, ndị Izrel wee pụọ.+ 42  Sọl wee sị: “Feenụ nza+ iji mara onye ọ bụ n’etiti mụ na Jọnatan nwa m.” Nza wee ma Jọnatan. 43  Sọl wee sị Jọnatan: “Gwa m, Gịnị ka i mere?”+ Jọnatan wee sị ya: “N’eziokwu, aratụrụ m ntakịrị mmanụ aṅụ dị n’ọnụ mkpara m ji n’aka.+ Lee m! Ka m nwụọ!” 44  Sọl wee sị: “Ka Chineke mee otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya,+ ma ọ bụrụ na ị nwụghị,+ Jọnatan.” 45  Ma ndị Izrel sịrị Sọl: “Jọnatan ọ̀ ga-anwụ, bụ́ onye mere ka e nwee nzọpụta a dị ukwuu+ n’Izrel? Tụfịakwa!+ Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ otu ntutu isi+ ya agaghị ada n’ala; n’ihi na ya na Chineke rụrụ ọrụ taa.”+ Ndị Izrel wee si otú a napụta+ Jọnatan, ọ nwụghịkwa. 46  Sọl wee kwụsị ịchụ ndị Filistia, ndị Filistia wee laa n’obodo ha.+ 47  Sọl wee malite ịchị Izrel,+ na-ebuso ndị iro ya niile agha gbaa gburugburu, Moab+ na ụmụ Amọn+ na Idọm+ na ndị eze Zoba+ nakwa ndị Filistia;+ ebe ọ bụla o chere ihu, ya alaa ha n’iyi.+ 48  O wee na-akpa ike,+ meriekwa Amalek+ ma napụta Izrel n’aka ndị na-akwakọrọ ihe ha. 49  Ụmụ ndị ikom Sọl bụ Jọnatan+ na Ishvaị na Malkaị-shua,+ ma a bịa n’aha ụmụ ya ndị inyom, aha nke ada bụ Mirab,+ aha nke ọ tọrọ bụ Maịkal.+ 50  Aha nwunye Sọl bụ Ahinoam, ada Ahimaz, aha onyeisi ndị agha ya bụkwa Abna+ nwa Nee, nwanne nna Sọl. 51  Kish+ bụ nna Sọl, Nee+ bụ́ nna Abna bụ nwa Abayel. 52  Agha wee na-esiri ndị Filistia ike n’ụbọchị niile nke Sọl.+ Ọ bụrụ na Sọl ahụ onye ọ bụla bụ́ dimkpa ma ọ bụ dike, ọ na-akpọrọ ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji