Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ihe E Mere 19:1-19

19  O wee ruo mgbe e mesịrị na Nehash+ eze ụmụ Amọn nwụrụ, nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.+  Devid wee sị: “M ga-egosi Henọn nwa Nehash obiọma*+ n’ihi na nna ya gosiri m obiọma.”+ Devid wee ziga ndị ozi ka ha kasie ya obi maka nna ya. Ndị na-ejere Devid ozi wee bata n’ala ụmụ Amọn+ wee gakwuru Henọn ịkasi ya obi.  Otú ọ dị, ndị isi ụmụ Amọn sịrị Henọn: “N’anya gị, ọ̀ bụ ùgwù ka Devid na-akwanyere nna gị mere o ji zitere gị ndị nkasi obi? Ọ́ bụghị ka ha mee nchọpụta nke ọma banyere ala a na ịkwatu ya na iledo+ ya mere ndị na-ejere ya ozi ji bịakwute gị?”+  Henọn wee kpọrọ ndị na-ejere Devid ozi+ kpụchaa ha ajị+ ma chawaa uwe mwụda ha ruo n’ikè+ wee hapụ ha ka ha laa.+  E mesịa, ndị mmadụ gara kọọrọ Devid banyere ndị ikom ahụ; o wee zipụ ndị mmadụ ozugbo ka ha gaa zute ha, n’ihi na e menyewo ha ihere nke ukwuu; eze wee sị ha: “Nọrọnụ na Jeriko+ ruo mgbe ajị agba unu rujuru. Mgbe ahụ, unu ga-alọta.”  Ka oge na-aga, ụmụ Amọn hụrụ na ha na-esizi ísì ọjọọ+ n’ebe Devid nọ, Henọn+ na ụmụ Amọn wee ziga otu puku talent ọlaọcha+ iji si na Mesopotemia na Eram-meaka+ nakwa Zoba+ gbazite ụgbọ ịnyịnya+ na ndị na-agba ịnyịnya.  Ha wee gbazite puku ụgbọ ịnyịnya iri atọ na abụọ+ ma goo eze Meaka na ndị ya ọrụ.+ Ha wee bata maa ụlọikwuu n’ihu Medeba;+ ma ụmụ Amọn si n’obodo ha zukọta wee bịa ibu agha.  Mgbe Devid nụrụ ya, o zipụrụ Joab+ na ndị agha niile na ndị dike ozugbo.+  Ụmụ Amọn wee malite ịpụta na ịhazi onwe ha n’usoro iji buo agha n’ọnụ ụzọ obodo ahụ, ma ndị eze+ bịaranụ nọ naanị ha n’ọhịa. 10  Mgbe Joab hụrụ na e si n’ihu, sikwa n’azụ na-abịa ibuso ya agha, ozugbo, ọ họọrọ ụfọdụ n’ime ndị niile kasị ike n’Izrel wee hazie ha n’usoro izute ndị Siria.+ 11  Ma ọ kpọnyere Abishaị+ nwanne ya ndị fọdụrụnụ, ka ha wee hazie onwe ha n’usoro izute ụmụ Amọn.+ 12  O wee sị: “Ọ bụrụ na ndị Siria+ akarịa m ike, ị ga-abụrụ m onye nzọpụta;+ ma ọ bụrụ na ụmụ Amọn akarịa gị ike, m ga-azọpụta gị.+ 13  Dị ike,+ ka anyị nweekwa obi ike n’ihi ndị ala anyị nakwa n’ihi obodo niile nke Chineke anyị;+ Jehova ga-emekwa ihe dị mma n’anya ya.”+ 14  Joab na ndị ya na ha so wee garukwuo ndị Siria nso ibuso ha agha,+ ha wee si n’ihu ya gbaa ọsọ.+ 15  Ma ụmụ Amọn hụrụ na ndị Siria agbaala ọsọ, ha onwe ha kwa wee si n’ihu Abishaị nwanne ya gbaa ọsọ+ wee gbaba n’obodo.+ E mesịa, Joab batara na Jeruselem. 16  Mgbe ndị Siria hụrụ na Izrel emeriwo ha,+ ha zigara ndị ozi wee kpọpụta ndị Siria nọ n’ógbè Osimiri Yufretis,+ Shofak, bụ́ onyeisi ndị agha Hadadiza, dukwa ha. 17  Mgbe a kọọrọ ya Devid, ọ kpọkọtara Izrel dum ozugbo gafee Jọdan wee bịakwute ha ma hazie onwe ha n’usoro ibuso ha agha.+ Mgbe Devid pụtara ibuso ndị Siria agha, ha malitere ibuso ya agha. 18  Ma ndị Siria gbara ọsọ+ n’ihi ndị Izrel; Devid wee gbuo n’ime ndị Siria puku mmadụ asaa ndị na-agba ịnyịnya na puku ndị ikom iri anọ bụ́ ndị ji ụkwụ aga. O gbukwara Shofak bụ́ onyeisi ndị agha ha.+ 19  Mgbe ndị na-ejere Hadadiza ozi hụrụ na Izrel emeriwo ha,+ ngwa ngwa ha mere ka ha na Devid dị n’udo wee malite ijere ya ozi;+ Siria achọghịkwa ịnwa ọzọ ịzọpụta ụmụ Amọn.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

1Ih 19:2*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”