Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Pita 1:1-25

1  Pita, onyeozi+ nke Jizọs Kraịst, na-edetara unu akwụkwọ, unu ndị bi nwa oge+ n’ebe dị iche iche iche+ n’ime Pọntọs, Galeshia, Kapadoshia,+ Eshia, na Bitinia, ndị a họọrọ+  dị ka Chineke bụ́ Nna bu ụzọ mara,+ ndị e ji mmụọ nsọ doo nsọ,+ ka unu wee bụrụ ndị na-erube isi na ndị e fesara+ ọbara Jizọs Kraịst:+ Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo dị ukwuu dịrị unu.+  Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst+ bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na dị ka ebere ya si dị ukwuu, ọ mụrụ anyị ọzọ+ ka anyị wee nwee olileanya+ dị ndụ site n’ime ka Jizọs Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilie,+  ka anyị wee nweta ihe nketa a na-apụghị ibibi ebibi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-adịghịkwa emebi emebi.+ E debeere ya unu n’eluigwe,+  unu ndị ike Chineke na-echebe site n’okwukwe+ maka nzọpụta+ a na-aga ikpughe+ n’oge ikpeazụ.+  Unu na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ihi ihe a, ọ bụ ezie na e mewo ka unu nwee mwute site n’ọnwụnwa+ dị iche iche ruo nwa oge ugbu a, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa,  ka okwukwe unu nke a nwalere anwale,+ nke bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi, n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya,+ wee bụrụ ihe na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ mgbe a ga-ekpughe+ Jizọs Kraịst.  Ọ bụ ezie na unu ahụghị ya, unu hụrụ ya n’anya.+ Ọ bụ ezie na unu adịghị ele ya anya ugbu a, ma unu nwere okwukwe n’ebe ọ nọ, na-aṅụrịkwa ọṅụ nke ukwuu, ya bụ, ọṅụ nke ọnụ na-apụghị ịkọwa, nke dịkwa ebube,  ebe unu ga-enweta ihe okwukwe unu ga-arụpụta, bụ́ nzọpụta nke mkpụrụ obi unu.+ 10  Ndị amụma, bụ́ ndị buru amụma+ banyere obiọma na-erughịrị mmadụ nke ga-abịara unu,+ jụrụ ase nke ọma banyere nzọpụta a, jirikwa nlezianya mee nnyocha banyere ya.+ 11  Ha nọ na-eme nchọpụta banyere oge ọ bụ kpọmkwem+ ma ọ bụ ụdị oge nke mmụọ+ ahụ dị n’ime ha na-egosi banyere Kraịst,+ mgbe ọ gbara àmà tupu oge eruo banyere ahụhụ Kraịst+ ga-ata, banyekwara ebube+ nke ga-esochi ya. 12  E kpugheere ha na ọ bụghị onwe ha+ ka ha na-ejere ozi, kama ọ bụ unu ka ha na-enye ihe ndị ahụ e kwusaara+ unu ugbu a site n’ọnụ ndị ji mmụọ nsọ+ nke e si n’eluigwe zite zisaara unu ozi ọma. Ọ na-agụ ndị mmụọ ozi agụụ inyoba anya n’ihe ndị a.+ 13  Ya mere, keenụ ájị̀ n’ume maka ọrụ,+ nweenụ uche ziri ezi;+ meenụ ka olileanya unu dịrị n’obiọma na-erughịrị mmadụ+ nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe+ Jizọs Kraịst. 14  Dị ka ụmụ na-erube isi, kwụsịnụ ịbụ ndị na-eme omume+ dị ka ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga si dị, mgbe unu na-amaghị ihe, 15  kama, dị ka Onye Nsọ ahụ nke kpọrọ unu, bụrụkwanụ ndị dị nsọ n’omume unu niile,+ 16  n’ihi na e dere, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.”+ 17  Ọ bụrụkwa na unu na-akpọku Nna nke na-ekpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu+ dị ka ọrụ onye nke ọ bụla si dị, jirinụ egwu na-eme omume+ n’oge unu bi dị ka ndị ala ọzọ.+ 18  N’ihi na unu maara na ọ bụghị ihe ndị pụrụ ire ure,+ ọlaọcha ma ọ bụ ọlaedo, ka e ji napụta+ unu n’ụdị omume unu nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke unu natara site n’ọdịnala nke si n’aka nna nna unu hà. 19  Kama ọ bụ ọbara+ nke dị oké ọnụ ahịa, dị ka nke nwa atụrụ+ na-enweghị mmerụ, nke na-enweghịkwa ntụpọ, ya bụ, nke Kraịst.+ 20  N’eziokwu, e bu ụzọ mara ya tupu a tọọ ntọala+ ụwa, ma e mere ka ọ pụta ìhè n’ọgwụgwụ oge ndị a n’ihi unu+ 21  bụ́ ndị kwere na Chineke+ site n’aka ya, onye si ná ndị nwụrụ anwụ+ kpọlite ya ma nye ya ebube;+ ka okwukwe na olileanya unu wee dịrị na Chineke.+ 22  Ebe unu meworo ka mkpụrụ obi unu dị ọcha+ site n’isi unu na-erubere eziokwu ahụ nke mere ka unu nwee ịhụnanya+ ụmụnna nke na-abụghị nke ihu abụọ, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ site n’obi unu.+ 23  N’ihi na a mụwo unu ọzọ+ site ná mkpụrụ na-enye ndụ,+ nke na-apụghị ire ure,+ ọ bụghị site na nke pụrụ ire ure,+ site n’okwu+ Chineke bụ́ onye dị ndụ ma na-adịru+ mgbe ebighị ebi. 24  N’ihi na “anụ ahụ́ niile dị ka ahịhịa, ebube ha niile dịkwa ka ifuru ahịhịa;+ ahịhịa ya na-akpọnwụ, okooko ya na-adapụkwa,+ 25  ma okwu Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi.”+ Nke a bụ “okwu”+ ahụ nke bụ́ ozi ọma e zisaara+ unu.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji