Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Pita 4:1-19

4  Ya mere, ebe Kraịst tara ahụhụ n’anụ ahụ́,+ werekwanụ otu uche ahụ kee onwe unu dị ka ihe agha;+ n’ihi na onye taworo ahụhụ n’anụ ahụ́ ewepụwo aka ná mmehie,+  ka o wee bie ndụ ya fọrọ afọ n’anụ ahụ́,+ ọ bụkwaghị ime ọchịchọ mmadụ, kama ime uche Chineke.+  N’ihi na oge+ gafere agafe ezuworo unu ịrụzu ihe ndị mba ọzọ na-achọ,+ mgbe unu jere ije n’omume rụrụ arụ,+ n’agụụ ihe ọjọọ, n’ịṅụ oké mmanya,+ n’oriri oké mkpọtụ, n’ịma aka n’ịṅụ mmanya, na n’ikpere arụsị jọgburu onwe ya.+  Ebe ọ bụ na unu esoghị ha na-ebi ndụ ịla n’iyi a,+ ọ na-eju ha anya, ha ewee na-ekwujọ unu.+  Ma ndị a ga-aza onye+ ahụ nke dị njikere ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe+ ajụjụ.  N’eziokwu, ọ bụ ihe a mere e ji zisaara ndị nwụrụ anwụ ozi ọma,+ ka e wee kpee ha ikpe dị ka anụ ahụ́ si dị site n’ụzọ ụmụ mmadụ si ele ihe anya,+ kama ka ha wee dị ndụ dị ka mmụọ+ si dị site n’ụzọ Chineke si ele ihe anya.  Ma ọgwụgwụ ihe niile adịwo nso.+ Ya mere, nweenụ uche zuru okè,+ mụrụnụ anya ka unu wee na-ekpe ekpere.+  Karịsịa ihe niile, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ,+ n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.+  Na-elenụ ibe unu ọbịa n’atamughị ntamu.+ 10  Dị ka onye ọ bụla natara onyinye, jirinụ ya na-ejere ibe unu ozi dị ka ezi ndị nlekọta ụlọ n’ihe banyere obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, nke a na-egosi n’ụzọ dị iche iche.+ 11  Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-ekwu okwu, ya kwuo dị ka ọ̀ bụ okwu dị nsọ nke Chineke;+ ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eje ozi,+ ya jee ozi dị ka onye dabeere n’ike nke Chineke na-enye;+ ka e wee nye Chineke otuto n’ihe niile+ site n’aka Jizọs Kraịst. Ọ bụ ya nwe otuto+ na ike ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 12  Ndị m hụrụ n’anya, ka ọkụ nke na-ere n’etiti unu, nke na-ere ịbụrụ unu ọnwụnwa,+ ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe a na-ahụtụbeghị na-adakwasị unu. 13  Kama nke ahụ, na-aṅụrịnụ ọṅụ,+ ebe unu bụ ndị na-eketa òkè n’ahụhụ nke Kraịst,+ ka unu wee ṅụrịa ọṅụ ma nwebigakwa ọṅụ ókè mgbe a ga-ekpughe+ ebube ya. 14  Ọ bụrụ na a na-akọcha unu n’ihi aha Kraịst,+ unu nwere obi ụtọ,+ n’ihi na mmụọ nke ebube, ya bụ, mmụọ nke Chineke, dịkwasịrị unu.+ 15  Otú ọ dị, ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịta ahụhụ+ n’ihi ịbụ onye na-egbu ọchụ ma ọ bụ onye ohi ma ọ bụ onye ajọ omume ma ọ bụ onye na-enyonye anya n’ihe na-agbasaghị ya.+ 16  Ma ọ bụrụ na ọ na-ata ahụhụ+ n’ihi ịbụ Onye Kraịst, ka ihere ghara ime ya,+ kama ka ọ na-enye Chineke otuto n’aha nke a. 17  N’ihi na oge a kara aka eruwo ka ikpe malite n’ụlọ Chineke.+ Ma ọ bụrụ na ọ ga-amalite n’ebe anyị nọ,+ gịnị ka ọgwụgwụ ya ga-abụrụ ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma Chineke?+ 18  “Ọ bụrụkwa na o siiri onye ezi omume ike ịbụ onye a zọpụtara,+ olee ebe a ga-ahụ onye na-adịghị asọpụrụ Chineke na onye mmehie?”+ 19  Ya mere, ka ndị na-ata ahụhụ dị ka uche Chineke si dị na-enyefe mkpụrụ obi ha n’aka Onye Okike nke kwesịrị ntụkwasị obi, mgbe ha nọ na-eme ihe ọma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji